Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hosia 3:1-5

3  Jehova wee sị m: “Gaghachi hụ nwaanyị n’anya, bụ́ onye nwoke ọzọ hụrụ n’anya,+ bụ́ nwaanyị na-akwa iko, hụ ya n’anya dị ka Jehova si hụ ụmụ Izrel n’anya+ mgbe ha na-agakwuru chi ọzọ dị iche iche+ wee na-enwe mmasị n’ịchụrụ ha achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị n’àjà.”+  M wee were mkpụrụ ego ọlaọcha iri na ise+ na otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ homa ọka bali na ọkara zụrụ ya.  M wee sị ya: “Ị ga-ebi dị ka nke m ruo ọtụtụ ụbọchị.+ Akwala iko,+ abụkwala nke nwoke ọzọ;+ otú ahụkwa ka m ga-adị n’ebe ị nọ.”  Ọ bụ n’ihi na ruo ọtụtụ ụbọchị, ụmụ Izrel ga-ebi n’enweghị eze,+ n’enweghị onyeisi, n’achụghị àjà,+ n’enweghị ogidi, n’enweghịkwa efọd+ na terafim.+  E mesịa, ụmụ Izrel ga-alọghachi chọọ Jehova bụ́ Chineke ha,+ chọọkwa Devid bụ́ eze ha;+ ha ga-amara jijiji bịakwute Jehova+ na ịdị mma ya n’oge ikpeazụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji