Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 36:1-38

36  Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, buo amụma banyere ugwu niile dị n’Izrel, sị, ‘Ugwu niile dị n’Izrel,+ nụrụnụ okwu Jehova.  Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “N’ihi na onye iro ekwuola banyere unu, sị,+ ‘Ntọọ! Ọbụna ebe niile dị elu nke oge ochie+ aghọwo nke anyị!’”’+  “Ya mere, buo amụma, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “N’ezie, ebe ọ bụ na e mewo ka unu tọgbọrọ n’efu,+ e sikwa n’akụkụ niile nwụde unu,+ ka unu wee bụrụ ihe onwunwe nke ndị fọdụrụ ná mba dị iche iche,+ e jikwa ọnụ na-eme unu ihe,+ a na-akọkwa akụkọ ọjọọ banyere unu n’etiti ndị mmadụ,+  ya mere, ugwu niile dị n’Izrel,+ nụrụnụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru! Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ugwu ukwu na ugwu nta, ọwa mmiri na ndagwurugwu na ebe ndị a lara n’iyi bụ́ ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu+ na obodo niile a gbahapụrụ agbahapụ, ndị a kwakọọrọ ihe dị na ha, meekwa ka ha bụrụ ihe ndị fọdụrụ ná mba dị iche iche gbara ha gburugburu na-akwa emo;+  ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘N’ezie, m ga-eji ekworo m dị ọkụ kwuo okwu+ megide ndị fọdụrụ ná mba dị iche iche, megidekwa Idọm dum,+ ndị ji oké ọṅụ weghara ala m ka ọ bụrụzie nke ha,+ ndị na-akwa emo n’ime mkpụrụ obi ha,+ n’ihi ala ịta ahịhịa ya nakwa iji kwakọrọ ihe dị na ya.’”’+  “Ya mere, buo amụma banyere ala Izrel, gwa ugwu ukwu na ugwu nta na ọwa mmiri na ndagwurugwu, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee! Mụ onwe m ga-eji ekworo m na ọnụma m kwuo okwu, n’ihi na mba dị iche iche emenyewo unu ihere.”’+  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Mụ onwe m eweliwo aka m ṅụọ iyi+ na ihere ga-eme mba ndị gbara unu gburugburu.+  Ma unu onwe unu, ugwu niile dị n’Izrel, ga-awa alaka, mịakwa mkpụrụ maka ndị m bụ́ Izrel,+ n’ihi na oge ha ga-alọta adịwo nso.+  N’ihi na, lee, m nọnyeere unu, m ga-echekwa ihu n’ebe unu nọ,+ a ga-akọ unu, ghaakwa mkpụrụ n’elu unu.+ 10  M ga-emekwa ka mmadụ dị ọtụtụ n’elu unu, ụlọ Izrel dum, ha niile,+ obodo ahụ niile ga-abụkwa ebe mmadụ bi,+ a ga-ewughachikwa ebe ndị ahụ a lara n’iyi.+ 11  Ee, m ga-emekwa ka mmadụ na anụmanụ dị ọtụtụ n’elu unu,+ ha ga-aba ụba, mụọkwa ọmụmụ, m ga-emekwa ka e biri n’elu unu dị ka n’oge mbụ,+ m ga-emekwara unu ihe ọma karịrị nke m meere unu n’oge mbụ;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.+ 12  M ga-eme ka ndị mmadụ, ya bụ, ndị m Izrel, jee ije n’elu unu, unu ga-abụ nke ha,+ unu ga-abụkwa ihe nketa ha,+ unu agaghị agbawakwa ha aka+ ụmụ ọzọ.’” 13  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na e nwere ndị na-asị unu: “Unu bụ ndị na-eri mmadụ, unu aghọwokwa ala na-agbawa mba nwe ya aka ụmụ,”’+ 14  ‘ya mere, unu agakwaghị eri mmadụ,+ unu agakwaghị agbawa mba nwe unu aka ụmụ,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 15  ‘M ga-eme ka a ghara ịnụkwa okwu na-emenye ihere nke mba dị iche iche na-ekwu banyere unu,+ ndị mmadụ agakwaghị akọcha unu ọzọ,+ unu agakwaghị eme ka mba nwe unu sụọ ngọngọ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.” 16  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 17  “Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel biiri n’ala ha, ha wee jiri ụzọ ha na omume ha na-emetọ ya.+ N’ihu m, ụzọ ha dị ka adịghị ọcha nke oge ịhụ nsọ nwaanyị.+ 18  M wee wụkwasị ha ọnụma m n’ihi ọbara ha wụfuru n’ala ha,+ bụ́ ala ha ji arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị metọọ.+ 19  M wee chụsasịa ha ná mba dị iche iche. Ha wee gbasasịa n’ala dị iche iche.+ M kpere ha ikpe dị ka ụzọ ha na omume ha si dị.+ 20  Ha wee bata ná mba dị iche iche ha batara. Ndị mmadụ wee na-emetọ aha nsọ m+ mgbe ha na-ekwu banyere ha, sị, ‘Ndị a bụ ndị Jehova, ọ bụkwa n’ala ya ka ha si pụta.’+ 21  M ga-enwekwara aha nsọ m ọmịiko, ya bụ, aha nsọ m nke ụlọ Izrel metọrọ n’etiti mba dị iche iche ha batara.”+ 22  “Ya mere, sị ụlọ Izrel, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ụlọ Izrel, ọ bụghị n’ihi unu ka m ga-eme ya, kama ọ bụ n’ihi aha nsọ m nke unu metọrọ n’etiti mba dị iche iche unu batara.”’+ 23  ‘M ga-edokwa aha ukwu m nsọ,+ nke a nọ na-emetọ n’etiti mba dị iche iche, nke unu metọrọ n’etiti ha; mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘mgbe e doro m nsọ n’etiti unu n’ihu ha.+ 24  M ga-esi n’etiti mba ndị ahụ kpọpụta unu, sikwa n’ala niile kpọkọta unu, kpọlata unu n’ala unu.+ 25  M ga-efesa unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha.+ M ga-asachapụ+ unu adịghị ọcha unu niile, sachapụkwa unu arụsị unu niile ndị na-asọ oyi ka nsị.+ 26  M ga-enyekwa unu obi ọhụrụ,+ tinyekwa mmụọ ọhụrụ n’ime unu,+ m ga-ewepụkwa obi nkume n’ahụ́ unu ma nye unu obi anụ ahụ́.+ 27  M ga-etinye mmụọ m n’ime unu,+ m ga-emekwa ihe ka unu wee jee ije n’ụkpụrụ m,+ unu ga-emekwa ihe m kpere n’ikpe ma debe ya.+ 28  Unu ga-ebi n’ala ahụ m nyere nna nna unu hà,+ unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke unu.’+ 29  “‘M ga-azọpụta unu n’adịghị ọcha unu niile,+ kpọọ nri òkù, meekwa ka o hie nne. Agaghị m eme ka ụnwụ bịakwasị unu.+ 30  M ga-eme ka mkpụrụ osisi hie nne, meekwa ka ihe ala mepụtara dị ọtụtụ, ka unu wee ghara ịnata nkọcha ọzọ n’etiti mba dị iche iche n’ihi ụnwụ.+ 31  Unu aghaghị icheta ụzọ ọjọọ unu na omume unu na-adịghị mma.+ Unu aghaghịkwa ịkpọ onwe unu asị n’ihi njehie unu nakwa n’ihi ihe arụ unu.+ 32  Ọ bụghị n’ihi unu ka m ga-eme ihe a,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘maranụ nke a. Ihere mee unu, nweekwanụ mmechuihu n’ihi ụzọ unu, unu ụlọ Izrel.’+ 33  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘N’ụbọchị m ga-asachapụ njehie unu niile ka m ga-emekwa ka e biri n’obodo unu niile.+ A ga-ewughachikwa ebe ndị ahụ a lara n’iyi.+ 34  A ga-akọkwa ihe n’ala nke tọgbọrọ n’efu, ọ bụ ezie na ọ ghọrọ ihe tọgbọrọ n’efu n’ihu onye ọ bụla nke na-agafe na ya.+ 35  Ndị mmadụ ga-asịkwa: “Ala ahụ dị ebe ahụ nke bụbu ebe tọgbọrọ n’efu adịla ka ogige Iden,+ obodo ndị ahụ bụbu mkpọmkpọ ebe, ndị e mekwara ka ha tọgbọrọ n’efu, ndị e tidakwara etida, abụrụwo ebe e wusiri ike; e biriwo na ha.”+ 36  Mba ndị ga-afọdụ gburugburu unu ga-amara na mụ onwe m, Jehova, ewughachiwo ihe e tidara etida,+ akụwo m ihe n’ala ahụ e mere ka ọ tọgbọrọ n’efu. Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya, emewokwa m ya.’+ 37  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Nke a bụ ihe m ka ga-eme ka ụlọ Izrel rịọ m ka m meere ha:+ M ga-eme ka ha dị ọtụtụ dị ka ìgwè ewu na atụrụ.+ 38  Dị ka ìgwè ndị dị nsọ, dị ka ìgwè ewu na atụrụ nke Jeruselem n’oge ememme ya,+ otú ahụ ka obodo ndị bụbu mkpọmkpọ ebe ga-ejupụta n’ìgwè mmadụ;+ ndị mmadụ ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji