Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 25:1-17

25  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, chee ihu n’ebe ụmụ Amọn nọ ma buo amụma ihe a ga-eme ha.+  Kwuokwa banyere ụmụ Amọn, sị, ‘Nụrụnụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ebe ọ bụ na unu asịwo ebe nsọ m Ntọọ! n’ihi na e merụwo ya, sịkwa ala Izrel ntọọ!, n’ihi na e mewo ka ọ tọgbọrọ n’efu, sịkwa ụlọ Juda ntọọ!, n’ihi na a dọrọwo ha n’agha,+  ya mere, lee, m ga-enyefe unu n’aka ndị Ọwụwa Anyanwụ ka unu bụrụ ihe onwunwe ha.+ Ha ga-ewukwa ebe obibi ha a gbara ogige n’ime gị, maakwa ụlọikwuu ha n’ime gị. Ha onwe ha ga-eri mkpụrụ gị, ha onwe ha ga-aṅụkwa mmiri ara ehi gị.+  M ga-emekwa ka Raba+ bụrụ ebe kamel ga na-ata ahịhịa, meekwa ka ala ụmụ Amọn bụrụ ebe ìgwè ewu na atụrụ ga na-ezu ike;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.”’”+  “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na ị kụrụ aka+ ma zọọ ụkwụ n’ala, jirikwa ịkwa emo na-aṅụrị ọṅụ n’ime mkpụrụ obi gị n’ihi ala Izrel,+  ya mere, lee m; esetịwo m aka m ime gị ihe.+ M ga-eme ka ị bụrụ ihe ndị mba ọzọ ga-ebukọrọ; m ga-ebipụ gị n’etiti ndị dị iche iche, bipụkwa gị n’ala niile.+ M ga-ala gị n’iyi,+ ị ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na Moab+ na Sia+ asịwo: “Lee! Ụlọ Juda dị nnọọ ka mba niile ọzọ,”+  ya mere, lee, m ga-emeghe mkpọda ugwu nke obodo Moab niile, bụ́ obodo niile dị nso n’ókè nke ala ya, ihe e ji chọọ ala ahụ mma, bụ́ Bet-jeshimọt,+ Bel-mion,+ ruo ọbụna Kiriateyim,+ 10  ruo n’ala ndị Ọwụwa Anyanwụ,+ tinyere ụmụ Amọn;+ m ga-emekwa ka ọ bụrụ ihe ndị ọzọ ga-eweghara, ka a ghara icheta ya,+ ya bụ, ụmụ Amọn, n’etiti mba dị iche iche. 11  M ga-emekwa ihe e kpere n’ikpe n’ime Moab;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’+ 12  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na Idọm abọwo ọbọ n’ahụ́ ụlọ Juda, ha wee na-eme ha ihe ọjọọ nke ukwuu ma bọọrọ onwe ha ọbọ n’ahụ́ ha,+ 13  ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “M ga-esetịkwa aka m mee Idọm+ ihe, bipụ ma mmadụ ma anụ ụlọ n’ime ya.+ M ga-emekwa ka ọ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu malite na Timan,+ ruo Didan.+ A ga-eji mma agha bibie ha. 14  ‘M ga-abọ ọbọ n’ahụ́ Idọm site n’aka ndị m Izrel;+ ha ga-eme Idọm dị ka iwe m na ọnụma m si dị; ha ga-amarakwa ihe ịbọ ọbọ m bụ,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”’ 15  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na ndị Filistia abọwo ọbọ,+ ha wee jiri ịkwa emo nke dị ná mkpụrụ obi ha na ibu iro nke na-adịru mgbe a na-akaghị aka+ na-abọrọ onwe ha ọbọ, iji weta mbibi.+ 16  Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m na-esetị aka m ime ndị Filistia+ ihe, m ga-ebipụ ndị Keretaịt,+ bibiekwa ndị niile ọzọ bi n’ụsọ oké osimiri.+ 17  M ga-abọ ọbọ dị ukwuu n’ahụ́ ha, baakwara ha oké mba;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m bọrọ ọbọ n’ahụ́ ha.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji