Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 29:1-21

29  N’afọ nke iri, n’ọnwa nke iri, n’abalị iri na abụọ n’ọnwa ahụ, okwu Jehova ruru m ntị, sị:  “Nwa nke mmadụ, chee ihu n’ebe Fero eze Ijipt+ nọ, buokwa amụma ihe a ga-eme ya na Ijipt dum.+  Kwuo okwu, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m na-emegide gị, Fero, eze Ijipt,+ bụ́ nnukwu anụ mmiri+ nke gbatịrị onwe ya n’etiti ọwa mmiri niile nke Naịl ya,+ onye sịrị, ‘Ọ bụ m nwe Osimiri Naịl, ọ bụ m meere ya onwe m.’+  M ga-etinyekwa nko n’agba+ gị ma mee ka azụ̀ ndị dị n’ọwa mmiri niile nke Naịl gị rapara n’akpịrịkpa gị. M ga-esi n’etiti ọwa mmiri niile nke Naịl gị dọpụta gị na azụ̀ niile dị n’ọwa mmiri niile nke Naịl gị ndị rapaara n’akpịrịkpa gị.  M ga-agbahapụ gị n’ala ịkpa, gị na azụ̀ niile dị n’ọwa mmiri niile nke Naịl gị.+ N’elu ala ka ị ga-ada.+ A gaghị achịkọta gị, a gaghịkwa atụtụkọta gị. M ga-ewere gị nyefee anụ ọhịa nke ụwa na anụ ufe nke eluigwe ka ị bụrụ nri ha.+  Ndị niile bi n’Ijipt ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova,+ n’ihi na ha bụụrụ ụlọ Izrel ihe ndabere nke bụ́ ahịhịa amị.+  Mgbe ha jidere gị aka, ị gbajiri,+ ị dọwara ubu ha dum. Mgbe ha dabeere gị n’ahụ́, ị gbajiri,+ i mekwara ka úkwù ha niile maa jijiji.”+  “‘Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-eme ka mma agha bịakwasị gị,+ m ga-esikwa n’etiti gị bipụ mmadụ na anụ ụlọ.+  Ala Ijipt ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu na ebe a lara n’iyi;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova, ebe ọ bụ na ọ sịrị, ‘Ọ bụ m nwe Osimiri Naịl, ọ bụkwa m mere ya.’+ 10  Ya mere, lee, m na-emegide gị, na-emegidekwa ọwa mmiri niile nke Naịl gị,+ m ga-emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe a lara n’iyi, ebe kpọrọ nkụ, ebe tọgbọrọ n’efu,+ malite na Migdọl+ ruo Sayini,+ ruokwa n’ókè ya na Itiopia. 11  Ụkwụ mmadụ agaghị esi na ya gafee,+ ụkwụ anụ ụlọ agaghịkwa esi na ya gafee.+ A gaghị ebi na ya ruo afọ iri anọ.+ 12  M ga-emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu n’etiti obodo ndị a lara n’iyi.+ Ruo afọ iri anọ, obodo ya niile ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu n’etiti obodo ndị a lara n’iyi.+ M ga-achụsasịkwa ndị Ijipt ná mba dị iche iche, meekwa ka ha gbasasịa n’etiti ala dị iche iche.”+ 13  “‘N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Mgbe afọ iri anọ+ gwụchara, m ga-esi n’etiti ndị dị iche iche ebe a chụgara ndị Ijipt kpọkọta ha.+ 14  M ga-akpọghachite ìgwè ndị Ijipt a dọọrọ n’agha; m ga-akpọghachite ha n’ala Patrọs,+ n’ala ha si. Ha ga-aghọ alaeze dị ala n’ebe ahụ. 15  Ọ ga-adị ala karịa alaeze ndị ọzọ, ọ gakwaghị eme onwe ya ka ọ dị elu karịa mba ndị ọzọ,+ m ga-emekwa ka ha dị nnọọ ole na ole nke na mba ndị ọzọ agakwaghị anọ n’okpuru ha.+ 16  Ọ gakwaghị abụ obi ike ụlọ Izrel,+ nke na-eme ka e cheta njehie ha jehiere site n’iso ndị Ijipt.+ Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova.”’” 17  O wee ruo n’afọ nke iri abụọ na asaa, n’ọnwa mbụ, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, na okwu Jehova ruru m ntị, sị: 18  “Nwa nke mmadụ, Nebukadreza,+ bụ́ eze Babịlọn, mere ka ndị agha ya lụso Taya agha dị ukwuu.+ E mere ka isi niile kwọchaa, chihịakwa ubu niile.+ Ma ọ dịghị ụgwọ+ ọ bụla Taya kwụrụ ya na ndị agha ya maka agha o busoro ya. 19  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-enyefe Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn ala Ijipt,+ ọ ga-eburu akụ̀ ya, meekwa ka ọ bụrụ ihe nkwata buru ibu,+ bukọrọkwa ihe dị ukwuu na ya; ọ ga-aghọkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.’ 20  “‘Enyewo m ya ala Ijipt ka ọ bụrụ ụgwọ a kwụrụ ya maka ihe o mere ya, n’ihi na ha rụụrụ m ọrụ,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 21  “N’ụbọchị ahụ, m ga-eme ka otu mpi puoro ụlọ Izrel,+ m ga-emekwa ka i nwee ihe mere ị ga-eji meghee ọnụ n’etiti ha.+ Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji