Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 22:1-31

22  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ị̀ ga-ekpe ya ikpe,+ ị̀ ga-ekpe obodo na-awụfu ọbara ikpe,+ meekwa ka ọ mata ihe arụ ya niile?+  Ị ga-asịkwa, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Gị obodo nke na-awụfu ọbara+ n’ime ya ruo mgbe oge ya ruru,+ nke mekwara arụsị niile na-asọ oyi ka nsị n’ime ya ka o wee ghọọ ebe na-adịghị ọcha,+  ọ bụ ọbara ị wụfuru mere e ji maa gị ikpe,+ ọ bụkwa arụsị niile i mere, bụ́ ndị na-asọ oyi ka nsị, mere i ji bụrụ ebe na-adịghị ọcha.+ Ị na-emekwa ka ụbọchị gị dị mkpụmkpụ, ị ga-erukwa n’afọ ndị a ga-ekpe gị ikpe. Ọ bụ ya mere m ga-eji mee ka ị bụrụ ihe mba niile ga na-akọcha, nakwa ihe ala niile ga na-akwa emo.+  Ala ndị dị gị nso na ndị dị gị anya ga-akwa gị emo, gị obodo nke aha ya na-adịghị ọcha, nke jupụtara n’ọgba aghara.+  Lee! Ndị isi+ Izrel nọ n’ime gị, onye nke ọ bụla enyefewo ogwe aka ya iji wụfuo ọbara.+  Ha elelịwo nna na nne nọ n’ime gị.+ Ha erigbuwo onye mbịarambịa nọ n’etiti gị.+ Ha emegbuwo nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ nọ n’ime gị.”’”+  “‘I ledawo ebe nsọ m anya, i merụwokwa ụbọchị izu ike m.+  Ndị o doro anya na ha bụ ndị nkwutọ nọ n’ime gị, ka ha wee wụfuo ọbara;+ ha anọwokwa n’elu ugwu rie nri n’ime gị.+ Ha emewo omume rụrụ arụ n’ime gị.+ 10  Ha ekpughewo ọtọ nna ha n’ime gị;+ nwaanyị na-adịghị ọcha n’ihi ịhụ nsọ ya ka ha wedara ala n’ime gị.+ 11  Nwoke emewo nwunye nwoke ibe ya ihe arụ,+ ọ bụkwa nwunye nwa ya ka nwoke mesoro omume rụrụ arụ;+ ọ bụkwa nwanne ya nwaanyị, nwa nna ya mụrụ, ka nwoke wedara ala n’ime gị.+ 12  Ha eriwo ngarị n’ime gị iji wụfuo ọbara.+ Ị narawokwa ọmụrụ nwa+ na ụma.+ I jikwa ime ihe ike na-enweta uru+ site n’irigbu ndị ibe gị,+ i chefuwokwa m,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 13  “‘Ma, lee! akụwo m aka+ n’ihi uru na-ezighị ezi nke i nwetara,+ n’ihi ọbara ị wụfuru n’ime gị.+ 14  Obi gị ọ̀ ga na-edi ya,+ ka aka gị ọ̀ ga-eme ka ị dị ike n’oge m ga-eme gị ihe?+ Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya, m ga-emekwa ihe.+ 15  M ga-achụsasị gị n’etiti mba dị iche iche, meekwa ka ị gbasasịa n’etiti ala dị iche iche.+ M ga-ewepụkwa adịghị ọcha dị n’ahụ́ gị.+ 16  A ga-emerụ gị onwe gị n’ihu mba dị iche iche, ị ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’”+ 17  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 18  “Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel aghọwo ifurifu ọla n’anya m.+ Ha niile bụ ọla kọpa na gbamgbam na ígwè na opu ndị dị n’ime oké ọkụ. Ha aghọwo ifurifu ọla dị ukwuu, ifurifu ọlaọcha.+ 19  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na unu niile aghọwo ifurifu ọla dị ukwuu,+ n’ihi ya, lee, m na-achịkọta unu n’ime Jeruselem.+ 20  Dị ka a na-achịkọta ọlaọcha na ọla kọpa na ígwè+ na opu na gbamgbam wụba n’ime oké ọkụ, iji fụọ+ ha ọkụ ka ha gbazee,+ otú ahụ ka m ga-esi chịkọta ha n’iwe m nakwa n’ọnụma m, m ga-afụ unu ọkụ wee gbazee unu. 21  M ga-achịkọta unu ma fụọ unu ọkụ nke oké iwe m,+ a ga-agbazekwa unu n’ime ya.+ 22  Dị nnọọ ka a na-agbaze ọlaọcha n’ime ọkụ, otú ahụ ka a ga-agbaze unu n’ime ya; unu ga-amarakwa na ọ bụ m, Jehova, wụkwasịrị unu ọnụma m.’”+ 23  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 24  “Nwa nke mmadụ, sị ya, ‘Ị bụ ala a na-emeghị ka ọ dị ọcha, nke mmiri na-ezokwasịghị n’ụbọchị amamikpe.+ 25  Ndị amụma ya na-agba izu ọjọọ n’ime ya,+ dị nnọọ ka ọdụm nke na-ebigbọ ebigbọ, nke na-adọgbu anụ.+ Ha na-eripịa mkpụrụ obi.+ Ha nọ na-akpakọba akụ̀ na ihe dị oké ọnụ ahịa.+ Ha emewo ka ndị inyom di ha nwụrụ dị ọtụtụ n’ime ya.+ 26  Ndị nchụàjà ya emebiwo iwu m,+ ha nọkwa na-emerụ ebe nsọ m niile.+ Ha akpaghị ókè+ n’ihe dị nsọ na ihe nkịtị,+ ha emeghịkwa ka a mara ihe dị iche n’ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha,+ ha ewepụwokwa anya ha n’ụbọchị izu ike m,+ e mewokwa ka m bụrụ onye rụrụ arụ n’etiti ha.+ 27  Ndị isi ya, bụ́ ndị nọ n’ime ya, yiri anụ ọhịa wolf ndị na-adọgbu anụ wee wụfuo ọbara,+ bibie mkpụrụ obi iji nweta uru na-ezighị ezi.+ 28  Ndị amụma ya etewo ha nzụ,+ na-ahụ ihe na-abụghị eziokwu n’ọhụụ,+ na-agbara ha afa ụgha,+ sị: “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru,” mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụla Jehova kwuru. 29  Ndị ala ahụ akpawo nkata irigbu mmadụ,+ ha apụnarawo mmadụ ihe,+ megbuo onye nọ n’ahụhụ na ogbenye,+ ha erigbuwokwa onye mbịarambịa n’ekpeghị ya ikpe ziri ezi.’+ 30  “‘M nọ na-achọ nwoke nke si n’etiti ha, bụ́ onye ga-arụzi mgbidi ahụ e ji nkume wuo,+ onye ga-eguzokwa n’ihu m maka ala ahụ n’ebe a kwaturu akwatu+ ná mgbidi ahụ, ka m wee ghara ibibi ya;+ ma ọ dịghị onye m hụrụ. 31  N’ihi ya, m ga-awụkwasị ha ọnụma m.+ M ga-eji ọkụ nke oké iwe m kpochapụ ha.+ M ga-eme ka ha jiri isi ha buru ihe ha metara,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji