Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezra 9:1-15

9  Ozugbo e mechara ihe ndị a, ndị isi+ bịakwutere m, sị: “Ndị Izrel na ndị nchụàjà na ndị Livaị ekewapụbeghị+ onwe ha n’ebe ndị ala a nọ, ya bụ, ndị Kenan,+ ndị Het,+ ndị Perizaịt,+ ndị Jibọs,+ ndị Amọn,+ ndị Moab,+ ndị Ijipt+ na ndị Amọraịt+ n’ihe banyere ihe arụ+ ha.  N’ihi na ha alụrụwo ụfọdụ n’ime ndị inyom ha, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom;+ ha onwe ha kwa, bụ́ mkpụrụ dị nsọ,+ na ndị ala a na-emekọkwa ihe,+ ọ bụkwa ndị isi na ndị osote onye na-achị achị bu omume ekwesịghị ntụkwasị obi a n’isi.”+  Ozugbo m nụrụ ihe a, m dọwara uwe+ m na uwe elu m na-enweghị aka, m wee malite ifopụ ntutu isi+ m na ajị agba m, m wee nọrọ ọdụ n’ijuanya.+  Ha zukọtakwara n’ebe m nọ, onye ọ bụla nọ na-ama jijiji+ n’ihi okwu Chineke Izrel kwuru megide ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị a dọọrọ n’agha, ma m nọdụrụ ala kporopụ anya ruo mgbe a na-achụ àjà ọka* nke mgbede.+  Eyi m uwe mwụda m na uwe elu m na-enweghị aka nke m dọwara adọwa wee bilie mgbe a na-achụ àjà ọka+ nke mgbede, ka m wedasịrị onwe ala m, wee gbuo ikpere+ n’ala gbasapụrụ Jehova bụ́ Chineke m ọbụ aka m.+  M wee sị:+ “Chineke m, ihere+ na-eme m, ahụ́ erughịkwa m ala+ iwelite ihu m lee anya n’ebe ị nọ, Chineke m, n’ihi na njehie+ anyị dị ọtụtụ, ikpe ọmụma anyị adịwokwa ukwuu ruo ọbụna n’eluigwe.+  Malite n’oge nna nna anyị hà,+ anyị abụrụwo ndị ikpe mara nke ukwuu ruo taa;+ n’ihi njehie anyị, e nyefewo anyị onwe anyị, ndị eze+ anyị na ndị nchụàjà+ anyị n’aka ndị eze na-achị ala ndị a ka ha jiri mma agha+ gbuo anyị, dọrọ anyị n’agha,+ bukọrọkwa+ ihe anyị wee menye anyị ihere,+ dị ka ọ dị n’ụbọchị taa.  Jehova bụ́ Chineke anyị, i meworo anyị amara+ nwa mgbe nta site n’ime ka anyị nwee ndị fọdụrụ ndụ+ nakwa site n’inye anyị mkpọ́ n’ebe nsọ gị, Chineke anyị, i mewo ka anya anyị gbukepụ,+ meekwa ka anyị nwetatụ ume n’agbụ anyị nọ na ya.+  N’ihi na anyị bụ ndị ohu;+ Chineke anyị ahapụghịkwa anyị n’agbụ anyị nọ na ya,+ kama o gosiri anyị obiọma* n’ihu ndị eze Peshia,+ mee ka anyị nweta ume ka anyị wee wuo ụlọ Chineke anyị,+ wughachikwa ebe+ ya ndị tọgbọrọ n’efu, nyekwa anyị mgbidi e ji nkume wuo+ na Juda nakwa na Jeruselem. 10  “Chineke anyị, gịnị ka anyị ga-ekwu n’ihe a niile? N’ihi na anyị ahapụwo iwu gị,+ 11  nke i nyere site n’ọnụ ndị ohu gị bụ́ ndị amụma, sị, ‘Ala ahụ unu na-aga iweghara bụ ala rụrụ arụ n’ihi adịghị ọcha nke ndị ala ahụ,+ n’ihi ihe rụrụ arụ+ ha meworo ka o jupụta n’akụkụ ya niile+ site n’adịghị ọcha ha.+ 12  Unu ekenyekwala ụmụ ha ndị ikom+ ụmụ unu ndị inyom, unu alụtarala ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom; unu emekwala ihe ga-ewetara ha udo+ na ọganihu, ruo mgbe a na-akaghị aka, ka unu wee dị ike+ ma rie ihe ọma dị n’ala ahụ ma weghara ya maka ụmụ unu ruo mgbe a na-akaghị aka.’+ 13  Mgbe ihe a dum dakwasịchara anyị maka omume ọjọọ+ anyị na ikpe ọmụma anyị dị ukwuu—n’ihi na gị onwe gị, bụ́ Chineke anyị, eleghị njehie anyị anya otú ọ jọruru njọ,+ i mewokwa ka ndị a fọdụrụ anyị ndụ+ 14  ànyị ga-emebi iwu gị ọzọ, anyị na ndị a na-eme ihe arụ+ ewee na-agọ ọgọ?+ Ọ̀ bụ na ị gaghị eweso anyị oké iwe+ nke na ọ dịghị onye ga-afọdụ,+ ọ dịghịkwa onye ga-alanahụ? 15  Jehova bụ́ Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume,+ n’ihi na i mewo ka anyị fọdụ ndụ dị ka ndị lanahụrụ alanahụ dị ka ọ dị taa. Lee, anyị nọ n’ihu gị dị ka ndị ikpe mara,+ ọ bụ ezie na ọ gaghị ekwe omume iguzo n’ihu gị n’ihi nke a.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezr 9:4*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
Ezr 9:9*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”