Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hosia 12:1-14

12  “Ifrem na-eri ifufe,+ na-achụsokwa ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ ogologo ụbọchị dum.+ Ọ na-agha ụgha nke ukwuu, na-ebukọrọkwa ihe ndị mmadụ.+ Ha na Asiria agbawo ndụ,+ ha butekwaara Ijipt mmanụ.  “Jehova nwere okwu ikpe megide Juda,+ ọ ga-eme ka Jekọb zaa ajụjụ dị ka ụzọ ya niile si dị;+ ọ ga-akwụ ya ụgwọ dị ka omume ya si dị.+  O jidere nwanne ya n’ikiri ụkwụ mgbe ọ nọ n’afọ,+ o jikwa ike ya niile gbaso Chineke mgba.+  Ọ nọ na-agbaso mmụọ ozi mgba wee merie.+ Ọ kwara ákwá iji rịọtara onwe ya amara.”+ Chineke hụrụ ya na Betel,+ n’ebe ahụ ka Ọ malitere ịgwa anyị okwu.+  Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha,+ Jehova bụ aha e ji echeta ya.+  “Gị onwe gị kwesịrị ịlọghachikwute Chineke gị,+ bụ́ onye nwere obiọma,*+ na-ekpe ikpe ziri ezi;+ nweekwa olileanya mgbe niile n’ebe Chineke gị nọ.+  Onye ahịa ji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ aghụghọ n’aka;+ ọ bụ ịghọgbu ndị mmadụ na-atọ ya ụtọ.+  Ifrem na-asịkwa, ‘N’ezie, abawo m ọgaranya;+ achọtaworo m onwe m ihe ndị dị oké ọnụ ahịa.+ Ma ọ dịghị oké mmehie a ga-ahụ m mere+ ná ndọgbu niile m dọgburu onwe m n’ọrụ.’  “Ma abụ m Jehova bụ́ Chineke gị malite n’ala Ijipt.+ N’agbanyeghị nke ahụ, m ga-eme ka i biri n’ụlọikwuu dị ka i biri n’oge ememme. 10  M gwara ndị amụma okwu,+ meekwa ka a hụ ọtụtụ ọhụụ, m sitekwara n’aka ndị amụma na-eme ihe atụ dị iche iche.+ 11  “Gilied emewo anwansi,+ ghaakwa ụgha.+ Ha achụwo ehi dị iche iche n’àjà na Gilgal.+ Ebe ịchụàjà ha dịkwa ka ikpo nkume nke dị n’ebe a kọrọ ihe n’ubi.+ 12  Jekọb wee gbaga ala Siria,+ Izrel+ wee na-eje ozi iji lụta nwaanyị,+ o lekọtakwara atụrụ iji lụta nwaanyị.+ 13  Jehova wee si n’aka onye amụma kpọpụta Izrel n’Ijipt,+ onye amụma chere ya nche.+ 14  Ifrem mere omume na-akpasu iwe nke ukwuu,+ ọbara ọ wụfuru ga-adị ya n’isi,+ Nna ya Ukwu ga-akwụ ya ụgwọ maka nkọcha o wetara.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ho 12:6*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”