Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 35:1-15

35  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, chee ihu+ n’ógbè Sia+ bụ́ ugwu ugwu, buokwa amụma ihe a ga-eme ya.+  Sị ya, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m na-emegide gị, gị ógbè Sia+ bụ́ ugwu ugwu, m ga-esetị aka m mee gị ihe,+ meekwa ka ị bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu, ee, ebe tọgbọrọ nkịtị.+  M ga-emekwa ka obodo gị niile bụrụ ebe a lara n’iyi,+ gị onwe gị ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu; ị ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,+  n’ihi na ị na-ebu iro nke na-adịru mgbe a na-akaghị aka,+ ị nọkwa na-enyefe ụmụ Izrel n’aka mma agha,+ n’oge ọdachi dakwasịrị ha,+ n’oge njehie ikpeazụ ha.”’+  “‘Ya mere, dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘ebe ọ bụ na m nọ na-akwadebe gị ka a wụfuo ọbara gị, ọbara ga-achụ gị ọsọ.+ N’ezie, ọ bụ ọbara ka ị kpọrọ asị, ọ bụ ọbara ga-achụ gị ọsọ.+  M ga-emekwa ka ógbè Sia bụ́ ugwu ugwu bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu, ee, ebe tọgbọrọ nkịtị.+ M ga-ebipụkwa onye na-agafe n’ime ya na onye na-alọghachi n’ime ya.+  M ga-eme ka ndị ya e gburu egbu jupụta n’ugwu ukwu ya; ndị e ji mma agha gbuo ga-ada n’ugwu nta gị nakwa na ndagwurugwu gị nakwa n’ọwa mmiri gị niile.+  M ga-eme ka ị bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi, a gaghịkwa ebi n’obodo gị;+ unu onwe unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’+ 10  “Ebe ọ bụ na ị sịrị, ‘Mba abụọ ndị a na ala abụọ ndị a—ha ga-abụ nke m, anyị ga-ebichi ala abụọ ndị a,’+ ma Jehova nọ n’ebe ahụ,+ 11  ‘ya mere, dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘m ga-eme ihe dị ka iwe gị na ekworo gị si dị, nke i gosiri n’ihi asị ị kpọrọ ha;+ m ga-emekwa ka ha mara m mgbe m kpere gị ikpe.+ 12  Ị ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova, nụrụ okwu nlelị niile i kwuru banyere ugwu ndị dị n’Izrel,+ sị: “E mewo ka ha tọgbọrọ n’efu. E nyewo anyị ha ka ha ghọọrọ anyị nri.”+ 13  Unu etuwo ọnụ nke ukwuu megide m,+ unu ekwuwokwa ọtụtụ okwu megide m.+ Mụ onwe m anụwo ya.’+ 14  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọ bụ ebe tọgbọrọ n’efu ka m ga-eme ka ị bụrụ n’oge ụwa dum na-aṅụrị ọṅụ. 15  Dị nnọọ ka ị ṅụrịrị ọṅụ maka ihe nketa nke ụlọ Izrel n’ihi na e mere ka ọ tọgbọrọ n’efu, m ga-eme gị otu ihe ahụ.+ Ị ga-abụ ebe tọgbọrọ n’efu, gị ógbè Sia bụ́ ugwu ugwu, ọbụna Idọm dum, ha dum;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji