Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 10:1-32

10  Ilu Sọlọmọn.+ Ọ bụ nwa maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa,+ nwa nzuzu bụkwaara nne ya ihe iru uju.+  Akụ̀ onye ajọ omume agaghị aba uru,+ ma, ọ bụ ezi omume ga-anapụta mmadụ n’ọnwụ.+  Jehova agaghị eme ka agụụ gụọ mkpụrụ obi onye ezi omume,+ ma ihe na-agụsi ndị ajọ omume ike ka ọ ga-ewepụ.+  Onye dị umengwụ n’ọrụ ga-ada ogbenye,+ ma, ọ bụ aka onye dị uchu ga-eme ka ya onwe ya baa ọgaranya.+  Nwa nke ji nghọta eme ihe na-achịkọta ihe n’oge okpomọkụ; nwa nke na-emechu mmadụ ihu na-anọ n’oké ụra n’oge owuwe ihe ubi.+  Ngọzi na-adịrị isi onye ezi omume,+ ma ọnụ ndị ajọ omume na-ezochi ime ihe ike.+  Ncheta a na-echeta onye ezi omume ga-ewetara ya ngọzi,+ ma aha ndị ajọ omume ga-ere ure.+  Onye nwere obi amamihe ga-anabata ihe e nyere n’iwu,+ ma onye dị nzuzu n’egbugbere ọnụ ya ka a ga-azọda n’ala.+  Onye na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe ga na-eje ije n’obi iru ala,+ ma onye na-eme ka ụzọ ya gbagọọ agbagọ ga-eme ka a mata onye ya onwe ya bụ.+ 10  Onye na-atabiri mmadụ anya ga-eweta ihe mgbu,+ onye dịkwa nzuzu n’egbugbere ọnụ ya ka a ga-azọda n’ala.+ 11  Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ;+ ma ọnụ ndị ajọ omume na-ezochi ime ihe ike.+ 12  Ọ bụ ịkpọasị na-akpali esemokwu,+ ma ịhụnanya na-ekpuchi ọbụna mmejọ niile.+ 13  N’egbugbere ọnụ onye nwere nghọta ka a na-achọta amamihe,+ ma ụtarị bụ maka azụ onye na-enweghị uche.+ 14  Ọ bụ ndị maara ihe na-echekwa ihe ọmụma,+ ma ọnụ onye nzuzu dị nso ná mbibi.+ 15  Ihe dị oké ọnụ ahịa nke ọgaranya bụ obodo ya siri ike.+ Mbibi nke ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha bụ ogbenye ha dara.+ 16  Ihe onye ezi omume na-eme na-eduba ná ndụ;+ ihe onye ajọ omume na-emepụta na-eduba ná mmehie.+ 17  Onye na-ejigide ịdọ aka ná ntị bụ ụzọ nke na-eduba ná ndụ,+ ma onye na-ahapụ ịdọ aka ná ntị na-akpata ifu ụzọ.+ 18  N’ebe e nwere onye na-ekpuchi ịkpọasị ka e nwere egbugbere ọnụ nke na-ekwu okwu ụgha,+ onye na-ewetakwa akụkọ ọjọọ dị nzuzu.+ 19  N’ọtụtụ okwu, mmehie anaghị ahapụ ịdị,+ ma onye na-achịkwa egbugbere ọnụ ya ji ezi uche eme ihe.+ 20  Ire onye ezi omume bụ ọlaọcha kasị mma;+ obi onye ajọ omume abachaghị uru.+ 21  Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụ ọtụtụ ndị dị ka atụrụ,+ ma ndị nzuzu na-anwụ n’ihi enweghị uche.+ 22  Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya,+ ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.+ 23  Ime omume rụrụ arụ dị ka egwuregwu n’anya onye nzuzu,+ ma amamihe dịịrị onye nwere nghọta.+ 24  Ihe onye ajọ omume na-atụ ụjọ—ọ bụ ya ga-abịara ya;+ ma a ga-enye ndị ezi omume ihe na-agụ ha.+ 25  Dị ka mgbe oké ifufe mmiri gafere, otú ahụ ka onye ajọ omume na-agakwaghị anọ;+ ma onye ezi omume bụ ntọala ruo mgbe ebighị ebi.+ 26  Dị ka mmanya gbara ụka si adị n’ezé, dịkwa ka anwụrụ ọkụ si adị n’anya, otú ahụ ka onye umengwụ dị n’anya ndị dunyere ya ozi.+ 27  Ọ bụ egwu Jehova ga-atụkwasịrị mmadụ ọtụtụ ụbọchị,+ ma a ga-eme ka afọ ndụ ndị ajọ omume dị mkpụmkpụ.+ 28  Ihe ndị ezi omume na-atụ anya ya bụ ịṅụrị ọṅụ,+ ma olileanya ndị ajọ omume ga-ala n’iyi.+ 29  Ụzọ Jehova bụụrụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta ebe e wusiri ike,+ ma mbibi dịịrị ndị na-eme ihe ọjọọ.+ 30  A gaghị eme ka onye ezi omume maa jijiji ruo mgbe ebighị ebi;+ ma ndị ajọ omume agaghị ebi n’ụwa mgbe niile.+ 31  Ọnụ onye ezi omume na-amị mkpụrụ amamihe,+ ma a ga-ebepụ ire nke na-ekwu okwu rụrụ arụ.+ 32  Ihe egbugbere ọnụ onye ezi omume maara bụ ihe dị mma,+ ma ihe ọnụ ndị ajọ omume maara bụ ihe rụrụ arụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji