Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hosia 6:1-11

6  “Bịanụ, ka anyị laghachikwuru Jehova,+ n’ihi na ya onwe ya adọrisịwo anyị,+ ma ọ ga-agwọ anyị.+ Ọ nọ na-eti anyị ihe, ma ọ ga-ekechi ọnyá anyị.+  Ọ ga-eme ka anyị dị ndụ ma ụbọchị abụọ gasịa.+ N’ụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie, anyị ga-adịkwa ndụ n’ihu ya.+  Anyị ga-amara Jehova, anyị ga-aga n’ihu ịmara ya.+ Dị ka chi ọbụbọ,+ ọ ghaghị ịpụta.+ Ọ ga-abịakwute anyị dị ka mmiri ozuzo;+ dị ka ụla mmiri nke na-ede ala.”+  “Ifrem, gịnị ka m ga-eme gị? Juda,+ gịnị ka m ga-eme gị, ebe ọ bụ na obiọma* unu dị ka ígwé ojii ụtụtụ, dịrịkwa ka igirigi nke na-ekusa ngwa ngwa?  Ọ bụ ya mere m ga-eji jiri ndị amụma bibie ha;+ m ga-eji okwu ọnụ m gbuo ha.+ Ikpe m ga-ekpe gị ga-adị ka ìhè nke nwupụtara enwupụta.+  N’ihi na ihe na-atọ m ụtọ bụ obiọma,+ ọ bụghị àjà;+ ịmara Chineke na-atọkwa m ụtọ, ọ bụghị àjà a na-esurecha n’ọkụ.+  Ma ha onwe ha, dị ka mmadụ, emebiwo ọgbụgba ndụ m.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka ha ghọrọ m aghụghọ.+  Gilied+ bụ obodo nke ndị na-eme ihe ọjọọ; nzọụkwụ ha bụ ọbara.+  Ndị nchụàjà na-echechi mmadụ+ dị ka ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga.+ Ha na-egbu ọchụ n’akụkụ ụzọ na Shikem,+ n’ihi na naanị ihe ha na-eme bụ omume rụrụ arụ.+ 10  Ahụwo m ihe jọgburu onwe ya n’ụlọ Izrel.+ N’ebe ahụ ka Ifrem na-akwa iko.+ Izrel emerụwo onwe ya.+ 11  Ma gị onwe gị, Juda, a kwadebeworo gị owuwe ihe ubi, mgbe m ga-achịkọtaghachi ndị m a dọọrọ n’agha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ho 6:4*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”