Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 11:1-25

11  Mmụọ+ wee buru m+ buga n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ụlọ Jehova,+ nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ, ma, lee! n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, e nwere ndị ikom iri abụọ na ise.+ M wee hụ Jeazanaya nwa Azọ na Pelataya nwa Benaya, bụ́ ndị isi ndị Izrel, n’etiti ha.+  Chineke wee sị m: “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-akpa nkata ihe ọjọọ, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ megide obodo a;+  ndị na-asị, ‘Ọ̀ bụ na oge e ji ewu ụlọ eruwebeghị?+ Ọ bụ ite e ji esi nri nke nwere ọnụ obosara,+ anyị onwe anyị bụ anụ.’  “Ya mere, buo amụma ihe a ga-eme ha. Nwa nke mmadụ, buo amụma.”+  Mmụọ Jehova wee dakwasị m.+ Chineke wee sị m: “Kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru:+ “Ụlọ Izrel, ihe unu kwuru ziri ezi; mụ onwe m makwaara ihe batara unu na mmụọ.+  Unu emewo ka ndị unu e gburu n’obodo a dị ọtụtụ, unu emewokwa ka ndị e gburu egbu jupụta okporo ámá ya.”’”+  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọ bụ ndị unu e gburu egbu, bụ́ ndị unu tọgbọrọ n’ime ya, bụ anụ,+ ọ bụkwa obodo a bụ ite ahụ e ji esi nri nke nwere ọnụ obosara;+ a ga-akpọpụtakwa unu n’ime ya.’”+  “‘Unu atụwo mma agha egwu,+ m ga-emekwa ka mma agha bịakwasị unu,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+  ‘M ga-akpọpụtakwa unu n’ime ya ma nyefee unu n’aka ndị mba ọzọ,+ meekwa ihe e kpere n’ikpe n’isi unu.+ 10  A ga-eji mma agha gbuo unu.+ M ga-ekpe unu ikpe n’ókè nke ala Izrel;+ unu ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova.+ 11  Obodo a agaghị abụrụ unu ite e ji esi nri nke nwere ọnụ obosara,+ unu onwe unu agaghịkwa abụ anụ dị n’ime ya. N’ókè nke ala Izrel ka m ga-ekpe unu ikpe, 12  unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova, n’ihi na unu ejeghị ije n’ụkpụrụ m, unu emeghịkwa+ ihe m kpere n’ikpe, kama unu mere dị ka mkpebi ikpe nke mba ndị gbara unu gburugburu si dị.’”+ 13  O wee ruo na ozugbo m busịrị amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ.+ M wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, jiri oké olu tie mkpu,+ sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova!+ Ọ̀ bụ mkpochapụ ka ị na-ekpochapụ ndị fọdụrụ n’Izrel?”+ 14  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 15  “Nwa nke mmadụ, banyere ụmụnne gị,+ ee, ụmụnne gị, bụ́ ndị ikom ahụ ọ ga-amasị ma i nweta ikike ịgbara ala gị, tinyere ụlọ Izrel dum, ha dum, ọ bụ ha ka ndị bi na Jeruselem sịrị, ‘Nọrọnụ Jehova ebe dị anya. Ọ bụ anyị nwe ya; e nyewo anyị ala a ka ọ bụrụ nke anyị’;+ 16  ya mere, kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ bụ ezie na mụ edebewo ha n’ebe dị anya n’etiti mba niile, ọ bụkwa ezie na mụ achụgawo ha n’ala dị iche iche,+ m ga-abụrụ ha ebe nsọ ruo nwa oge n’etiti mba dị iche iche ha banyeworo.”’+ 17  “Ya mere, kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “M ga-esikwa n’etiti ndị dị iche iche kpọkọta unu, sikwa n’ala dị iche iche a chụgara unu chịkọta unu, m ga-enyekwa unu ala Izrel.+ 18  Ha ga-abịakwa n’ebe ahụ wepụsịa ihe ya niile jọgburu onwe ha na ihe arụ ya niile.+ 19  M ga-enyekwa ha otu obi,+ m ga-etinyekwa mmụọ ọhụrụ n’ime ha;+ m ga-ewepụkwa obi nkume n’ahụ́+ ha ma nye ha obi nke dị nro dị ka anụ ahụ́,+ 20  ka ha wee jee ije n’ụkpụrụ m, debe mkpebi ikpe m, mezuokwa ha;+ ha ga-abụkwa ndị nke m n’ezie,+ mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.”’+ 21  “‘“Ma ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe arụ ha na ihe ha ndị jọgburu onwe ha,+ m ga-eme ka ha jiri isi ha buru ihe ha metara,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’”+ 22  Ndị cherọb+ ahụ wee welie nku ha, wiil ndị ahụ dịkwa n’akụkụ ha,+ ebube+ Chineke Izrel sikwa n’elu bịa dịrị n’elu ha.+ 23  Ebube Jehova+ wee si n’ime obodo ahụ gbagoo ma kwụrụ n’elu ugwu+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.+ 24  N’ọhụụ ahụ mmụọ Chineke mere ka m hụ, mmụọ+ buuru m+ buga Kaldia, bụ́ ebe ndị ahụ a dọọrọ n’agha nọ;+ ọhụụ ahụ m hụrụ wee si n’ebe m nọ gbagoo. 25  M wee malite ịgwa ndị ahụ a dọọrọ n’agha ihe niile Jehova mere ka m hụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji