Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 40:1-49

40  N’afọ nke iri abụọ na ise mgbe a dọsịịrị anyị n’agha,+ ná mbido afọ ahụ, n’abalị iri n’ọnwa ahụ, n’afọ nke iri na anọ mgbe e tidasịrị obodo ahụ,+ n’otu ụbọchị ahụ ka aka Jehova dịkwasịrị m,+ o wee kpọta m n’ebe ahụ.+  N’ọhụụ Chineke, ọ kpọtara m n’ala Izrel wee kpọsa m n’elu otu ugwu dị nnọọ elu,+ bụ́ ebe e nwere ihe yiri obodo n’ebe ndịda ya.+  O wee kpọta m n’ebe ahụ, ma, lee! otu nwoke nọ n’ebe ahụ. O yiri ọla kọpa,+ o jikwa ụdọ ogho n’aka ya, tinyere okporo ahịhịa amị e ji atụ̀ ihe+ ma guzoro n’ọnụ ụzọ ámá.  Nwoke ahụ wee malite ịsị m: “Nwa nke mmadụ,+ jiri anya gị hụrụ, jirikwa ntị gị nụrụ, tinyekwa obi gị n’ihe niile m na-egosi gị, n’ihi na m kpọtara gị ebe a ka m gosi gị ihe ndị a. Gwa ụlọ Izrel ihe niile ị na-ahụ.”+  Lee! Mgbidi gbara ụlọ ahụ gburugburu. Nwoke ahụ jikwa okporo ahịhịa amị e ji atụ̀ ihe nke dị kubit isii n’aka ya. Kubit nke ọ bụla bụ otu kubit na otu uhiè ọbụ aka. O wee malite ịtụ obosara ihe owuwu ahụ. O wee bụrụ otu okporo ahịhịa amị; ịdị elu ya bụkwa otu okporo ahịhịa amị.  O wee bịa n’ọnụ ụzọ ámá, nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ wee gbagoo n’ebe e si arịgo ya. O wee malite ịtụ ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá ahụ.+ Ọ dị otu okporo ahịhịa amị n’obosara, ụzọ mbata nke ọzọ dị otu okporo ahịhịa amị n’obosara.  Ụlọ ndị nche dịkwa otu okporo ahịhịa amị n’ogologo nakwa otu okporo ahịhịa amị n’obosara. Agbata otu ụlọ nche na ibe ya+ dị kubit ise. Ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá ahụ, n’akụkụ ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá ahụ, nke chere ihu n’ebe dị n’ime ime, dịkwa otu okporo ahịhịa amị.  O wee tụọ ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá ahụ, nke chere ihu n’ebe dị n’ime ime, ọ dị otu okporo ahịhịa amị.+  O wee tụọ ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá, ọ dị kubit asatọ; ogidi ndị dị n’akụkụ ya dị kubit abụọ; ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá ahụ chere ihu n’ebe dị n’ime ime. 10  Ụlọ ndị nche ndị dị n’ọnụ ụzọ ámá, n’ebe ọwụwa anyanwụ, dị atọ n’otu akụkụ, dịrịkwa atọ n’akụkụ nke ọzọ. Ha atọ enweghị nke ka ibe ya, ogidi ndị dị n’akụkụ ha enweghịkwa nke ka ibe ya, n’otu akụkụ nakwa n’akụkụ nke ọzọ. 11  O wee tụọ obosara nke ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, ọ dị kubit iri; ọnụ ụzọ ámá ahụ dị kubit iri na atọ n’ogologo. 12  Ebe a gbara ogige n’ihu ụlọ ndị nche dị otu kubit, ebe a gbara ogige nke dị otu kubit dịkwa ya n’akụkụ abụọ. Ụlọ ndị nche ahụ dịkwa kubit isii n’otu akụkụ nakwa kubit isii n’akụkụ nke ọzọ. 13  O wee tụọ ọnụ ụzọ ámá ahụ malite n’elu ụlọ nke otu ụlọ ndị nche ruo n’elu nke ọzọ, ọ dị kubit iri abụọ na ise n’obosara;+ ọnụ ụzọ e si abanye n’otu chere ọnụ ụzọ nke ọzọ ihu. 14  O wee tụọ ogidi ndị dị n’akụkụ, ha dị kubit iri isii, ee, ogidi ndị dị n’akụkụ, n’ogige nke ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ gbaa gburugburu. 15  Malite n’ihu ọnụ ụzọ ámá e si abanye ya ruo n’ihu ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ime ime dị kubit iri ise. 16  E nwekwara windo ndị dị warara+ ná mpụta karịa otú ha dị n’ime n’ụlọ ndị nche ahụ nakwa n’ogidi ha ndị dị n’akụkụ n’ebe chere ime ọnụ ụzọ ámá ahụ ihu gbaa gburugburu, otú ahụkwa ka e si rụọ ihe owuwu ụzọ mbata ndị ahụ. Windo dị n’ebe ime ya gbaa gburugburu, a tụkwara nkwụ n’ogidi ndị ahụ dị n’akụkụ.+ 17  O wee kpọbata m n’ogige dị ná mpụta, ma, lee! e nwere ụlọ iri ihe+ nakwa pevment a rụrụ gburugburu ogige ahụ. E wuru ụlọ iri ihe dị iri atọ n’elu pevment ahụ.+ 18  Pevment nke dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá ahụ hà nnọọ ka ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ n’ogologo, ọ bụ ya bụ pevment nke ala ala. 19  O wee tụọ obosara ya malite n’ihu ọnụ ụzọ ámá ndịda ruo n’ihu ogige nke dị n’ime. Ọ dị otu narị kubit ná mpụta, n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ugwu. 20  Ogige nke dị ná mpụta nwere otu ọnụ ụzọ ámá nke chere ihu n’ebe ugwu. Ọ tụrụ ma ogologo ya ma obosara ya. 21  Ụlọ ndị nche ya dị atọ n’otu akụkụ, dịkwa atọ n’akụkụ nke ọzọ. Ogidi ndị dị n’akụkụ ya nakwa ihe owuwu ụzọ mbata ya hà ka ọnụ ụzọ ámá mbụ ahụ. Ọ dị kubit iri ise n’ogologo, obosara ya dịkwa kubit iri abụọ na ise. 22  Windo ya niile na ihe owuwu ụzọ mbata ya na nkwụ ndị a tụrụ na ya+ hà ka ndị ahụ dị n’ọnụ ụzọ ámá nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ndị mmadụ na-esi n’ihe nrịgo nwere nzọụkwụ asaa abanye na ya, ihe owuwu ụzọ mbata ya dịkwa ha n’ihu. 23  Ọnụ ụzọ ámá nke ogige dị n’ime chere ihu n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ebe ugwu; otu dịkwa n’ebe ọwụwa anyanwụ. O wee tụta otu narị kubit malite n’otu ọnụ ụzọ ámá ruo n’ọnụ ụzọ ámá ọzọ. 24  O wee kpọta m n’ebe ndịda, ma, lee! e nwere otu ọnụ ụzọ ámá chere ihu n’ebe ndịda.+ O wee tụọ ogidi ndị dị n’akụkụ ya nakwa ihe owuwu ụzọ mbata ya: ha na ndị nke ọzọ wee hara. 25  Ya na ihe owuwu ụzọ mbata ya nwere windo gbaa gburugburu, dị ka windo ndị a. Ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri abụọ na ise. 26  Ebe e si arịgo ya nwere nzọụkwụ asaa,+ ihe owuwu ụzọ mbata ya dịkwa n’ihu ha. A tụkwara nkwụ n’ogidi ndị dị ya n’akụkụ, otu n’otu akụkụ, otu n’akụkụ nke ọzọ. 27  Ogige nke dị n’ime nwere otu ọnụ ụzọ ámá n’ebe ndịda. O wee tụta otu narị kubit malite n’otu ọnụ ụzọ ámá ruo n’ọnụ ụzọ ámá ọzọ n’ebe ndịda. 28  O wee si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ndịda kpọbata m n’ogige dị n’ime. O wee tụọ ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ndịda, ha na ndị nke ọzọ wee hara. 29  Ụlọ ndị nche ya na ogidi ndị dị ya n’akụkụ nakwa ihe owuwu ụzọ mbata ya hà ka ndị nke ọzọ. Ya na ihe owuwu ụzọ mbata ya nwere windo gbaa gburugburu. Ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri abụọ na ise.+ 30  Ihe owuwu ụzọ mbata dị gburugburu ya; ogologo ya dị kubit iri abụọ na ise, obosara ya adịrị kubit ise. 31  Ihe owuwu ụzọ mbata ya chere ihu n’ogige dị ná mpụta, a tụkwara nkwụ n’ogidi ndị dị n’akụkụ ya,+ ebe e si agbago ya nwere nzọụkwụ asatọ.+ 32  O wee si n’ụzọ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ kpọbata m n’ogige dị n’ime. O wee tụọ ọnụ ụzọ ámá ahụ, ya na ndị nke ọzọ wee hara. 33  Ụlọ ndị nche ya na ogidi ndị dị n’akụkụ ya na ihe owuwu ụzọ mbata ya hà ka ndị nke ọzọ. Ya na ihe owuwu ụzọ mbata ya nwere windo gbaa gburugburu. Ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri abụọ na ise. 34  Ihe owuwu ụzọ mbata ya chere ihu n’ogige dị ná mpụta, a tụkwara nkwụ n’ogidi ndị dị n’akụkụ ya n’otu akụkụ nakwa n’akụkụ nke ọzọ. Ebe e si agbago ya nwere nzọụkwụ asatọ. 35  O wee kpọbata m n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ebe ugwu,+ o wee tụọ ya, ya na ndị nke ọzọ wee hara,+ 36  ya bụ, ụlọ ndị nche ya, ogidi ndị dị n’akụkụ ya na ihe owuwu ụzọ mbata ya. O nwekwara windo gburugburu ya. Ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri abụọ na ise. 37  Ogidi ndị dị n’akụkụ ya chere ihu n’ogige dị ná mpụta, a tụkwara nkwụ n’ogidi ndị ahụ dị n’akụkụ ya, n’otu akụkụ nakwa n’akụkụ nke ọzọ.+ Ebe e si agbago ya nwere nzọụkwụ asatọ. 38  Ụlọ iri ihe na ọnụ ụzọ ya dị n’akụkụ ogidi ndị dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá ya. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ha na-asa onyinye a na-esurecha n’ọkụ.+ 39  N’ime ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá, e nwere tebụl abụọ n’otu akụkụ nakwa tebụl abụọ n’akụkụ nke ọzọ. N’elu ha ka a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esurecha n’ọkụ+ na àjà mmehie+ na àjà ikpe ọmụma.+ 40  Tebụl abụọ dị n’ebe mpụta ya, ma a gbagowe ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ebe ugwu. Tebụl abụọ dịkwa n’akụkụ nke ọzọ bụ́ ebe e wuru ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá ahụ. 41  Tebụl anọ dị n’otu akụkụ, tebụl anọ adịrịkwa n’akụkụ nke ọzọ n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá—tebụl asatọ. N’elu ha ka a na-egbu anụ. 42  E ji nkume a wara awa rụọ tebụl anọ ahụ a rụrụ maka àjà a na-esurecha n’ọkụ. Ọ dị otu kubit na ọkara n’ogologo, dịkwa otu kubit na ọkara n’obosara. Ịdị elu ya dị otu kubit. N’elu ha ka ha na-atụkwasị ihe ndị e ji egbu anụ e ji achụ àjà a na-esurecha n’ọkụ na àjà nkịtị. 43  Ebe ndị a na-adọkwasị ihe hà ka uhiè ọbụ aka, a kụnyesikwara ha ike n’ime gbaa gburugburu; ọ bụkwa n’elu tebụl ndị ahụ ka a na-edebe anụ e ji nye onyinye inweta ihu ọma.+ 44  E nwekwara ụlọ ndị na-abụ abụ na-anọ eri ihe+ ná mpụga ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ime, n’ogige dị n’ime, nke dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ebe ugwu. Ha chere ihu n’ebe ndịda. Otu dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá nke ebe ọwụwa anyanwụ. O chere ihu n’ebe ugwu. 45  O wee sị m: “Nke a, ya bụ, ụlọ iri ihe a nke chere ihu n’ebe ndịda, bụ maka ndị nchụàjà ndị na-arụ ọrụ a na-arụ n’ụlọ a.+ 46  Ụlọ iri ihe nke chere ihu n’ebe ugwu bụ maka ndị nchụàjà bụ́ ndị na-arụ ọrụ a na-arụ n’ebe ịchụàjà.+ Ha bụ ụmụ Zedọk,+ ndị si n’agbụrụ Livaị, ndị na-abịaru Jehova nso ijere ya ozi.”+ 47  O wee tụọ ogige dị n’ime. Ogologo ya dị otu narị kubit, obosara ya adịrị otu narị kubit, akụkụ anọ ya hà nhata. Ebe ịchụàjà dịkwa n’ihu ụlọ ahụ. 48  O wee kpọbata m n’ime ihe owuwu ụzọ mbata nke ụlọ ahụ.+ O wee tụọ ogidi dị n’akụkụ ihe owuwu ụzọ mbata ahụ, tụta kubit ise n’otu akụkụ nakwa kubit ise n’akụkụ nke ọzọ. Obosara ọnụ ụzọ ámá ahụ dị kubit atọ n’otu akụkụ, dịkwa kubit atọ n’akụkụ nke ọzọ. 49  Ogologo ihe owuwu ụzọ mbata ahụ dị kubit iri abụọ, obosara ya adịrị kubit iri na otu. A na-esikwa n’ihe nrịgo arịgo na ya. E nwekwara ogidi ndị dị n’akụkụ idé ndị ahụ dị n’akụkụ ya, otu n’otu akụkụ, otu n’akụkụ nke ọzọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji