Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 28:1-26

28  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, gwa onye ndú Taya, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “‘“N’ihi na obi gị afụliwo elu,+ ị na-asị, ‘Abụ m chi.+ Mụ onwe m anọdụwo n’oche chi,+ n’etiti oké osimiri,’+ ma mmadụ ka ị bụ,+ ị bụghị chi,+ ị nọ na-eme ka obi gị dị ka obi chi—  lee! ị maara ihe karịa Daniel.+ E nweghị ihe nzuzo karịrị gị.+  I jiriwo amamihe gị na nghọta gị kpata akụ̀, ị na-ebubatakwa ọlaedo na ọlaọcha n’ụlọ nkwakọba ihe gị.+  I jiriwo amamihe gị dị ukwuu+ na ngwá ahịa i rere+ mee ka akụ̀ gị dị ukwuu,+ obi gị wee dị mpako n’ihi akụ̀ gị.”’+  “‘Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ebe i mere ka obi gị dị ka obi chi,+  n’ihi ya, lee, m ga-akpọtara gị ndị mba ọzọ,+ ndị na-achị mba dị iche iche n’aka ike,+ ha ga-amịpụtakwa mma agha ha ka ha bibie ịma mma nke amamihe gị, merụọkwa ịma mma gị nke na-egbu maramara.+  Ha ga-eme ka ị banye n’olulu,+ ị ga-anwụkwa dị ka onye e gburu n’etiti oké osimiri.+  Ị̀ ga-asịrịrị n’ihu onye na-egbu gị,+ ‘Abụ m chi,’ mgbe ị nọ n’aka ndị na-emerụ gị, ọ bụ ezie na ị bụ mmadụ nkịtị, ị bụghị chi?”’+ 10  “‘Ọnwụ ndị a na-ebighị úgwù ka ị ga-anwụ n’aka ndị mba ọzọ,+ n’ihi na mụ onwe m ekwuwo ya,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.” 11  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 12  “Nwa nke mmadụ, bụọ abụ iru uju banyere eze Taya,+ sị ya, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “‘“Ị bụ onye e ji ama atụ, i jupụtara n’amamihe,+ zuokwa okè n’ịma mma.+ 13  Ọ bụ n’Iden, bụ́ ubi Chineke, ka ị nọrọ.+ Nkume niile dị oké ọnụ ahịa bụ uwe gị, ya bụ, rubi, topaz na jaspa; krisolaịt, ọnịks+ na jed; safaya, tọkwọiz+ na emerad; ebe a kwụnyere nkume ndị a nakwa oghere ndị ha dị na ha bụ ọlaedo. A kwadebere ha n’ụbọchị e kere gị. 14  Ị bụ cherọb e tere mmanụ nke na-ekpuchite ihe, ọ bụ ọrụ m nyere gị. Ọ bụ n’ugwu nsọ Chineke ka ị nọrọ.+ N’etiti nkume na-acha ọkụ ọkụ ka i jegharịrị. 15  I zuru okè n’ụzọ gị malite n’ụbọchị e kere gị+ ruo mgbe a hụrụ ajọ omume n’ime gị.+ 16  “‘“N’ihi ngwá ahịa gị dị ukwuu,+ ha mere ka i jupụta n’ime ihe ike, i wee malite ime mmehie.+ M ga-achụpụ gị n’ugwu Chineke dị ka onye rụrụ arụ, m ga-ebibikwa gị,+ gị cherọb nke na-ekpuchite ihe, ka ị ghara ịnọkwa n’etiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ ọkụ. 17  “‘“Obi gị wee dị mpako n’ihi ịma mma gị.+ I mere ka amamihe gị laa n’iyi n’ihi mma ị mara nke na-egbu maramara.+ M ga-atụda gị n’ala.+ M ga-edebe gị n’ihu ndị eze, ka ha na-ele gị anya.+ 18  “‘“I merụwo ebe nsọ gị, n’ihi ọtụtụ njehie gị,+ n’ihi aghụghọ ị na-aghọ mgbe ị na-ere ngwá ahịa gị.+ M ga-emekwa ka ọkụ si n’etiti gị pụta. Ọ bụ ya ga-erepịa gị.+ M ga-emekwa ka ị bụrụ ntụ n’elu ala n’ihu ndị niile na-ahụ gị.+ 19  Ma ndị niile maara gị n’etiti ndị dị iche iche ga-ekporopụ anya na-ele gị.+ Ihe ụjọ mberede ga-abịakwasị gị, ị gaghị adịkwa ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.”’”+ 20  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 21  “Nwa nke mmadụ, chee ihu na Saịdọn,+ buo amụma ihe a ga-eme ya. 22  Sị ya, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m na-emegide gị,+ Saịdọn, a ga-enyekwa m otuto n’ime gị;+ ndị mmadụ ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m mere ihe e kpere n’ikpe+ n’ime ya, e wee doo m nsọ n’ime ya.+ 23  M ga-ezigakwa ọrịa na-efe efe n’ime ya, zigakwa ọbara n’okporo ámá ya.+ Ndị e gburu egbu ga-ada n’ime ya site ná mma agha a ga-eji na-ebuso ya agha n’akụkụ niile;+ ndị mmadụ ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.+ 24  Ụlọ Izrel agakwaghị enwe ajọ uke+ ma ọ bụ ogwu na-egbu mgbu nke si n’aka ndị niile gbara ha gburugburu, bụ́ ndị na-akwa ha emo; ndị mmadụ ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova.”’ 25  “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Mgbe m ga-akpọkọta ụlọ Izrel site n’etiti ndị dị iche iche bụ́ ebe a chụsasịrị ha,+ a ga-edokwa m nsọ n’etiti ha n’ihu mba dị iche iche.+ Ha ga-anọkwa n’ala ha+ nke m nyere ohu m Jekọb.+ 26  Ha ga-ebikwa na ya n’obi iru ala,+ wuokwa ụlọ+ ma kụọ ubi vaịn,+ ha ga-ebikwa n’obi iru ala+ mgbe m mere ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ ndị niile na-akwa ha emo gburugburu ha;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova Chineke ha.”’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji