Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hosia 4:1-19

4  Ụmụ Izrel, nụrụnụ okwu Jehova, n’ihi na Jehova nwere okwu ikpe megide ndị bi n’ala a,+ n’ihi na eziokwu+ na obiọma* na ihe ọmụma banyere Chineke adịghị n’ala a.+  E nwere ịbụ ọnụ+ na ịghọ aghụghọ+ na igbu ọchụ+ na izu ohi+ na ịkwa iko,+ bụ́ ndị gbasaworo ebe niile, ịwụfu ọbara na ịwụfu ọbara ezutewo.+  Ọ bụ ya mere ala a ga-eji ruo uju,+ onye ọ bụla bi n’ime ya ga-atụbọ, tinyere anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe, ọbụna azụ̀ ndị dị n’oké osimiri ga-anwụ.+  “Otú ọ dị, ka onye ọ bụla ghara ịgba mgba,+ ka onye ọ bụla ghara ịba mba, n’ihi na ndị gị dị ka ndị na-agbaso onye nchụàjà mgba.+  Ị ga-asụ ngọngọ n’ehihie,+ gị na onye amụma ga-asụ ngọngọ, dị ka à ga-asị na ọ bụ n’abalị.+ M ga-ala nne gị n’iyi.+  Ndị m ga-ala n’iyi, n’ihi na ihe ọmụma adịghị.+ Ebe ọ bụ na ị jụwo ihe ọmụma,+ mụ onwe m ga-ajụ gị ka ị ghara ịbụkwa onye nchụàjà m;+ ebe ọ bụ na ị na-echefu iwu Chineke gị,+ mụ onwe m ga-echefu ụmụ gị.+  Dị ka ha dị ọtụtụ, otú ahụ ka ha na-emehie m.+ Ha ewerewo ihe ihere gbanwere otuto m.+  Mmehie ndị m ka ha na-eripịa, njehie ha na-agụsikwa mkpụrụ obi ha ike.+  “Ọ ga-adịrị ndị nkịtị otú ọ dịịrị onye nchụàjà;+ m ga-emekwa ka ha zaa ajụjụ maka ụzọ ha;+ m ga-emekwa ka ha buru ihe ha metara.+ 10  Ha ga-eri ihe, ma afọ agaghị eju ha.+ Ha ga-edina ụmụ nwaanyị dị ka à ga-asị na ha bụ ndị inyom na-agba akwụna; ma ha agaghị amụba,+ n’ihi na ha akwụsịwo ịṅa Jehova ntị.+ 11  Ịkwa iko na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ na-anapụ ezi uche.+ 12  Ndị m na-ajụ arụsị ha+ e ji osisi mee ase,+ mkpara ha na-agwakwa ha okwu; n’ihi na mmụọ ịkwa iko emewo ka ha kpafuo,+ ịkwa iko emewokwa ka ha si n’okpuru Chineke pụọ.+ 13  Ha na-achụ àjà n’elu ugwu ukwu,+ ha na-esurekwa ihe nsure ọkụ n’elu ugwu nta dị iche iche,+ n’okpuru oké osisi na osisi stọraks na osisi ukwu, n’ihi na ndò ya dị mma.+ Ọ bụ ya mere ụmụ unu ndị inyom na ndị nwunye ụmụ unu ji na-akwa iko. 14  “Agaghị m eme ka ụmụ unu ndị inyom zaa ajụjụ maka iko ha na-akwa, agaghịkwa m eme ka ndị nwunye ụmụ unu zaa ajụjụ maka iko ha na-akwa. N’ihi na ndị ikom na-akpọrọ ndị akwụna nọpụ iche,+ ọ bụkwa ha na ndị inyom bụ́ akwụna ụlọ arụsị+ na-achụ àjà; a ga-azọda ndị na-enweghị nghọta.+ 15  Izrel, ọ bụ ezie na ị na-akwa iko,+ ka Juda bụrụ onye ikpe na-amaghị,+ unu abịakwala na Gilgal,+ unu agbagokwala Bet-even,+ unu aṅụkwala iyi, sị, ‘Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ!’+ 16  N’ihi na Izrel na-eme isi ike+ dị ka ehi nke na-eme isi ike. Ọ̀ bụ ugbu a ka Jehova ga-azụ ha n’ebe sara mbara dị ka nwa ebule? 17  Ifrem ekekọtawo onwe ya n’arụsị dị iche iche.+ Hapụ ya!+ 18  Ebe ọ bụ na mmanya ọka wit ha agwụwo,+ ha edinawo ụmụ nwaanyị dị ka à ga-asị na ha bụ ndị inyom na-agba akwụna.+ Ndị na-echebe ya+ hụrụ ihe ihere n’anya.+ 19  Ifufe ejiriwo nku ya bufuo ya.+ Àjà ha dị iche iche ga-eme ha ihere.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ho 4:1*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”