Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hosia 5:1-15

5  “Nụrụnụ okwu a, unu ndị nchụàjà,+ ṅaakwanụ ntị, unu ụlọ Izrel, geekwanụ ntị, unu ụlọ eze,+ n’ihi na ọ bụ unu ka ikpe a metụtara; n’ihi na unu bụ ọnyà+ e siri na Mizpa, bụrụkwa ụgbụ e ji sie ọnyà na Tebọ.+  Ndị dapụrụ adapụ emikpuwo onwe ha+ n’igbu anụ e ji achụ àjà,* anọwokwa m na-enye ha niile ndụmọdụ.+  Mụ onwe m maara Ifrem,+ Izrel ezoghịkwa ezo n’ebe m nọ.+ Ugbu a, Ifrem, i dinawo ndị inyom dị ka à ga-asị na ha bụ ndị akwụna;+ Izrel emerụwo onwe ya.+  Omume ha ekweghị ka ha lọghachikwute Chineke ha,+ n’ihi na mmụọ ịkwa iko+ dị n’etiti ha; ha amaghịkwa Jehova.+  Ihe Izrel ji anya isi agbawo akaebe megide ya;+ e mewokwa ka Izrel na Ifrem sụọ ngọngọ ná njehie ha.+ Juda esorowokwa ha sụọ ngọngọ.+  Ha chị ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha gaa ịchọ Jehova, ma ha achọtaghị ya.+ Ọ hapụwo ha.  Ha aghọwo Jehova aghụghọ,+ n’ihi na ha amụwo ụmụ si n’ebe ọzọ.+ A ga-eripịa ha na òkè ha n’otu ọnwa.+  “Fụọnụ opi+ na Gibia,+ fụọkwanụ opi na Rema! Tienụ mkpu agha na Bet-even+—n’azụ gị, Benjamin!+  Ifrem, ihe na-eju anya ka ị ga-aghọ n’ụbọchị ịba mba.+ N’etiti ebo niile nke Izrel ka m meworo ka a mara okwu a pụrụ ịtụkwasị obi.+ 10  Ndị isi Juda adịwo ka ndị na-ewela ihe e ji kpaa ókè ala azụ.+ M ga-awụsa ha oké iwe m dị ka mmiri. 11  E mekpawo Ifrem ahụ́, ngwepịa e gwepịara ya ziri ezi,+ n’ihi na o kpebiri iso onye iro ya.+ 12  M bụụrụ Ifrem nla,+ bụkwaara ụlọ Juda ihe na-akpata ire ure. 13  “Ifrem wee hụ ọrịa ọ na-arịa, Juda hụkwara ọnyá ya.+ Ifrem wee gaa Asiria+ zigara eze ukwu+ ndị ozi. Ma onye ahụ agwọlighị unu,+ ọ pụghịkwa ime ka ọnyá unu laa.+ 14  N’ihi na m ga-adị ka nwa ọdụm nye Ifrem,+ m ga-adịkwa ka nwa ọdụm tojuru etoju nye ụlọ Juda. Mụ onwe m ga-adọgbu ha, m ga-agakwa buru ha, ọ dịghịkwa onye ga-anapụta ha.+ 15  M ga-ala, m ga-alaghachi n’ebe m si ruo mgbe ha buuru ikpe ọmụma ha;+ ha ga-achọ ihu m.+ Mgbe ha nọ n’oké ihe isi ike,+ ha ga-achọ m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ho 5:2*  Ma ọ bụ, “n’igbu ọchụ.”