Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezra 3:1-13

3  N’ọnwa nke asaa,+ ụmụ Izrel nọcha n’obodo ha. Ha wee malite izukọta na Jeruselem+ dị ka otu onye.+  Jeshụa+ nwa Jehọzadak na ụmụnne ya bụ́ ndị nchụàjà nakwa Zerọbabel+ nwa Shieltiel+ na ụmụnne ya wee bilie wuo ebe ịchụàjà nke Chineke Izrel, iji chụọ àjà nsure ọkụ n’elu ya, dị ka ihe e dere+ n’iwu Mozis bụ́ onye nke ezi Chineke si dị.  Ha wee mee ka ebe ịchụàjà ahụ guzosie ike n’ebe ọ dịbu,+ n’ihi na ụjọ bịara ha n’ihi ndị ala ahụ,+ ha wee malite ịchụrụ Jehova àjà nsure ọkụ n’elu ya, ya bụ, àjà nsure ọkụ a na-achụ n’ụtụtụ na nke a na-achụ ná mgbede.+  Ha wee mee ememme ụlọ ndò+ dị ka ihe e dere ede si dị,+ na-achụ àjà nsure ọkụ kwa ụbọchị ugboro ole iwu kwuru ka a chụọ ya n’ụbọchị ọ bụla.+  E mesịa, a chụrụ àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile+ na nke a na-achụ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ nakwa n’oge ememme niile e doro nsọ+ nke Jehova nakwa maka onye ọ bụla nyere Jehova onyinye afọ ofufo.+  Site n’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa+ gaa n’ihu, ha malitere ịchụrụ Jehova àjà nsure ọkụ, mgbe a na-atọbeghị ntọala ụlọ nsọ Jehova.  Ha wee nye ndị na-awa nkume+ na ndị omenkà+ ego,+ nyekwa ndị Saịdọn+ na ndị Taya+ ihe oriri+ na ihe ọṅụṅụ na mmanụ,+ ka ha si na Lebanọn+ bute osisi sida n’oké osimiri dị na Jọpa,+ dị ka ikike Saịrọs+ eze Peshia nyere ha si dị.  N’afọ nke abụọ mgbe ha bịarutesịrị n’ụlọ ezi Chineke nke dị na Jeruselem, n’ọnwa nke abụọ,+ Zerọbabel+ nwa Shieltiel+ na Jeshụa+ nwa Jehọzadak na ụmụnne ha ndị ọzọ, bụ́ ndị nchụàjà na ndị Livaị, nakwa ndị niile si ebe a dọọrọ ha n’agha lọta+ Jeruselem malitere ọrụ; ha wee mee ndị Livaị+ gbara afọ iri abụọ gbagowe ndị na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova.+  Jeshụa,+ ụmụ ya na ụmụnne ya, nakwa Kadmiel na ụmụ ya, bụ́ ụmụ Juda, wee bilie dị ka otu ìgwè ịrụ ọrụ dị ka ndị na-elekọta ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ezi Chineke, tinyekwara ụmụ Henadad,+ ụmụ ha na ụmụnne ha, bụ́ ndị Livaị. 10  Mgbe ndị ahụ na-ewu ụlọ tọrọ ntọala+ ụlọ nsọ Jehova, ndị nchụàjà, bụ́ ndị yi uwe ndị nchụàjà+ ma jiri opi,+ na ndị Livaị bụ́ ụmụ Esaf,+ ndị ji ájà,+ biliri ito Jehova dị ka ntụziaka Devid bụ́ eze Izrel nyere si dị.+ 11  Ha wee malite ito+ Jehova na ikele ya site n’ịbụ abụ, sị, “n’ihi na ọ dị mma,+ n’ihi na obiọma* ya n’ebe Izrel nọ na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ Ma ndị Izrel niile ji oké olu tie mkpu+ wee too Jehova n’ihi na a tọrọ ntọala ụlọ Jehova. 12  Ọtụtụ n’ime ndị nchụàjà+ na ndị Livaị na ndị isi nke ọnụmara dị iche iche,+ ndị agadi bụ́ ndị hụrụ ụlọ mbụ ahụ,+ nọ na-akwa ákwá+ n’olu dara ụda mgbe a na-atọ ntọala+ ụlọ a n’ihu ha, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ.+ 13  N’ihi ya, ndị mmadụ amataghị nke bụ́ mkpu ọṅụ+ na nke bụ́ mkpu ákwá ndị mmadụ na-eti, n’ihi na ndị mmadụ nọ na-eti oké mkpu, a nọkwa ọbụna n’ebe dị anya na-anụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezr 3:11*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”