Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 17:1-24

17  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, jiri ụlọ Izrel tụọ ilu,+ jirikwa ya maa atụ.+  Sịkwa, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Nnukwu ugo,+ nke nwere nnukwu nku,+ nweekwa ábụ́bà ogologo, nke ábụ́bà juru n’ahụ́, tụọkwa àgwà, feere bịa Lebanọn+ wee fegoro n’elu elu osisi+ sida.+  O wee tụbipụ ọnụ ọnụ alaka ọhụrụ ya wee bute ya n’ala Kenan.+ O busara ya n’obodo ndị ahịa.  O wekwaara ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke ala ahụ+ kụọ n’ubi a ga-agha mkpụrụ. Ọ kụrụ ya otú e si akụ osisi wilo, ya bụ, otú e si akụ osisi wilo n’akụkụ nnukwu mmiri.+  O wee puo ma jiri nwayọọ nwayọọ ghọọ osisi vaịn dị mkpụmkpụ,+ nke na-ama pokopoko, nke alaka ya na-awasaghị awasa; mgbọrọgwụ ya na-agbasakwa n’okpuru ya. O mesịrị ghọọ osisi vaịn, waa agalaba, waakwa alaka.+  “‘“E nwekwara nnukwu ugo ọzọ,+ nke nwere nnukwu nku, nweekwa ábụ́bà dị ukwuu,+ ma, lee! osisi vaịn a mere ka mgbọrọgwụ ya ruo n’ebe ọ nọ n’ihi agụụ na-agụ ya.+ O si n’ubi a kụrụ ya wasaara ya alaka ya ka ọ gbaa ya mmiri.+  E si n’ebe a kụrụ ya dọgharịa ya+ n’ala dị mma, n’akụkụ nnukwu mmiri, ka o wee waa alaka ma mịa mkpụrụ, ka ọ ghọọ nnukwu osisi vaịn.”’  “Kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ̀ ga-eme nke ọma?+ Ọ̀ bụ na mmadụ agaghị efopụ mgbọrọgwụ ya+ ma mebie mkpụrụ ya? Ọ̀ bụkwa na alaka ya niile a ka gbajipụrụ agbajipụ agaghị akpọnwụ?+ Ọ ga-akpọnwụ. Ifopụ ya agaghị achọ ogwe aka dị ike ma ọ bụ ìgwè mmadụ. 10  Ma, lee! ọ bụ ezie na a dọgharịala ya, ọ̀ ga-eme nke ọma? Ọ́ gaghị akpọnwụ kpamkpam, ọbụna dị ka mgbe ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ fere ya?+ Ọ ga-akpọnwụ n’ubi ahụ a kụrụ ya.”’”+ 11  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 12  “Biko, gwa ụlọ ahụ na-enupụ isi,+ sị, ‘Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe ihe ndị a pụtara?’ Gwa ha, sị, ‘Lee! Eze Babịlọn bịara Jeruselem wee kpụrụ eze ya+ na ndị isi ya kpụga Babịlọn bụ́ ebe ya onwe ya nọ.+ 13  Ọ kpọkwaara otu n’ime ụmụ eze,+ ya na ya wee gbaa ndụ, o wee mee ka ọ ṅụọ iyi.+ Ọ kpụkwaara ndị isi ala ahụ,+ 14  ka alaeze ahụ wee dị ala,+ ghara inwe ike ibuli onwe ya elu, ka o wee dịgide site n’idebe ọgbụgba ndụ ya.+ 15  Ma o nupụụrụ ya isi+ n’ikpeazụ site n’iziga ndị ozi ya Ijipt, ka Ijipt kpụnye ya ịnyịnya,+ kpọnyekwa ya ìgwè mmadụ. Ọ̀ ga-enwe ihe ịga nke ọma? Onye na-eme ihe ndị a, onye mebikwara ọgbụgba ndụ, ọ̀ ga-agbanahụ ntaramahụhụ? Ọ̀ ga-agbanahụ ntaramahụhụ n’ezie?’+ 16  “‘“Dị nnọọ ka m dị ndụ,”+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, “n’obodo eze ahụ nke mere onye ahụ eze, bụ́ onye ahụ ledara iyi ọ ṅụrụ anya,+ mebiekwa ọgbụgba ndụ ya, n’ebe ya na eze ahụ nọ n’ime Babịlọn, ka ọ ga-anwụ.+ 17  Fero agaghị eji oké ìgwè ndị agha na ìgwè mmadụ nyere ya aka n’agha,+ site n’ịma ékpè na iwu mgbidi nnọchibido, iji bipụ ọtụtụ mkpụrụ obi.+ 18  O ledawokwa iyi ọ ṅụrụ anya+ site n’imebi ọgbụgba ndụ, ma, lee! ọ bịanyewo aka ya,+ o mewokwa ihe a niile. Ọ gaghị agbanahụ ntaramahụhụ.”’+ 19  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Dị nnọọ ka m dị ndụ, n’ezie, iyi ahụ ọ ṅụụrụ m nke o ledara anya+ na ọgbụgba ndụ m nke o mebiri, m ga-eme ka o jiri isi ya buru ya. 20  M ga-agbasakwa ụgbụ m n’elu ya, ụgbụ m ji achụ nta ga-ejidekwa ya.+ M ga-akpụtakwa ya Babịlọn, mụ na ya ga-abakwa n’ikpe n’ebe ahụ n’ihi omume ekwesịghị ntụkwasị obi nke o mesoro m.+ 21  A ga-eji mma agha gbuo ndị niile gbatara ọsọ ndụ n’ime ìgwè ndị agha ya, a ga-achụsasịkwa ndị fọdụrụnụ ebe niile.*+ Unu ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya.”’+ 22  “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Mụ onwe m ga-ewere ụfọdụ n’ime ọnụ ọnụ osisi sida toro ogologo;+ m ga-adọkwa ha; m ga-akapụ ome o pupụtara n’elu alaka ya,+ m ga-ejikwa aka m dọgharịa ya n’elu ugwu dị oké elu.+ 23  N’ugwu dị elu nke dị n’Izrel ka m ga-adọgharị ya,+ ọ ga-awakwa alaka ma mịa mkpụrụ,+ ghọọkwa osisi sida dị ukwuu.+ Nnụnụ niile ndị nwere ụdị nku ọ bụla ga-ebi n’okpuru ya; ha ga-ebikwa na ndò nke alaka ya.+ 24  Osisi niile dị n’ọhịa ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova,+ emewo ka osisi dị elu dịrị ala,+ mee ka osisi dị ala dịrị elu,+ mee ka osisi dị ndụ kpọnwụọ,+ meekwa ka osisi kpọnwụrụ akpọnwụ too nke ọma. Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya, meekwa ya.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezi 17:21*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “‘n’ifufe niile,’ ya bụ, n’ebe niile ifufe na-efega.”