Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 13:1-23

13  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, buo amụma banyere ndị amụma Izrel, bụ́ ndị na-ebu amụma,+ sịkwa ndị na-echepụta ihe ha na-ebu n’amụma,+ ‘Nụrụnụ okwu Jehova.+  Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu,+ ndị na-agbaso mmụọ nke ha,+ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụla ha hụrụ!+  Ndị amụma gị dị ka nkịta ọhịa ndị nọ n’ebe a lara n’iyi, gị Izrel.+  Unu agaghị eguzo n’ebe mgbidi dara ada+ ịlụ agha, unu agaghịkwa eji nkume wuo mgbidi+ n’ihi ụlọ Izrel, iji kwụsie ike n’agha n’ụbọchị Jehova.”+  “Ha ahụwo ihe na-abụghị eziokwu n’ọhụụ,+ afa ha gbakwara bụ ụgha, ha na-asị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru,’ mgbe ọ na-abụghị Jehova dunyere ha, ha echerewokwa ka ihe ha kwuru mezuo.+  Ọ́ bụghị ọhụụ na-abụghị eziokwu ka unu hụrụ, ọ́ bụghịkwa ụgha unu jụtara n’ase ka unu kwuworo, mgbe unu na-asị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru,’ mgbe mụ onwe m na-ekwughị ihe ọ bụla?”’+  “‘Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “‘Ebe ọ bụ na unu ekwuwo ihe na-abụghị eziokwu, unu ahụwokwa ụgha n’ọhụụ, n’ihi ya, m na-emegide unu,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”  Aka m na-emegidekwa ndị amụma na-ahụ ihe na-abụghị eziokwu n’ọhụụ nakwa ndị na-agba afa ụgha.+ Ha agaghị anọgide n’etiti ndị m bụ́ ndị na-akpachi anya,+ a gaghịkwa edenye aha ha n’akwụkwọ e debara aha ụlọ Izrel,+ ha agaghịkwa abata n’ala Izrel;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova,+ 10  n’ihi na, n’ezie, ha eduhiewo ndị m, na-asị, “Udo dị!” mgbe udo na-adịghị,+ e nwekwara onye na-ewu ahụ́ ụlọ, ma n’efu+ ka ndị na-ete ya nzụ na-ete ya.’+ 11  “Gwa ndị na-ete ya nzụ na ọ ga-ada. Oké mmiri ozuzo ga-ezorịrị, gị akụ́ mmiri ígwé, ị ga-adakwa, oké ifufe ga-emekwa ka ọ gbawaa.+ 12  Lee! mgbidi ahụ ga-adarịrị. Ọ̀ bụ na a gaghị asị unu, ‘Olee ihe ahụ unu tere ya?’+ 13  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘M ga-eji ọnụma m mee ka oké ifufe fee, n’iwe m ka oké mmiri ozuzo ga-ezo, n’ọnụma m ka akụ́ mmiri ígwé ga-ada iji weta mkpochapụ.+ 14  M ga-akwatukwa mgbidi ahụ unu tere nzụ, meekwa ka ọ daruo ala, a ga-ekpughekwa ntọala ya.+ Obodo ahụ ga-adarịrị, unu ga-alakwa n’iyi n’ime ya; unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’+ 15  “‘M ga-awụsakwa mgbidi ahụ na ndị tere ya nzụ ọnụma m dum, m ga-asịkwa unu: “Mgbidi ahụ adịkwaghị, ndị tere ya nzụ anọkwaghị,+ 16  bụ́ ndị amụma Izrel, ndị na-eburu Jeruselem amụma nakwa ndị na-ahụrụ ya ọhụụ udo,+ mgbe udo na-adịghị,”’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ 17  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, chee+ ndị inyom nke ndị gị ihu, bụ́ ndị na-echepụta+ ihe ha na-ebu n’amụma,+ buokwa amụma ihe a ga-eme ha. 18  Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ahụhụ ga-adịrị ndị inyom na-adụrụ mmadụ niile ihe ha na-ekpunye n’ikpere aka, ndị inyom na-eme ákwà mkpuchi isi maka otú ọ bụla mmadụ hà iji chụọ nta mkpụrụ obi!+ Ọ̀ bụ mkpụrụ obi nke ndị m ka unu bụ́ ndị inyom na-achụ nta ha ma na-edebe mkpụrụ obi unu ndụ? 19  Ùnu ga-eme ka m bụrụ onye rụrụ arụ n’anya ndị m iji nweta ọka bali juru ọbụ aka ole na ole nakwa ibé achịcha ole na ole,+ iji gbuo mkpụrụ obi na-ekwesịghị ịnwụ+ nakwa iji chebe mkpụrụ obi na-ekwesịghị ịdị ndụ site n’ụgha unu ghaara ndị m, ndị na-aṅa ntị n’okwu ụgha?”’+ 20  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-eme ihe unu bụ́ ndị inyom gba n’aka ihe, nke unu ji na-achụ nta mkpụrụ obi dị ka à ga-asị na ha bụ anụ ufe, m ga-adọkapụkwa ha n’aka unu ma tọhapụ mkpụrụ obi ndị ahụ unu na-achụ nta ha, bụ́ mkpụrụ obi ndị dị unu ka à ga-asị na ha bụ anụ ufe.+ 21  M ga-adọkapụkwa ákwà mkpuchi unu ma napụta ndị m n’aka unu, ha agakwaghị anọ n’aka unu dị ka ndị a chụtara ná nta; unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.+ 22  Ebe ọ bụ na unu ji okwu ụgha mee ka obi onye ezi omume nọrọ ná mwute,+ mgbe mụ onwe m na-emeghị ka o nwee ihe mgbu, ebe unu mekwara ka aka onye ajọ omume dị ike+ ka o wee ghara ịhapụ ụzọ ajọ omume ya ka e wee debe ya ndụ,+ 23  ya mere, unu ndị inyom agaghị anọgide+ na-ahụ ihe na-abụghị eziokwu n’ọhụụ,+ unu agakwaghị+ agba afa ọzọ;+ m ga-anapụtakwa ndị m n’aka unu,+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji