Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezra 10:1-44

10  Ngwa ngwa Ezra kpesịrị ekpere,+ meekwa nkwupụta+ ka ọ na-akwa ákwá ma gbatịa onwe ya n’ala+ n’ihu ụlọ+ ezi Chineke, ndị Izrel zukọtara n’ebe ọ nọ, wee bụrụ ọgbakọ dị nnọọ ukwuu, ndị ikom na ndị inyom na ụmụaka, n’ihi na mmadụ niile akwawo ákwá nke ukwuu.  Shekanaya nwa Jehayel,+ nke bụ́ otu n’ime ụmụ Ilam,+ zara Ezra, sị: “Anyị onwe anyị emesowo Chineke anyị omume ekwesịghị ntụkwasị obi, anyị wee si n’etiti ndị ala a lụbata ndị inyom mba ọzọ.+ Ma n’ihe a, Izrel ka nwere olileanya.+  Ugbu a, ka anyị na Chineke anyị gbaa ndụ+ ịchụpụ+ ndị inyom ndị a niile na ụmụ ha dị ka ndụmọdụ Jehova sị dị, tinyere ndụmọdụ nke ndị na-ama jijiji+ n’ihe Chineke anyị nyere n’iwu,+ ka e wee mee ya otú iwu kwuru.+  Bilie, n’ihi na okwu a dị gị n’aka, anyị nọnyekwaara gị. Dị ike, meekwa ihe.”  Ezra wee bilie mee ka ndị isi ndị nchụàjà, ndị Livaị na Izrel dum ṅụọ iyi+ ime ihe a e kwuru. Ha wee ṅụọ iyi.  Ezra wee bilie n’ụlọ ezi Chineke gaa n’ụlọ iri+ ihe nke Jehohenan nwa Elayashib. Ọ bụ ezie na ọ gara ebe ahụ, o righị ihe ọ bụla,+ ọ ṅụghịkwa mmiri ọ bụla, n’ihi na ọ na-eru uju+ maka ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị ahụ a dọọrọ n’agha.  Ha wee mee ka a kpọsaa na Juda nakwa na Jeruselem dum ka ndị niile bụbu ndị a dọọrọ n’agha+ zukọta na Jeruselem;  onye ọ bụla nke na-abịaghị+ n’ime ụbọchị atọ dị ka ndụmọdụ nke ndị isi+ na ndị okenye si dị—a ga-ejichi ngwongwo ya niile,+ a ga-ekewapụkwa+ ya n’ọgbakọ nke ndị a dọọrọ n’agha.  Ndị Juda na ndị Benjamin wee zukọta na Jeruselem n’ime ụbọchị atọ, ya bụ, n’ọnwa nke itoolu,+ n’abalị iri na abụọ n’ọnwa ahụ, mmadụ niile wee nọrọ ala na mbara èzí nke ụlọ ezi Chineke, na-ama jijiji n’ihi okwu ahụ nakwa n’ihi mmiri ozuzo.+ 10  E mesịa, Ezra onye nchụàjà biliri wee sị ha: “Unu emewo omume ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihi na unu lụbatara ndị inyom mba ọzọ+ iji tụkwasị ihe n’ikpe ọmụma Izrel.+ 11  Ugbu a, kwupụtaranụ+ Jehova bụ́ Chineke nke nna nna unu hà mmehie unu, meekwanụ ihe na-atọ ya ụtọ,+ kewapụkwanụ onwe unu n’ebe ndị ala a na ndị inyom mba ọzọ+ nọ.” 12  Ọgbakọ ahụ dum wee jiri oké olu zaa, sị: “Anyị ga-eme kpọmkwem dị ka i kwuru.+ 13  Otú ọ dị, ndị gbakọtaranụ hiri nne, ọ bụkwa oge udu mmiri, anyị agaghịkwa eguzoli n’èzí; ihe a ga-eme agaghịkwa ewe otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ, n’ihi na anyị enupụwo isi nke ukwuu n’okwu a. 14  Ya mere, biko, ka ndị isi+ anyị nọchite anya ọgbakọ a dum; ka ndị niile nọ n’obodo anyị, bụ́ ndị lụbatara ndị inyom mba ọzọ, bịa n’oge a kara aka, ha na ndị okenye obodo nke ọ bụla na ndị ikpe ya, ruo mgbe anyị mere ka oké iwe Chineke anyị na-eweso anyị n’ihi ihe a dajụọ.” 15  (Otú ọ dị, Jọnatan nwa Asahel na Jazaya nwa Tikva gbasoro nke a mgba,+ ọ bụkwa Meshọlam na Shabetaị,+ bụ́ ndị Livaị, nyeere ha aka.) 16  Ndị ahụ bụbu ndị a dọọrọ n’agha+ wee mee otú ahụ; Ezra onye nchụàjà na ndị ikom bụ́ ndị isi nke ndị bụ́ nna n’ọnụmara+ ha, ọbụna ha niile dị ka aha ha si dị, wee kewapụ onwe ha ma nọdụ ala n’abalị mbụ n’ọnwa nke iri+ iji leba anya n’okwu ahụ;+ 17  ha wee lebachaa anya n’okwu metụtara ndị ikom niile lụbatara ndị inyom mba ọzọ+ n’abalị mbụ n’ọnwa nke mbụ. 18  E wee chọpụta ụfọdụ n’ime ụmụ ndị nchụàjà+ ndị lụbatara ndị inyom mba ọzọ; n’ime ụmụ Jeshụa+ nwa Jehọzadak+ na ụmụnne ya, Measaya na Elịiza na Jerib na Gedalaya. 19  Ma site n’ikwe n’aka, ha kwere nkwa na ha ga-achụpụ nwunye ha, na ha ga-esikwa n’ìgwè atụrụ weta ebule+ maka ikpe ọmụma ha, ebe ọ bụ na ikpe mara ha.+ 20  N’ime ụmụ Ịma,+ e nwere Hanenaị na Zebadaya; 21  n’ime ụmụ Herim,+ Measaya na Elaịja na Shemaya na Jehayel na Ọzaya; 22  n’ime ụmụ Pash-họ,+ Elio-inaị, Measaya, Ishmel, Netanel, Jozabad na Eliesa. 23  N’ime ndị Livaị, Jozabad na Shimiaị na Kelaya (ya bụ, Kelaịta), Petahaya, Juda na Elịiza; 24  n’ime ndị na-abụ abụ, Elayashib; n’ime ndị nche ọnụ ụzọ ámá, Shalọm na Tilem na Yuraị. 25  N’ime ndị Izrel, n’ime ụmụ Perọsh,+ e nwere Ramaya na Izaya na Malkaịja na Mijamin na Elieza na Malkaịja na Benaya; 26  n’ime ụmụ Ilam,+ Matanaya, Zekaraya na Jehayel+ na Abdaị na Jeremọt na Elaịja; 27  n’ime ụmụ Zatu,+ Elio-inaị, Elayashib, Matanaya na Jeremọt na Zebad na Azaịza; 28  n’ime ụmụ Bibaị,+ Jehohenan, Hananaya, Zabaị, Atlaị; 29  n’ime ụmụ Benaị, Meshọlam, Malọk na Adaya, Jeshọb na Shiel na Jeremọt; 30  n’ime ụmụ Pehat-moab,+ Adna na Kilal, Benaya, Measaya, Matanaya, Bezalel na Binuaị na Manase; 31  n’ime ụmụ Herim,+ Elịiza, Ishaịja, Malkaịja,+ Shemaya, Shimiọn, 32  Benjamin, Malọk na Shemaraya; 33  n’ime ụmụ Heshọm,+ Matinaị, Matata, Zebad, Elifelet, Jeremaị, Manase na Shimiaị; 34  n’ime ụmụ Benaị, Meadaị, Amram na Yuel, 35  Benaya, Bedaya, Keluhaị, 36  Vanaya, Meremọt, Elayashib, 37  Matanaya, Matinaị na Jeasu; 38  n’ime ụmụ Binuaị, Shimiaị 39  na Shelemaya na Netan na Adaya, 40  Maknadebaị, Sheshaị, Sheraị, 41  Azarel na Shelemaya, Shemaraya, 42  Shalọm, Amaraya, Josef; 43  n’ime ụmụ Nibo, Jeayel, Matitaya, Zebad, Zebaịna, Jadaị na Joel na Benaya. 44  Ndị a niile lụbatara ndị inyom mba ọzọ,+ ha wee chụpụ ha na ụmụ ha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji