Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 21:1-32

21  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, chee ihu na Jeruselem ma kwuo okwu+ megide ebe ndị dị nsọ,+ buokwa amụma ihe a ga-eme ala Izrel.+  Sị ala Izrel, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m na-emegide gị,+ m ga-amịpụtakwa mma agha m n’ọbọ+ ya bipụ ma onye ezi omume ma onye ajọ omume n’etiti gị.+  Ya mere, mma agha m ga-esi n’ọbọ ya pụta imegide anụ ahụ́ niile, malite n’ebe ndịda ruo n’ebe ugwu,+ ka m wee bipụ ma onye ezi omume ma onye ajọ omume n’ime gị.  Anụ ahụ́ niile ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova, amịpụtawo mma agha m n’ọbọ ya.+ Ọ gakwaghị alaghachi azụ.”’+  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, sụọ ude mgbe úkwù na-ama gị jijiji.+ Jiri obi ilu sụọ ude n’ihu ha.+  Ọ ga-erukwa na, ọ bụrụ na ha asị gị, ‘Gịnị mere i ji na-asụ ude?’+ ị ga-asị ha, ‘Ọ bụ n’ihi ozi nke na-abịa.’+ N’ihi na ọ ga-abịarịrị,+ obi ga-alọkwa onye ọ bụla mmiri.+ Aka niile ga-akụda, mmụọ ọ bụla ga-ada mbà, ikpere niile ga-agụsịkwa mmiri.+ ‘Lee! Ọ ga-abịarịrị,+ a ga-emekwa ka o mezuo,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, buo amụma, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Kwuo, sị, ‘Mma agha, mma agha!+ A mụwo ya,+ e mewokwa ka ọ na-egbu maramara. 10  A mụrụ ya ka e jiri ya gbuo ndị mmadụ; a mụrụ ya ka ọ na-egbu maramara.’”’”+ “Ka ọ̀ bụ anyị ṅụrịwa?”+ “‘Ọ̀ na-ajụ mkpanaka+ nwa m,+ dị ka ọ na-ajụ osisi niile?+ 11  “‘E nyefewo ya ka e mee ka ọ na-egbu maramara, ka e wee jiri ya n’aka. A mụwo mma agha ahụ, e mewo ka ọ na-egbu maramara, ka e wee nye ya onye na-egbu mmadụ.+ 12  “‘Kwaa ákwá, tiekwa mkpu ákwá,+ gị nwa nke mmadụ, n’ihi na mma agha ahụ na-emegide ndị m;+ ọ na-emegide ndị isi niile nke Izrel.+ E nunyewo ndị a niile ná mma agha ahụ, ha na ndị m.+ Ya mere, tie aka n’apata ụkwụ.+ 13  N’ihi na e mewo nnyocha,+ gịnịkwanụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ jụrụ mkpanaka eze?+ Ọ gaghị adịgide,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 14  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, buo amụma, kụọkwa aka,+ kwuo ‘Mma agha!’ ugboro atọ.+ Ọ bụ mma agha e ji gbuo ndị e gburu egbu. Ọ bụ mma agha e ji gbuo onye bụ́ onye ukwu, bụ́ mma agha nke na-agba ha gburugburu.+ 15  Ka obi wee lọọ mmadụ mmiri,+ ka ndị a ga-akwatu n’ọnụ ụzọ ámá ha niile wee dị ọtụtụ,+ m ga-eji mma agha gbuo ndị mmadụ. Ewoo, e mere ya ka ọ na-egbu maramara, a mụrụ ya amụ ka e jiri ya gbuo ndị mmadụ!+ 16  Dị nkọ;+ gaa n’aka nri! Dịrị n’ebe i kwesịrị ịdị; gaa n’aka ekpe! Ebe ọ bụla e chere gị ihu! 17  Mụ onwe m ga-akụkwa aka,+ m ga-emekwa ka ọnụma+ m dajụọ.+ Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya.” 18  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 19  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, meere onwe gị ụzọ abụọ mma agha eze Babịlọn ga-esi bata.+ Ha abụọ ga-esi n’otu ala ahụ pụta, a ga-emekwa ka e nwee ihe ga na-egosi ụzọ;+ a ga-eme ka ọ dịrị n’isi ụzọ e si abanye n’obodo. 20  Ị ga-eme ka e nwee otu ụzọ mma agha ahụ ga-esi bata wakpo Raba+ nke ụmụ Amọn, otu ga-awakpo Juda, wakpo Jeruselem e wusiri ike.+ 21  N’ihi na eze Babịlọn kwụụrụ otu ebe n’ebe ụzọ wara ngalaba, n’isi ụzọ abụọ, iji gbaa afa.+ Ọ yọgharịwo akụ́. O jiriwo terafim+ jụọ ase; o lewo anya n’imeju. 22  Afa o ji aka nri ya gbaa gosiri na ha kwesịrị ịga Jeruselem, iguzobe ihe e ji akwatu mgbidi,+ imeghe ọnụ kwuo ka e gbuo ndị mmadụ, itisi mkpu agha ike,+ iguzobe ihe e ji akwatu mgbidi n’ọnụ ụzọ ámá, ịma ékpè, iwu mgbidi nnọchibido.+ 23  Ọ dị ka ịgba afa ụgha n’anya ha,+ ya bụ, n’anya ndị ṅụrụ iyi e nyere ha ṅụọ;+ ọ na-echetakwa njehie ha,+ ka e wee jide ha.+ 24  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na unu emewo ka e cheta njehie unu site n’ikpughe mmehie unu, ka e wee hụ mmehie unu dị ka ihe niile unu na-eme si dị, ebe ọ bụ na e chetara unu,+ aka ga-akpara unu.’+ 25  “Ma gị onwe gị, onyeisi+ ọjọọ nke Izrel,+ onye e merụrụ ahụ́ nke ukwuu, onye ụbọchị ya bịaworo n’oge njehie nke mgbe ikpeazụ,+ 26  nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Wepụ ákwà ahụ e kere ya n’isi, kpupụkwa okpueze ya.+ Nke a agaghị adịkwa otú ọ dịbu.+ Mee ka ọbụna onye dị ala dịrị elu,+ meekwa ka onye nke dị elu* dịrị ala.+ 27  Mbibi, mbibi, mbibi ka m ga-ebibi ya.+ Ọ gaghịkwa abụ nke onye ọ bụla ruo mgbe onye o ruuru bịara,+ m ga-ewerekwa ya nye ya.’+ 28  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, buo amụma, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru banyere ụmụ Amọn nakwa banyere nkọcha ha na-akọcha.’ Ị ga-asịkwa, ‘Mma agha, mma agha a mịpụtara amịpụta maka igbu ndị mmadụ, nke a mụrụ ka ọ na-egbu maramara, ka o ripịa ndị mmadụ,+ 29  n’ihi na ha na-ahụtara gị ihe na-abụghị eziokwu, n’ihi na ha na-agbara gị afa ụgha,+ iji mee ka ị dakwasị n’olu ndị e gburu egbu, bụ́ ndị ajọ omume, ndị ụbọchị ha bịaworo n’oge njehie nke mgbe ikpeazụ.+ 30  Mịghachi ya n’ọbọ ya. M ga-ekpe gị ikpe n’ebe e kere gị, n’ala i si.+ 31  M ga-awụkwasị gị ọnụma m. M ga-afụkwasị gị ọkụ nke oké iwe m,+ m ga-enyefekwa gị n’aka ndị na-adịghị eche echiche, ndị nwere nkà n’ibibi ihe.+ 32  Ị ga-abụrụ ọkụ nkụ.+ Ọbara gị ga-adị n’etiti ala ahụ. A gaghị echeta gị, n’ihi na mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezi 21:26*  Ma ọ bụ, “ihe dị elu.”