Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 39:1-29

39  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, buo amụma ihe a ga-eme Gọg,+ sị ya, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m na-emegide gị, Gọg, gị onyeisi Mishek+ na Tubal.+  M ga-eme ka ị tụgharịa, duru gị na-aga,+ mee ka i si n’ime ime ebe ugwu+ pụta, meekwa ka ị gbagote n’ugwu ndị dị n’Izrel.  M ga-akụpụ ụta i ji n’aka ekpe gị, meekwa ka akụ́ i ji n’aka nri gị dapụ.  N’ugwu ndị dị n’Izrel ka ị ga-ada,+ gị na ìgwè ndị agha gị niile na ndị ga-eso gị. M ga-ewere gị nye nnụnụ na-eri anụ, ụdị nnụnụ ọ bụla, na anụ ọhịa ka ị bụrụ nri ha.”+  “‘N’elu ala ka ị ga-ada,+ n’ihi na mụ onwe m ekwuwo ya,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.  “‘M ga-awụkwasị ọkụ n’ahụ́ Megọg+ nakwa n’ahụ́ ndị bi n’agwaetiti n’obi iru ala;+ ndị mmadụ ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.  M ga-emekwa ka a mara aha nsọ m n’etiti ndị m Izrel, m gakwaghị ekwe ka e metọọ aha nsọ m;+ mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,+ Onye Nsọ n’Izrel.’+  “‘Lee! Ọ ga-abịarịrị, a ga-emezukwa ya,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. ‘Nke a bụ ụbọchị m kwuru banyere ya.+  Ndị bi n’obodo niile nke Izrel ga-aga suo ihe agha na ọta nta na ọta ukwu ọkụ, were ha mere nkụ,—ha na ụta na akụ́ na okpiri nwere isi ígwè na ube; ha ga-eji ha mere nkụ+ ruo afọ asaa. 10  Ha agaghị aga n’ọhịa buru osisi, ha agaghịkwa akpa nkụ ọ bụla n’ọhịa, n’ihi na ha ga-eji ihe agha ha mere nkụ.’ “‘Ha ga-akwakọrọ ngwongwo nke ndị na-akwakọrọ ihe ha,+ bukọrọkwa ngwongwo nke ndị na-ebukọrọ ihe ha,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 11  “‘Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na m ga-enye Gọg+ otu ebe n’ebe ahụ, ya bụ, ebe ili ozu n’Izrel, bụ́ ndagwurugwu nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke oké osimiri, bụ́ ebe ndị na-agafe agafe si agafe. Ọ ga na-akwụsị ndị na-agafe agafe. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli Gọg na ìgwè ndị agha ya niile. A ga-akpọkwa ya Ndagwurugwu nke Ìgwè Ndị Agha Gọg.+ 12  Ndị ụlọ Izrel ga-eli ha iji mee ka ala ha dị ọcha, ruo ọnwa asaa.+ 13  Ndị ala ahụ niile ga-eli ha, ọ ga-abụkwa ihe ha ga-eji dee ude n’ụbọchị m ga-enye onwe m otuto,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 14  “‘A ga-enwekwa ndị ga na-arụ ọrụ oge niile bụ́ ndị ha ga-eke ụzọ abụọ. Ndị a ga na-agagharị n’ala ahụ, ha na ndị na-agafe agafe, na-eli ozu ndị fọdụrụ n’elu ala, iji mee ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-achọgharị ozu ndị a ọnwa asaa. 15  Ndị ahụ na-agagharị agagharị ga-agagharị n’ala ahụ dum, ọ bụrụkwa na mmadụ ahụ ọkpụkpụ mmadụ, ọ ga-edebe ihe a ga-eji hụwa ebe ahụ ama, ruo mgbe ndị na-eli ozu liri ya na Ndagwurugwu nke Ìgwè Ndị Agha Gọg.+ 16  Aha obodo ahụ ga-abụ Hamona. Ha ga-emekwa ka ala ahụ dị ọcha.’+ 17  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Gwa ụdị nnụnụ niile na anụ ọhịa niile,+ sị: “Zukọtanụ bịa. Zukọtanụ gburugburu àjà m chụrụ, nke m chụụrụ unu, nnukwu àjà m chụrụ n’elu ugwu ndị dị n’Izrel.+ Unu ga-eri anụ, ṅụọkwa ọbara.+ 18  Unu ga-eri anụ ndị dike,+ ṅụọkwa ọbara ndị isi nke ụwa, ebule, nwa ebule,+ mkpi, ụmụ oké ehi,+ anụ mara abụba nke Beshan, ha niile.+ 19  Unu ga-eriju abụba afọ,+ ṅụbigakwa ọbara ókè, n’àjà m ga-achụrụ unu.”’ 20  “‘Na tebụl mụ ka unu ga-eriju anụ ịnyịnya na ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya, ndị dike na ụdị ndị agha dị iche iche, afọ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ 21  “‘M ga-eme ka a hụ ebube m n’etiti mba dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa otú m si mee ihe e kpere n’ikpe,+ hụkwa aka m biri ha.+ 22  Ndị ụlọ Izrel ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova Chineke ha malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.+ 23  Mba dị iche iche ga-amarakwa na ọ bụ n’ihi njehie ha ka ha ji bụrụ ndị a dọọrọ n’agha, ya bụ, ụlọ Izrel,+ n’ihi na ha mesoro m omume ekwesịghị ntụkwasị obi, m wee wepụ ihu m n’ebe ha nọ,+ nyefeekwa ha n’aka ndị iro ha, e wee jiri mma agha na-egbu ha niile.+ 24  M mere ha dị ka adịghị ọcha ha na mmebi iwu ha si dị,+ m wee na-ewepụ ihu m n’ebe ha nọ.’ 25  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ugbu a ka m ga-akpọghachite ndị Jekọb+ a dọọrọ n’agha, meekwara ụlọ Izrel dum ebere.+ M ga-ekworo aha nsọ m ekworo.+ 26  Ha ga-eburuworị ihere+ ha na omume ekwesịghị ntụkwasị obi dum ha mesoro m,+ mgbe ha ga-ebi n’ala ha n’obi iru ala,+ ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.+ 27  Mgbe m ga-esi n’etiti ndị dị iche iche kpọlata ha, sikwa n’ala ndị iro ha kpọkọta ha,+ m ga-edokwa onwe m nsọ n’etiti ha n’ihu ọtụtụ mba.’+ 28  “‘Ha ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova Chineke ha, mgbe m mere ka a dọrọ ha n’agha laa ná mba dị iche iche, kpọkọtakwa ha n’ala ha,+ ka m wee ghara ikwe ka otu n’ime ha fọdụ n’ebe ahụ ọzọ.+ 29  Agaghị m ewepụ ihu m ọzọ n’ebe ha nọ,+ n’ihi na m ga-awụkwasị ụlọ Izrel mmụọ m,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji