Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 37:1-28

37  Aka Jehova dịkwasịrị m,+ o wee jiri mmụọ Jehova kpọrọ m+ kpọsa n’etiti ndagwurugwu* nke ọkpụkpụ juru.+  O wee mee ka m gagharịa n’etiti ha, ma, lee! ha dị nnọọ ọtụtụ na ndagwurugwu ahụ, lee! ha kpọrọ nkụ nke ukwuu.+  O wee malite ịsị m: “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a hà pụrụ ịdị ndụ ọzọ?” M wee sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ọ bụ gị onwe gị ma.”+  O wee sị m: “Buo amụma banyere ọkpụkpụ ndị a, sị ha, ‘Unu ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nụrụnụ okwu Jehova:  “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ọkpụkpụ ndị a: “Lee, m ga-eme ka ume ndụ baa n’ime unu, unu ga-adịkwa ndụ ọzọ.+  M ga-eme ka unu nwee akwara, meekwa ka unu nwee anụ ahụ́, m ga-eji akpụkpọ ahụ́ kpuchie unu, meekwa ka ume ndụ baa n’ime unu, unu ga-adịkwa ndụ ọzọ;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.”’”+  M wee buo amụma dị ka e nyere m n’iwu.+ Ozugbo m busịrị amụma, m malitere ịnụ ụda, lee, mkpọtụ mere, ọkpụkpụ ndị ahụ wee na-abịaru ibe ha nso, ọkpụkpụ ana-agakwuru ọkpụkpụ nke ya.  M wee hụ, ma, lee! akwara na anụ ahụ́ dịkwasịrị ha, akpụkpọ ahụ́ wee kpuchie ha. Ma ọ dịghị ume ndụ dị n’ime ha.  O wee sị m: “Buoro ifufe amụma. Buo amụma, gị nwa nke mmadụ, sị ifufe, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Gị ifufe, si n’ifufe anọ bịa fekwasị ndị a e gburu egbu+ ka ha dị ndụ ọzọ.”’”+ 10  M wee buo amụma dị nnọọ ka o nyere m n’iwu. Ume ndụ wee malite ịbanye n’ime ha, ha wee dịrị ndụ, jirikwa ụkwụ ha guzoro,+ bụrụ ụsụụ ndị agha dị nnọọ ukwuu. 11  O wee sị m: “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a bụ ụlọ Izrel dum.+ Lee, ha na-asị, ‘Ọkpụkpụ anyị akpọọla nkụ, anyị enwekwaghị olileanya.+ E kewapụwo anyị iche kpamkpam.’ 12  Ya mere, buo amụma, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-emeghe ili unu.+ M ga-akpọpụtakwa unu n’ili unu, unu ndị m, wee kpọbata unu n’ala Izrel.+ 13  Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m meghere ili unu nakwa mgbe m kpọpụtara unu n’ili unu, unu ndị m.”’+ 14  M ga-etinye mmụọ m n’ime unu, unu ga-adịkwa ndụ ọzọ,+ m ga-emekwa ka unu biri n’ala unu; unu ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya, meekwa ya,’ ka Jehova kwuru.”+ 15  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 16  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, were osisi,+ deekwa n’elu ya, ‘Nke Juda na ụmụ Izrel bụ́ ndị òtù ya.’+ Werekwa osisi ọzọ, dee n’elu ya, ‘Nke Josef, ya bụ, osisi Ifrem,+ na ụlọ Izrel dum bụ́ ndị òtù ya.’+ 17  Jikọtakwa ha abụọ ka ha ghọọrọ gị otu osisi, ha ga-aghọkwa otu n’aka gị.+ 18  Mgbe ụmụ ndị gị ga-amalite ịsị gị, ‘Ọ̀ bụ na ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtaara gị?’+ 19  sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-ewere osisi Josef, nke dị n’aka Ifrem, nakwa ebo niile nke Izrel bụ́ ndị òtù ya, m ga-atụkwasịkwa ha n’elu ya, ya bụ, n’osisi Juda, m ga-emekwa ka ha ghọọ otu osisi,+ ha ga-aghọkwa otu n’aka m.”’ 20  Ị ga-eji osisi ndị ahụ i dere ihe n’elu ha nọrọ n’ihu ha.+ 21  “Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-akpọpụta ụmụ Izrel n’etiti mba dị iche iche ha gara. M ga-esikwa ebe niile kpọkọta ha wee kpọlata ha n’ala ha.+ 22  M ga-emekwa ka ha bụrụ otu mba n’ala a,+ n’ugwu ndị dị n’Izrel, ọ bụkwa otu eze ka ha niile ga-enwe,+ ha agakwaghị abụ mba abụọ, a gakwaghị ekewa ha ka ha bụrụ alaeze abụọ.+ 23  Ha agakwaghị eji arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị na ihe arụ ha nakwa njehie ha niile merụọ onwe ha;+ m ga-azọpụtakwa ha n’ebe obibi ha niile bụ́ ebe ha nọ mee mmehie, m ga-emekwa ka ha dị ọcha,+ ha ga-abụkwa ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.+ 24  “‘“Ohu m Devid ga-abụ eze ha,+ ha niile ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.+ Ha ga-ejekwa ije ná mkpebi ikpe m,+ ha ga-edebekwa ụkpụrụ m,+ ha ga-emekwa ya.+ 25  Ha ga-ebikwa n’ala m nyere ohu m, ala m nyere Jekọb, bụ́ ebe nna nna unu hà biri,+ ha ga-ebikwa na ya,+ ha na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha ruo mgbe ebighị ebi.+ Ohu m Devid ga-abụkwa onyeisi ha ruo mgbe ebighị ebi.+ 26  “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo;+ ọgbụgba ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi ka mụ na ha ga-agba.+ M ga-enyekwa ha ala ha ma mee ka ha mụbaa,+ debekwa ebe nsọ m n’etiti ha ruo mgbe ebighị ebi.+ 27  Ụlọikwuu m ga-ekpuchikwa ha,+ m ga-abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.+ 28  Mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova,+ na-edo Izrel nsọ mgbe ebe nsọ m ga-adị n’etiti ha ruo mgbe ebighị ebi.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezi 37:1*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”