Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hosia 14:1-9

14  “Izrel, lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke gị,+ n’ihi na njehie emewo ka ị sụọ ngọngọ.+  Jirinụ okwu na-egosi nchegharị lọghachikwute Jehova.+ Unu niile, sịnụ ya, ‘Gbaghara njehie anyị;+ nara ihe dị mma, anyị ga-enyekwa gị ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị.+  Asiria agaghị azọpụta anyị.+ Anyị agaghị agba ịnyịnya.+ Anyị agaghị asị aka ọrụ anyị ọzọ, “Ị bụ Chineke anyị!” n’ihi na ọ bụ gị na-eme ka e meere nwa na-enweghị nna ebere.’+  “M ga-agwọ ekwesịghị ntụkwasị obi ha.+ M ga-eji obi m hụ ha n’anya,+ n’ihi na iwe m na-eweso ya adajụwo.+  M ga-adị ka igirigi nye Izrel.+ Ọ ga-awa okooko dị ka lili, gbaakwa mgbọrọgwụ dị ka osisi Lebanọn.  Ọ ga-awa alaka, ọ ga-adị ebube ka osisi oliv,+ ọ ga na-esikwa ísì ụtọ dị ka osisi Lebanọn.  Ha ga-ebi ọzọ na ndò ya.+ Ha ga-akụ ọka,* ha ga-amakwa ifuru dị ka osisi vaịn.+ A ga na-echeta ya dị ka mmanya Lebanọn.  “Ifrem ga-asị, ‘Gịnị ka gbasara mụ na arụsị?’+ “Mụ onwe m ga-azaghachi, m ga-elegide ya anya.+ Mụ onwe m dị ka osisi junipa nke jupụtara n’akwụkwọ ndụ.+ Ọ bụ m ga-amịrị gị mkpụrụ.”  Ònye maara ihe, ka o wee ghọta ihe ndị a?+ Ònye nwere uche, ka o wee mara ha?+ N’ihi na ụzọ Jehova ziri ezi,+ ọ bụ ndị ezi omume ga na-eje ije na ya;+ ma ndị na-emebi iwu ga-asụ ngọngọ na ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ho 14:7*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.