Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezra 5:1-17

5  Hagaị+ onye amụma na Zekaraya+ nwa nwa Ido+ onye amụma buuru ndị Juu nọ na Juda na Jeruselem amụma n’aha+ Chineke Izrel, bụ́ onye nọnyeere ha.+  Ọ bụ mgbe ahụ ka Zerọbabel+ nwa Shieltiel+ na Jeshụa+ nwa Jehọzadak biliri wee malite iwughachi ụlọ Chineke nke dị na Jeruselem; ndị amụma Chineke,+ bụ́ ndị na-enyere ha aka, sokwa ha.  N’oge ahụ, Tatenaị+ bụ́ gọvanọ ofe Osimiri Yufretis+ na Shita-bọzenaị na ndị ọrụ ibe ha bịakwutere ha, ha nọkwa na-agwa ha, sị: “Ònye nyere unu iwu ịrụ ụlọ a na iwucha ogidi a?”+  Ha wee sị ha: “Gịnị bụ aha ndị ikom na-ewu ụlọ a?”  Anya+ Chineke ha dị n’ahụ́+ ndị okenye ndị Juu, ha akwụsịghịkwa ha ruo mgbe akụkọ ahụ ruru Darayọs ntị, e zitekwa akwụkwọ ozi e dere banyere ihe a.  Nke a bụ ihe e dere+ n’akwụkwọ ozi ahụ Tatenaị+ bụ́ gọvanọ ofe Osimiri Yufretis+ na Shita-bọzenaị+ na ndị ọrụ ibe ha,+ ndị gọvanọ ọkwá ha dị ala bụ́ ndị nọ n’ofe Osimiri, zigaara eze Darayọs ;  ha zigaara ya ozi, e dekwara n’ime ya, sị: “Eze Darayọs: “Udo dịrị gị!+  Ka eze mara na anyị gara n’ógbè Juda a na-achị achị,+ n’ụlọ Chineke ukwu ahụ,+ e ji nnukwu nkume na-ewu ya, a na-etinyekwa osisi ná mgbidi ya; e jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ahụ, ọ na-agakwa n’ihu n’aka ha.  Anyị wee jụọ ndị okenye a ajụjụ. Nke a bụ ihe anyị gwara ha: ‘Ònye nyere unu iwu ịrụ ụlọ a na iwucha ogidi a?’+ 10  Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị mee ka ị mara, ka anyị wee dee aha ndị ikom ahụ bụ́ ndị isi ha n’akwụkwọ.+ 11  “Nke a bụkwa ozi ha zighachiiri anyị, sị: ‘Anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa,+ anyị na-ewughachi ụlọ e wuru ọtụtụ afọ gara aga, nke otu eze ukwu nke Izrel wuru wee wuchaa.+ 12  Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ndị nna anyị kpasuru Chineke nke eluigwe iwe,+ o nyefere+ ha n’aka Nebukadneza+ eze Babịlọn, onye Kaldia,+ ọ kwadakwara ụlọ a+ wee dọrọ ndị anyị n’agha laa Babịlọn.+ 13  Otú o sina dị, n’afọ mbụ nke Saịrọs+ eze Babịlọn, eze Saịrọs nyere iwu ka e wughachi ụlọ Chineke a.+ 14  Arịa ọlaedo na nke ọlaọcha+ nke ụlọ Chineke, bụ́ ndị Nebukadneza bupụtara n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, wee bute ha n’ụlọ nsọ Babịlọn,+ ọ bụ ihe ndị a ka eze Saịrọs+ bupụtara n’ụlọ nsọ Babịlọn nyefee Sheshbaza,+ bụ́ aha onye o mere gọvanọ.+ 15  O wee sị ya: “Buru arịa ndị a.+ Gaa debe ha n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ka e wughachi ụlọ Chineke n’ebe ahụ ọ dịbu.”+ 16  Mgbe Sheshbaza bịara, ọ tọrọ ntọala ụlọ Chineke,+ nke dị na Jeruselem; malitekwa mgbe ahụ ruo ugbu a, a nọwo na-ewughachi ya, ma e wuchabeghị ya.’+ 17  “Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka a gaa n’ụlọ akụ̀ eze nke dị na Babịlọn chọpụta+ ma ọ̀ bụ eziokwu na eze Saịrọs nyere iwu+ ka e wughachi ụlọ Chineke nke dị na Jeruselem; ka eze zitekwara anyị ihe o kpebiri banyere ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji