Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 3:1-27

3  O wee sị m: “Nwa nke mmadụ, rie ihe ị hụrụ. Rie akwụkwọ a a pịakọtara apịakọta,+ gaakwa gwa ụlọ Izrel okwu.”  M wee meghee ọnụ m, o wee mee ka m rie akwụkwọ a a pịakọtara apịakọta.+  O wee gaa n’ihu ịsị m: “Nwa nke mmadụ, rijuo afọ, rijuo akwụkwọ a a pịakọtara apịakọta m na-enye gị afọ.” M wee riwe ya, o wee na-atọ m ụtọ n’ọnụ dị ka mmanụ aṅụ.+  O wee gaa n’ihu ịsị m: “Nwa nke mmadụ, gawa, banye n’etiti ụlọ Izrel,+ gwa ha ihe m kwuru.  N’ihi na ọ bụghị ndị ị na-adịghị aghọta asụsụ ha+ ma ọ bụ ndị asụsụ ha siri ike nghọta+ ka m na-edunye gị ka ị gakwuru, kama ọ bụ ụlọ Izrel,  ọ bụghị ndị dị ọtụtụ, ndị ị na-adịghị aghọta asụsụ ha, ma ọ bụ ndị asụsụ ha siri ike nghọta, bụ́ ndị ị na-agaghị aghọta ihe ha na-ekwu.+ A sị na ọ bụ ha ka m dunyere gị ka ị gakwuru, ha ga-ege gị ntị.+  Ma ụlọ Izrel agaghị achọ ige gị ntị, ebe ọ bụ na ha achọghị ige m ntị;+ n’ihi na ndị ụlọ Izrel niile bụ ndị isi ike na ndị obi kpọrọ nkụ.+  Lee! M mewo ka ihu gị sie ike dị ka ihu ha,+ meekwa ka egedege ihu gị sie ike dị ka egedege ihu ha.+  M mewo ka egedege ihu gị dịrị ka dayamọnd, siekwa ike karịa ọmụ́.+ Atụla ha egwu,+ ụjọ atụkwala gị ma ị hụ ihu ha,+ n’ihi na ha bụ ụlọ na-enupụ isi.”+ 10  O wee gaa n’ihu ịsị m: “Nwa nke mmadụ, tinye okwu m niile nke m ga-agwa gị n’obi+ gị, jirikwa ntị gị nụrụ. 11  Gawa, banye n’etiti ndị ahụ a dọọrọ n’agha,+ n’etiti ụmụ ndị gị, gwakwa ha okwu, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru,’ ma hà ga-anụ ma ha agaghị anụ.”+ 12  Mmụọ wee buru m,+ m wee malite ịnụ olu nke na-eme oké ụzụ n’azụ m,+ sị: “Ka ebube Jehova nke si n’ebe obibi ya bụrụ ihe a gọziri agọzi.”+ 13  Anụkwara m ụda nku nke ihe ndị ahụ dị ndụ bụ́ ndị na-emetụ ibe ha,+ nakwa ụda wiil ndị ahụ dị ha nso,+ nakwa ụda nke ihe na-eme oké ụzụ. 14  Mmụọ ahụ wee buru m,+ ee, o buuru m, m wee jiri obi ilu na iwe gawa, aka Jehova nke dịkwasịrị m dị ike.+ 15  M wee banye n’etiti ndị ahụ a dọtara n’agha nọ na Tel-ebib, bụ́ ndị bi+ n’akụkụ osimiri Kiba,+ m wee biri n’ebe ha bi; m wee bie ebe ahụ ụbọchị asaa. Enwere m ihe ijuanya mgbe m nọ n’etiti ha.+ 16  O wee ruo na mgbe ụbọchị asaa ahụ gwụchara, okwu Jehova ruru m ntị, sị: 17  “Nwa nke mmadụ, ọ bụ onye nche ụlọ Izrel ka m mere gị,+ ị ga-anụkwa okwu n’ọnụ m, ị ga-adọkwa ha aka ná ntị dị ka m gwara gị.+ 18  Mgbe m sịrị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’+ ma ị dọghị ya aka ná ntị, i kwughịkwa okwu iji dọọ onye ajọ omume ahụ aka ná ntị ka ọ hapụ ụzọ ọjọọ ya ka e wee debe ya ndụ,+ ebe ọ bụ na ọ bụ onye ajọ omume, ọ ga-anwụ ná njehie ya,+ ma n’aka gị ka m ga-ajụta ọbara ya.+ 19  Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka ná ntị,+ ma ọ hapụghị ajọ omume ya na ụzọ ọjọọ ya, ya onwe ya ga-anwụ ná njehie ya;+ ma gị onwe gị, ị napụtawo mkpụrụ obi gị.+ 20  Mgbe onye ezi omume hapụrụ ezi omume ya,+ mewe ihe na-ezighị ezi, m wee tinye ihe ịsụ ngọngọ n’ihu ya,+ ya onwe ya ga-anwụ n’ihi na ị dọghị ya aka ná ntị. Ọ ga-anwụ n’ihi mmehie ya,+ a gaghịkwa echeta ezi omume o mere,+ ma, ọ bụ n’aka gị ka m ga-ajụta ọbara ya.+ 21  Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka ná ntị ka onye ezi omume ahụ ghara imehie,+ ya onwe ya aghara imehie, ọ ga-adịrị ndụ n’ihi na ị dọrọ ya aka ná ntị,+ gị onwe gị anapụtawo mkpụrụ obi gị.”+ 22  Aka Jehova wee dịkwasị m n’ebe ahụ, o wee sị m: “Bilie, gaa na ndagwurugwu,*+ m ga-agwa gị okwu n’ebe ahụ.” 23  M wee bilie gaa na ndagwurugwu, ma, lee! ebube Jehova guzo n’ebe ahụ,+ dị ka ebube ahụ m hụrụ n’akụkụ osimiri Kiba,+ m wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.+ 24  Mmụọ nsọ wee bata n’ime m,+ meekwa ka m guzo ọtọ,+ ọ malitere ịgwa m okwu, sị m: “Bịa, mechibido onwe gị ụzọ n’ime ụlọ gị. 25  Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, lee! ha ga-eji ụdọ kee gị agbụ ka ị ghara inwe ike ịpụ banye n’etiti ha.+ 26  M ga-emekwa ka ire gị rapara n’okpo ọnụ gị,+ ị ga-adakwa ogbi,+ ị gaghị abụkwa onye na-adọ ha aka ná ntị,+ n’ihi na ha bụ ụlọ na-enupụ isi.+ 27  M ga-emeghe ọnụ gị mgbe m ga-agwa gị okwu, ị ga-asịkwa ha,+ ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’ Ka onye chọrọ ịnụ nụrụ,+ ka onye na-achọghị ịnụ ghara ịnụ, n’ihi na ha bụ ụlọ na-enupụ isi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezi 3:22*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”