Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezra 4:1-24

4  Mgbe ndị iro+ Juda na Benjamin nụrụ na ndị ahụ a dọọrọ n’agha,+ bụ́ ndị mesịrị lọta, na-ewuru Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ nsọ,  ha bịakwutere Zerọbabel+ na ndị isi+ nke ọnụmara dị iche iche ozugbo wee sị ha: “Ka anyị soro unu+ wuo ụlọ a; n’ihi na, dị nnọọ ka unu na-eme, anyị onwe anyị na-achọ Chineke unu,+ ọ bụkwa ya ka anyị na-achụrụ àjà kemgbe ụbọchị Isa-hadọn+ eze Asiria, bụ́ onye kpọgotere anyị n’ebe a.”+  Otú ọ dị, Zerọbabel na Jeshụa+ na ndị isi+ nke ọnụmara ndị ọzọ sịrị ha: “Ọ dịghị ihe jikọrọ anyị na unu n’ụlọ a anyị na-ewuru Chineke anyị,+ n’ihi na anyị onwe anyị ga-agbakọ aka wuoro Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ, dị nnọọ ka Saịrọs+ eze Peshia nyere anyị n’iwu.”  Ndị ala ahụ wee na-akụda ndị Juda aka,+ na-akụdakwa ha obi ka ha ghara iwu ụlọ ahụ,+  na-ego+ ndị ndụmọdụ ga na-emebi atụmatụ ha ụbọchị niile Saịrọs eze Peshia na-achị ruo n’oge ọchịchị Darayọs+ eze Peshia.  N’ọchịchị Ahazuirọs, mgbe ọ malitere ịchị, ha dere akwụkwọ ha ji bo ndị bi na Juda na Jeruselem ebubo.+  N’oge ọchịchị Atazaksis, Bishlam, Mitridat, Tabiel na ndị ọrụ ibe ya ndị ọzọ degaara Atazaksis eze Peshia akwụkwọ ozi ná mkpụrụ akwụkwọ Arameik, a sụgharịkwara ya n’asụsụ Arameik.+  Rihọm bụ́ onyeisi ndị na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ degaara eze Atazaksis akwụkwọ ozi megide Jeruselem, sị:  Rihọm+ bụ́ onyeisi ndị na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọrụ ibe ha ndị ọzọ, ndị ikpe na ndị gọvanọ ọkwá ha dị ala bụ́ ndị nọ n’ofe Osimiri Yufretis,+ ndị odeakwụkwọ,+ ndị Irek,+ ndị Babịlọn,+ ndị bi na Susa,+ ya bụ, ndị Ilam,+ 10  na mba ndị ọzọ+ bụ́ ndị Asenapa+ onye ukwu na onye a na-asọpụrụ dọọrọ n’agha wee mee ka ha biri n’obodo ndị dị na Sameria,+ na ndị ọzọ bi n’ofe Osimiri Yufretis,——; 11  nke a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ ha zipụrụ banyere ya: “Atazaksis+ bụ́ eze, ndị na-ejere gị ozi, ndị nọ n’ofe Osimiri Yufretis, na-edetara gị akwụkwọ ozi: 12  Ka eze mara na ndị Juu bụ́ ndị si n’ebe ị nọ bịakwute anyị ebe a abịarutewo Jeruselem. Ha na-ewu obodo ahụ nke na-enupụ isi, nke bụkwa obodo ọjọọ, ha na-achọ iwucha mgbidi ya+ na ịrụzi ntọala ya. 13  Ugbu a, ka eze mara na ọ bụrụ na e wughachi obodo a ma wuchaa mgbidi ya, ha agaghị atụ ụtụ isi+ ma ọ bụ ụtụ ahịa+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ, ọ ga-eme ka eze ghara inweta ihe o kwesịrị ịdị na-enweta.+ 14  Ebe ọ bụ na anyị na-eri nnu si n’obí eze, o kwesịghị ekwesị ka anyị hụ ka a na-agbawa eze aka. Ọ bụ ya mere anyị ji zite ozi wee kọọrọ ya eze, 15  ka e wee nyochaa akwụkwọ ndekọ+ nna nna gị hà. Ị ga-ahụkwa n’akwụkwọ ndekọ ahụ, matakwa na obodo ahụ bụ obodo na-enupụ isi ma na-eme ka ndị eze na ógbè dị iche iche a na-achị achị ghara inweta ihe ha kwesịrị ịdị na-enweta. Ị ga-amatakwa na, malite n’oge gboo, e nwere ndị na-akpali nnupụisi n’ime ya. Ọ bụ ya mere e ji mee ka obodo ahụ bụrụ mkpọmkpọ ebe.+ 16  Anyị na-eme ka eze mara na, ọ bụrụ na e wughachi obodo ahụ ma wuchaa mgbidi ya, ị gaghịkwa enwe òkè n’ofe Osimiri.”+ 17  Eze wee zigara Rihọm+ bụ́ onyeisi ndị na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọrụ ibe ha ndị ọzọ+ bi na Sameria na ndị ọzọ nọ n’ofe Osimiri Yufretis ozi, sị: “Ana m ekele unu!+ Ugbu a, 18  a gụworo m akwụkwọ ozi ahụ unu ziteere anyị nke ọma. 19  Ya mere, etiwo m iwu, ha emewokwa nchọpụta+ wee hụ na, malite n’oge gboo, obodo ahụ bụ obodo nke na-ebili emegide ndị eze, nke na-enupụkwa isi ma na-emegide ndị ọchịchị ya.+ 20  E nwekwara ndị eze dị ike+ chịrị Jeruselem, ndị chịkwara ndị niile nọ n’ofe Osimiri Yufretis,+ e wee na-atụrụ ha ụtụ isi na ụtụ ahịa na ụtụ ụzọ.+ 21  Nyenụ iwu ka ndị ikom a kwụsị, ka a ghara iwughachi obodo ahụ ruo mgbe m nyere iwu. 22  Ya mere, lezienụ anya ka a ghara ileghara ime ihe a anya, ka a ghara imebikwuru ndị eze ihe.”+ 23  Mgbe a gụsịịrị Rihọm+ na Shimshaị+ bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọrụ ibe ha+ akwụkwọ ozi eze Atazaksis, ha ji ọsọ gaa Jeruselem, gakwuru ndị Juu wee jiri ngwá agha mee ka ha kwụsị ọrụ.+ 24  Ọ bụ mgbe ahụ ka ọrụ a na-arụ n’ụlọ Chineke, nke dị na Jeruselem, kwụsịrị; ọ kwụsịkwara ruo n’afọ nke abụọ nke ọchịchị Darayọs+ eze Peshia.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji