Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 4:1-17

4  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, buru brik, busakwa ya n’ihu gị ma see obodo Jeruselem n’elu ya.+  Nọchibido ya+ ma wuo mgbidi nnọchibido gburugburu ya,+ maa ékpè gburugburu ya,+ maakwa ụlọikwuu gburugburu ya, busakwa ihe e ji akwatu mgbidi gburugburu ya.+  Ma gị onwe gị, were ite ígwè e ji eghe ihe, debekwa ya ka ọ bụrụ mgbidi ígwè n’agbata gị na obodo ahụ, cheekwa ya ihu, ọ ga-abụkwa ebe a nọchibidoro anọchibido, ị ga-anọchibidokwa ya. Ọ bụụrụ ụlọ Izrel ihe ịrịba ama.+  “Ma gị onwe gị, jiri akụkụ aka ekpe gị dinara ala, debekwa njehie ụlọ Izrel n’elu ya.+ Ị ga-eburu mmehie ha n’ụbọchị niile ị ga-edina otú ahụ.  Mụ onwe m ga-enye gị afọ niile nke njehie ha+ ka ọ bụrụ narị ụbọchị atọ na iri itoolu,+ ị ga-eburukwa njehie ụlọ Izrel.  Ị ga-anọzu ha. “Jirikwa akụkụ aka nri gị dinaa na nke abụọ, ị ga-eburukwa njehie ụlọ Juda ruo ụbọchị iri anọ.+ Ọ bụ otu ụbọchị maka otu afọ, otu ụbọchị maka otu afọ, ka m nyere gị.+  Chee ihu ná nnọchibido ị nọchibidoro Jeruselem,+ mee ka a hụ ogwe aka gị, buokwa amụma ihe a ga-eme ya.  “Ma, lee! m ga-eke gị ụdọ+ ka ị ghara ịtụgharị si n’otu akụkụ gị gaa n’akụkụ gị nke ọzọ, ruo mgbe ụbọchị ị ga-anọchibido ya zuru.  “Ma gị onwe gị, were ọka wit+ na ọka bali na akịdị+ na lentil+ na ọka milet na ọka spelt,+ tinye ha n’otu ite, werekwa ha mee achịcha ị ga-eri, maka ụbọchị ole ị ga-edina n’otu akụkụ gị; narị ụbọchị atọ na iri itoolu ka ị ga-eri ya.+ 10  A ga na-atụ̀ nri ị ga-eri atụ̀. Ọ bụ shekel iri abụọ ka ị ga-eri n’otu ụbọchị.+ Ị ga na-eri ya site n’oge ruo n’oge. 11  “A ga na-atụ̀ mmiri ị ga-aṅụ atụ̀, otu ụzọ n’ụzọ isii nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin. Ị ga-aṅụ mmiri site n’oge ruo n’oge. 12  “Ị ga-erikwa ya dị ka achịcha ọka bali;+ ị ga-eghekwa ya n’elu ọkpụrụkpụ nsị+ mmadụ n’ihu ha.” 13  Jehova wee sị: “Otú a ka ụmụ Izrel ga-esi rie achịcha ha na-adịghị ọcha+ n’etiti mba niile m ga-achụsasị ha.”+ 14  M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee! E merụghị mkpụrụ obi m emerụ;+ eritụbeghị m anụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ anụ a dọgburu adọgbu malite n’oge m bụ nwata,+ ọbụna ruo ugbu a, anụ rụrụ arụ abatụbeghị m n’ọnụ.”+ 15  O wee sị m: “Lee, enyewo m gị nsị ehi kama inye gị ọkpụrụkpụ nsị mmadụ, ị ga-eghe achịcha gị n’elu ya.” 16  O wee gaa n’ihu ịsị m: “Nwa nke mmadụ, lee, m ga-agbajisị mkpara e ji ekonye achịcha+ na Jeruselem, ha ga-anọ ná nchegbu mgbe ha na-eri achịcha a tụrụ atụ̀,+ ha ga-anọkwa n’egwu mgbe ha na-aṅụ mmiri a tụrụ atụ̀,+ 17  ka ha wee nọrọ n’ụkọ achịcha na mmiri, na-elekwa ibe ha anya n’ijuanya, taakwa ahụ́ n’ihi njehie ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji