Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezra 7:1-28

7  Mgbe ihe ndị a gasịrị, n’ọchịchị Atazaksis+ eze Peshia, Ezra+ nwa Seraya+ nwa Azaraya nwa Hilkaya+  nwa Shalọm+ nwa Zedọk nwa Ahaịtọb+  nwa Amaraya+ nwa Azaraya+ nwa Mereyọt+  nwa Zerahaya+ nwa Ọzaị+ nwa Bọkaị+  nwa Abishua+ nwa Finihas+ nwa Elieza+ nwa Erọn+ onyeisi nchụàjà+  ọ bụ Ezra nke a si na Babịlọn lawa; ọ bụkwa ọkà n’idepụta ihe+ dị n’iwu Mozis,+ nke Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere, nke mere ka eze nye ya ihe niile ọ rịọrọ, dị ka aka Jehova bụ́ Chineke ya nke dị n’ahụ́ ya si dị.+  N’ihi ya, ụfọdụ n’ime ụmụ Izrel na ndị nchụàjà+ na ndị Livaị+ na ndị na-abụ abụ+ na ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ na ndị Netinim+ lawara Jeruselem n’afọ nke asaa nke ọchịchị Eze Atazaksis.+  E mesịa, o rutere Jeruselem n’ọnwa nke ise, ya bụ, n’afọ nke asaa nke ọchịchị eze.  N’ihi na n’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, o si na Babịlọn malite njem ya, ọ bịarutekwara Jeruselem n’abalị mbụ n’ọnwa nke ise, n’ihi na aka Chineke ya dị mma n’ahụ́ ya.+ 10  N’ihi na Ezra akwadebewo+ obi ya ịtụle iwu Jehova+ na idebe ya+ nakwa ịkụzi+ ụkpụrụ+ na ikpe ziri ezi+ n’Izrel. 11  Nke a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi Eze Atazaksis degaara Ezra bụ́ onye nchụàjà na ọkà n’idepụta ihe,+ bụ́ ọkà n’idepụta ihe dị n’iwu Jehova na ihe dị n’ụkpụrụ o nyere Izrel: 12  “Akwụkwọ ozi nke Atazaksis,+ bụ́ eze ndị eze,+ degaara Ezra onye nchụàjà, onye bụ́ ọkà n’idepụta ihe dị n’iwu Chineke nke eluigwe:+ Udo dịrị gị.+ Ugbu a, 13  enyewo m iwu+ ka onye ọ bụla nọ n’alaeze m+ bụ́ onye Izrel na ndị nchụàjà ha na ndị Livaị nke chọrọ iso gị laa Jeruselem lawa.+ 14  Ebe ọ bụ na e si n’aka eze na ndị ndụmọdụ asaa+ ya nye iwu ka e mee nchọpụta+ banyere Juda na Jeruselem dị ka iwu+ Chineke gị+ si dị, bụ́ nke i ji, 15  nakwa ka e bute ọlaọcha na ọlaedo nke eze na ndị ndụmọdụ ya nyere Chineke Izrel n’afọ ofufo,+ bụ́ onye ebe obibi ya dị na Jeruselem,+ 16  tinyere ọlaọcha na ọlaedo niile ị ga-ahụ n’ógbè Babịlọn a na-achị achị nakwa onyinye nke ndị gị+ na nke ndị nchụàjà bụ́ ndị na-enye ụlọ Chineke ha+ nke dị na Jeruselem onyinye n’afọ ofufo; 17  n’ihi ya, n’egbughị oge, ị ga-eji ego a zụọ oké ehi,+ ebule,+ ụmụ atụrụ+ na àjà ọka*+ ha na àjà ihe ọṅụṅụ+ ha, ị ga-achụkwa ha n’àjà n’elu ebe ịchụàjà nke ụlọ Chineke unu,+ nke dị na Jeruselem.+ 18  “Ihe ọ bụla nke dị mma n’anya gị na ụmụnne gị iji ọlaọcha na ọlaedo+ ndị fọdụrụ mee, dị ka uche+ Chineke unu si dị, meenụ ya.+ 19  Arịa+ a na-ebunye gị maka ije ozi n’ụlọ Chineke gị, buga ha niile na Jeruselem n’ihu Chineke gị.+ 20  Ihe ndị ọzọ dị mkpa n’ụlọ Chineke gị bụ́ ndị i kwesịrị inye, ị ga-esi n’ụlọ akụ̀ eze were ha nye.+ 21  “Ọ bụ mụ onwe m, bụ́ Eze Atazaksis, nyere ndị niile na-echekwa akụ̀+ n’ofe Osimiri+ iwu,+ na ihe niile Ezra+ onye nchụàjà, onye bụ́ ọkà n’idepụta ihe dị n’iwu Chineke nke eluigwe, rịọrọ unu, meenụ ya n’egbughị oge, 22  ọ bụrụgodị na o ruru otu narị talent+ ọlaọcha na otu narị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ ọka wit+ na otu narị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat+ mmanya+ nakwa otu narị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat mmanụ,+ na nnu+ hiri nne nke ukwuu. 23  Ka e jiri ịnụ ọkụ n’obi mee+ ihe niile Chineke nke eluigwe+ nyere n’iwu,+ ka ọ ghara iweso alaeze eze nakwa ụmụ ya iwe.+ 24  A na-emekwa ka unu mara na a gaghị ana ndị nchụàjà+ na ndị Livaị,+ ndị egwú,+ ndị nche ọnụ ụzọ,+ ndị Netinim,+ na ndị niile na-arụ ọrụ n’ụlọ Chineke nke a, ụtụ isi, ụtụ ahịa+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ.+ 25  “Ma gị onwe gị, Ezra, dị ka amamihe+ Chineke gị nke i nwere si dị, họpụta ndị ọrụ ga na-ahụ na e debere iwu na ndị ikpe ka ha na-ekpe ndị niile nọ n’ofe Osimiri ikpe,+ bụ́ ndị niile maara iwu Chineke gị; unu kụziekwara ya onye ọ bụla na-amaghị ya.+ 26  Ka e meekwa ihe e kpere n’ikpe n’egbughị oge n’ahụ́ onye ọ bụla na-edebeghị iwu Chineke gị+ na iwu eze, ma ọ bụ igbu ya egbu+ ma ọ bụ ịchụpụ ya n’obodo,+ ma ọ bụ iri ya iwu+ ma ọ bụkwanụ ịtụ ya mkpọrọ.” 27  Ka Jehova bụ́ Chineke nna nna anyị hà+ bụrụ onye a gọziri agọzi, onye tinyere ihe dị otú ahụ n’obi+ eze, ịchọ ụlọ Jehova, nke dị na Jeruselem, mma!+ 28  O gosiwokwa m obiọma*+ n’ihu eze na ndị ndụmọdụ ya+ nakwa n’ihu ndị isi niile nke eze bụ́ ndị dike. Emekwara m onwe m ka m dị ike n’ihi aka+ Jehova bụ́ Chineke m nke dị n’ahụ́ m, m wee si n’Izrel họpụta ndị isi ka ha soro m laa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezr 7:17*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
Ezr 7:28*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”