Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hosia 10:1-15

10  “Izrel bụ osisi vaịn mebiri emebi.+ Ọ na-amịrị onwe ya mkpụrụ.+ Dị ka mkpụrụ ọ mịrị dị ọtụtụ, otú ahụ ka ọ rụworo ọtụtụ ebe ịchụàjà.+ Dị ka ala ya dị mma, otú ahụ ka ha gwunyeworo ogidi ndị mara mma.+  Obi ha dị aghụghọ;+ ugbu a, a ga-ama ha ikpe. “E nwere onye ga-akwatu ebe ịchụàjà ha dị iche iche; ọ ga-ebukọrọ ogidi ha.+  N’ihi na ugbu a ha ga-asị, ‘Anyị enweghị eze,+ n’ihi na anyị atụghị egwu Jehova. Gịnị ka eze ga-emere anyị?’  “Ha na-ekwu naanị okwu, na-aṅụ iyi ụgha,+ na-agba ndụ;+ ikpe epuola dị ka ahịhịa na-egbu mmadụ nke puru n’ebe a kọrọ ihe.+  Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ n’ihi arụsị nwa ehi nke Bet-even;+ n’ihi na ndị ya ga-eruru ya uju, tinyere ndị nchụàjà chi ala ọzọ ya, bụ́ ndị na-enwebu aṅụrị n’ihi ya, n’ihi ebube ya, n’ihi na a ga-esi n’ebe ha nọ dọrọ ya n’agha.+  A ga-eburukwa ya gaa Asiria ka ọ bụrụ onyinye a ga-enye eze ukwu.+ Ọ bụ ihere ka Ifrem ga-enweta,+ ndụmọdụ Izrel ga-eme ya onwe ya ihere.+  Sameria na eze ya ga-ala n’iyi,+ dị ka ome a gbajipụrụ agbajipụ nke tọgbọ n’elu mmiri.  A ga-ala ebe ndị dị elu dị na Bet-even,+ bụ́ mmehie Izrel,+ n’iyi. Ogwu na uke+ ga-etochi ebe ịchụàjà ha.+ Ndị mmadụ ga-asịkwa ugwu ukwu, ‘Kpuchie anyị!’ sịkwa ugwu nta, ‘Dakwasị anyị!’+  “Izrel, i mehiewo+ malite n’ụbọchị Gibia.+ Ha esighị n’ebe ahụ pụọ. Agha e busoro ụmụ ajọ omume eruteghị ha na Gibia.+ 10  M ga-ata ha ahụhụ mgbe m chọrọ.+ M ga-akpọkọta ndị dị iche iche imegide ha, mgbe a ga-ekokwasị ha njehie abụọ ha.+ 11  “Ifrem bụ nwa ehi e nyere ọzụzụ nke ịzọcha mkpụrụ na-atọ ụtọ;+ mụ onwe m gabigara olu ya mara mma. M ga-eme ka mmadụ nọkwasị n’Ifrem.+ Juda ga-akọ ihe;+ Jekọb ga-egburiri ya ala.+ 12  Ghaaranụ onwe unu mkpụrụ n’ezi omume;+ jirinụ obiọma* ghọọ mkpụrụ.+ Kọọnụ ala ubi unu,+ mgbe oge ka dị ịchọ Jehova ruo mgbe ọ ga-abịa+ nye unu ntụziaka n’ezi omume.+ 13  “Unu akọwo ihe ọjọọ dị ka ubi.+ Unu aghọrọwo ajọ omume.+ Unu eriwo mkpụrụ aghụghọ,+ n’ihi na unu tụkwasịrị ụzọ unu obi,+ tụkwasịkwa ọtụtụ ndị dike unu obi.+ 14  E nwewo ọgba aghara n’etiti ndị gị,+ a ga-ebukọrọ ihe niile dị n’obodo gị ndị e wusiri ike+ otú ahụ Shalman bukọọrọ n’ụlọ Abel, n’ụbọchị agha, mgbe a kụriri otu nwaanyị na ụmụ ya.+ 15  Betel, otú a ka a ga-eme unu, n’ihi ihe ọjọọ unu nke gabigara ókè.+ Mgbe chi bọrọ, a ga-ala eze Izrel n’iyi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ho 10:12*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”