Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 20:1-49

20  O wee ruo n’afọ nke asaa, n’ọnwa nke ise, n’abalị iri n’ọnwa ahụ, na ụfọdụ n’ime ndị okenye Izrel bịara ịjụ Jehova ase.+ Ha wee nọdụ ala n’ihu m.+  Okwu Jehova wee ruo m ntị, sị:  “Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ùnu bịara ka unu jụọ m ase?+ ‘Dị nnọọ ka m dị ndụ, unu agaghị ajụta m ihe ọ bụla,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”’  “Ị̀ ga-ekpe ha ikpe? Ị̀ ga-ekpe ha ikpe, gị nwa nke mmadụ?+ Mee ka ha mara ihe arụ niile ndị nna nna ha mere.+  Sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “N’ụbọchị m họọrọ Izrel,+ m welikwara aka m elu+ ṅụọrọ mkpụrụ nke ụlọ Jekọb iyi,+ meekwa ka ha mara m n’ala Ijipt.+ Ee, m weliri aka m ṅụọrọ ha iyi, sị, ‘Abụ m Jehova Chineke unu.’+  N’ụbọchị ahụ, m weliri aka m+ ṅụọrọ ha iyi na m ga-akpọpụta ha n’ala Ijipt kpọga ha n’ala m ledooro ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.+ Ọ bụ ihe e ji chọọ ala niile mma.+  M wee sị ha, ‘Onye ọ bụla n’ime unu tụfuo ihe arụ o lekwasịrị anya,+ unu ejikwala arụsị Ijipt ndị na-asọ oyi ka nsị merụọ onwe unu.+ Abụ m Jehova Chineke unu.’+  “‘“Ha wee malite inupụrụ m isi,+ ha ekweghịkwa ige m ntị. Ha niile n’otu n’otu atụfughịkwa ihe arụ ha lekwasịrị anya, ha ahapụghịkwa arụsị Ijipt ndị na-asọ oyi ka nsị,+ m wee kwuo na m ga-awụkwasị ha ọnụma m, ka m wee wụkwasị ha iwe m dum n’ala Ijipt.+  M wee mee ihe n’ihi aha m ka a ghara imerụ ya n’anya mba dị iche iche ha nọ,+ n’ihi na m nọ n’ihu mba ndị a mee ka ha mara m mgbe m na-akpọpụta ha n’ala Ijipt.+ 10  M wee kpọpụta ha n’ala Ijipt ma kpọbata ha n’ala ịkpa.+ 11  “‘“M wee nye ha ụkpụrụ m;+ m mekwara ka ha mara mkpebi ikpe m,+ ka onye na-edebe ha wee site na ha dịrị ndụ.+ 12  M nyekwara ha ụbọchị izu ike m,+ ka ọ bụrụ ihe ịrịba ama n’etiti mụ na ha,+ ka ha wee mara na mụ onwe m bụ Jehova, onye na-edo ha nsọ. 13  “‘“Ma ha onwe ha, bụ́ ụlọ Izrel, nupụụrụ m isi n’ala ịkpa.+ Ha ejeghị ije n’ụkpụrụ m,+ ha jụkwara mkpebi ikpe m,+ bụ́ nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ma ọ bụrụ na o debe ya.+ Ha merụkwara ụbọchị izu ike m nke ukwuu.+ M wee kwuo na m ga-awụkwasị ha ọnụma m n’ala ịkpa, iji kpochapụ ha.+ 14  Ma, m mere ihe n’ihi aha m ka a ghara imerụ ya n’ihu mba dị iche iche, bụ́ ndị m nọ n’ihu ha kpọpụta ha.+ 15  M welikwara aka m ṅụọrọ ha iyi n’ala ịkpa+ na m gaghị akpọbata ha n’ala ahụ m nyere ha, ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ (ọ bụ ihe e ji chọọ ala niile mma,)+ 16  n’ihi na ha jụrụ mkpebi ikpe m; ha ejeghịkwa ije n’ụkpụrụ m, ha merụkwara ụbọchị izu ike m, n’ihi na obi ha dị n’arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị.+ 17  “‘“Anya m wee malite imere ha ebere iji mee ka m ghara ịla ha n’iyi,+ ekpochapụghịkwa m ha n’ala ịkpa. 18  M wee gwa ụmụ ha n’ala ịkpa,+ sị, ‘Unu ejela ije n’ụkpụrụ nna nna unu hà,+ unu edebekwala mkpebi ikpe ha,+ unu ejikwala arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị merụọ onwe unu.+ 19  Abụ m Jehova Chineke unu.+ Jeenụ ije n’ụkpụrụ m,+ debekwanụ mkpebi ikpe m,+ meekwanụ ha.+ 20  Dookwanụ ụbọchị izu ike m nsọ.+ Ọ ga-abụkwa ihe ịrịba ama n’etiti mụ na unu, ka unu wee mara na mụ onwe bụ Jehova Chineke unu.’+ 21  “‘“Ụmụ ha wee malite inupụrụ m isi.+ Ha ejeghị ije n’ụkpụrụ m, ha edebeghịkwa mkpebi ikpe m site n’ime ya eme, bụ́ nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ma ọ bụrụ na o debe ya.+ Ha merụrụ ụbọchị izu ike m.+ M wee kwuo na m ga-awụkwasị ha ọnụma m, ka m wee wụkwasị ha iwe m dum n’ala ịkpa.+ 22  M wee weghachi aka m azụ+ ma mee ihe n’ihi aha m, ka e wee ghara imerụ ya n’ihu mba dị iche iche, bụ́ ndị hụrụ mgbe m kpọpụtara ha.+ 23  M welikwara aka m ṅụọrọ ha iyi n’ala ịkpa+ na m ga-achụsasị ha n’etiti mba dị iche iche, meekwa ka ha gbasasịa n’ala niile,+ 24  n’ihi na ha edebeghị mkpebi ikpe m,+ ha jụkwara ụkpụrụ m,+ ha merụkwara ụbọchị izu ike m,+ anya ha dịkwa n’arụsị ndị nna nna ha ndị na-asọ oyi ka nsị.+ 25  M wee kwe ka ha nwee ụkpụrụ na-adịghị mma nakwa mkpebi ikpe nke na-agaghị eme ka ha dị ndụ.+ 26  M kwekwara ka onyinye ha merụọ ha mgbe ha na-esure* nwa ọ bụla meghere akpa nwa n’ọkụ,+ ka m wee gbahapụ ha, ka ha wee mara na mụ onwe m bụ Jehova.”’+ 27  “Ya mere, gwa ụlọ Izrel okwu, gị nwa nke mmadụ, sị ha,+ ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ma, nna nna unu hà kparịrị m n’ihe a, ya bụ, n’omume ekwesịghị ntụkwasị obi ha mesoro m.+ 28  M wee kpọbata ha n’ala+ nke m weliri aka m ṅụọ iyi na m ga-enye ha.+ Mgbe ha hụrụ ugwu ọ bụla dị elu+ na osisi ọ bụla wara alaka, ha na-amalite ịchụ àjà ha n’ebe ahụ+ ma na-enye onyinye ha nke na-akpasu iwe n’ebe ahụ, na-esurekwa ihe na-esi ísì ụtọ n’ebe ahụ+ ma na-awụsa àjà ihe ọṅụṅụ n’ebe ahụ.+ 29  M wee sị ha, ‘Gịnị ka ebe ahụ dị elu unu na-aga pụtara, nke mere e ji na-akpọ ya Ebe Dị Elu ruo taa?’”’+ 30  “Ya mere, gwa ụlọ Izrel, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ̀ bụ n’ụzọ nna nna unu hà ka unu na-emerụ onwe unu,+ ọ̀ bụkwa ihe arụ ha ka unu na ha na-akwa iko?+ 31  Mgbe unu na-eweli onyinye unu site n’isure ụmụ unu n’ọkụ,+ ùnu na-emerụ onwe unu n’ihi arụsị unu niile ndị na-asọ oyi ka nsị ruo taa?+ N’otu mgbe ahụ, m̀ ga-ekwe ka unu jụta m ihe ọ bụla, unu ụlọ Izrel?”’+ “‘Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘agaghị m ekwe ka unu jụta m ihe ọ bụla.+ 32  Ihe ahụ nke na-abata unu na mmụọ+ agaghị eme ma ọlị,+ n’ihi na unu na-asị: “Ka anyị dịrị ka ndị mba ọzọ, dị ka ezinụlọ niile nke ala dị iche iche,+ site n’ijere osisi na nkume ozi.”’”+ 33  “‘Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘m ga-eji aka dị ike na ogwe aka a gbatịrị agbatị+ na ọnụma a wụpụrụ awụpụ chịa unu dị ka eze.+ 34  M ga-esikwa n’etiti ndị dị iche iche kpọpụta unu, sikwa n’ala niile a chụsasịrị unu jiri aka dị ike na ogwe aka a gbatịrị agbatị na ọnụma a wụpụrụ awụpụ kpọkọta unu.+ 35  M ga-akpọbatakwa unu n’ala ịkpa nke ndị dị iche iche+ ma mee ka mụ na unu baa n’ikpe ihu n’ihu n’ebe ahụ.+ 36  “‘Dị nnọọ ka m mere ka mụ na nna nna unu hà baa n’ikpe n’ala ịkpa nke ala Ijipt,+ otú ahụ ka m ga-eme ka mụ na unu baa n’ikpe,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 37  ‘M ga-emekwa ka unu gafere n’okpuru mkpara+ ma mee ka mụ na unu gbaa ndụ.+ 38  M ga-ekpochapụkwa ndị na-enupụrụ m isi na ndị na-emebi iwu+ m n’etiti unu, n’ihi na n’ala ha biri dị ka ọbịa ka m ga-esi kpọpụta ha, ma ha agaghị abata n’ala Izrel;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’+ 39  “Unu ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Onye ọ bụla n’ime unu gaa fee arụsị ya nke na-asọ oyi ka nsị.+ E mesịa, ọ bụrụ na unu egeghị m ntị, unu agakwaghị eji onyinye unu na arụsị unu ndị na-asọ oyi ka nsị merụọ aha nsọ m.’+ 40  “‘N’ihi na n’ugwu nsọ m, n’ugwu dị n’ebe dị elu n’Izrel,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘n’ebe ahụ ka ha onwe ha, ya bụ, ụlọ Izrel dum, ga-efe m, n’ala ha.+ N’ebe ahụ ka ihe ha ga-atọ m ụtọ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m ga-achọ onyinye unu na mkpụrụ mbụ nke ihe unu na-enye, bụ́ ihe nsọ unu niile.+ 41  Ihe unu ga-atọ m ụtọ n’ihi ihe ahụ na-esi ísì ụtọ.+ M ga-eme nke a mgbe m ga-akpọpụta unu n’etiti ndị dị iche iche, sikwa n’ala dị iche iche a chụsasịrị unu kpọkọta unu.+ A ga-esikwa n’aka unu doo m nsọ n’ihu mba dị iche iche.’+ 42  “‘Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,+ mgbe m kpọbatara unu n’ala Izrel,+ n’ala m weliri aka m ṅụọ iyi na m ga-enye nna nna unu hà. 43  Unu ga-anọkwa n’ebe ahụ cheta ụzọ unu niile+ na ihe niile unu mere, bụ́ ndị unu ji merụọ onwe unu,+ ihu unu ga-egosikwa na ihere onwe unu na-eme unu n’ihi ihe ọjọọ niile unu mere.+ 44  Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova+ mgbe m mere ihe maka unu n’ihi aha m,+ ọ bụghị dị ka ụzọ ọjọọ unu si dị ma ọ bụ dị ka omume ọjọọ unu si dị,+ unu ụlọ Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.” 45  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 46  “Nwa nke mmadụ, chee ihu+ ná mpaghara ndịda, kwuokwa okwu+ n’ebe ndịda, buokwa amụma ihe a ga-eme oké ọhịa dị n’ebe ndịda. 47  Ị ga-asịkwa oké ọhịa dị n’ebe ndịda, ‘Nụrụ okwu Jehova. Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-esunye gị ọkụ,+ ọ ga-erepịakwa osisi ndụ ọ bụla na osisi ọ bụla kpọrọ nkụ dị n’ime gị.+ A gaghị emenyụ ọkụ ahụ na-enwu enwu,+ ọ ga-achakpọkwa ihu niile malite n’ebe ndịda ruo n’ebe ugwu.+ 48  Anụ ahụ́ niile ga-ahụkwa na ọ bụ m, Jehova, sunyere ya ọkụ, nke mere na a gaghị emenyụ ya emenyụ.”’”+ 49  M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Ha na-ekwu banyere m, sị, ‘Ọ́ bụghị ilu ka ọ na-atụ?’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezi 20:26*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ime ka ọ gabiga n’ọkụ.”