Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Esta 9:1-32

9  N’ọnwa iri na abụọ, ya bụ, ọnwa Eda,+ n’abalị iri na atọ ya, mgbe oge ruru ka e mezuo okwu eze na iwu ya,+ n’ụbọchị ndị iro ndị Juu nọ na-echere ka ha merie ha, ihe tụgharịrị, ndị Juu wee merie ndị kpọrọ ha asị.+  Ndị Juu zukọrọ+ n’obodo ha dị iche iche n’ógbè niile Eze Ahazuirọs+ na-achị iji bie ndị ahụ niile chọrọ ime ha ihe ọjọọ aka,+ ọ dịghịkwa otu onye guzoliri n’ihu ha, n’ihi na ụjọ+ ha jidere mmadụ niile.  Ndị isi+ nke ógbè niile na ndị setrap+ na ndị gọvanọ na ndị na-arụrụ eze ọrụ+ nọ na-enyere ndị Juu aka, n’ihi na ụjọ+ Mọdekaị ji ha.  N’ihi na Mọdekaị bụ nnukwu mmadụ+ n’ụlọ eze, ude+ ya gazukwara ógbè niile, n’ihi na nwoke ahụ bụ́ Mọdekaị nọ na-adịwanye ukwuu.+  Ndị Juu wee jiri mma agha+ sụọ ndị iro ha niile akwụ, gbuo ha, bibiekwa ha, ha wee mee ndị kpọrọ ha asị otú o si masị ha.+  Ndị Juu gbukwara ndị mmadụ na Shushan+ bụ́ obí eze, ha gburu narị ndị ikom ise.  Ha gbukwara Pashandeta na Dalfọn na Aspeta  na Poreta na Adelaya na Arideta  na Pamashta na Arisaị na Aridaị na Vaịzeta, 10  bụ́ ụmụ+ iri Heman+ nwa Hamedeta, bụ́ onye nọ na-ebuso ndị Juu iro;+ ma ha emetụghị ngwongwo+ ha aka. 11  N’ụbọchị ahụ eze nụrụ ọnụ ọgụgụ nke ndị e gburu na Shushan bụ́ obí eze. 12  Eze wee gwa Esta nwunye ya, sị:+ “Ndị Juu egbuwo ndị mmadụ na Shushan bụ́ obí eze,+ ha egbuwokwa narị ndị ikom ise tinyere ụmụ iri Heman. Gịnị ka ha mere+ n’ógbè ndị ọzọ eze na-achị?+ Gịnịkwa ka ị na-arịọ? Ka e nye gị ya.+ Gịnịkwa ka ị chọkwuru ka e meere gị?+ Ka e meere gị ya.” 13  Esta wee sị: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma,+ nyekwuo ndị Juu nọ na Shushan ikike ka ha mekwuo echi ihe iwu kwuru ka e mee taa;+ ka a kwụwa ụmụ iri Heman n’elu osisi.”+ 14  Eze wee kwuo ka e mee otú ahụ.+ E wee nye iwu na Shushan, e wee kwụwa ụmụ Heman n’elu osisi. 15  Ndị Juu bi na Shushan wee zukọta n’abalị nke iri na anọ+ nke ọnwa Eda, ha wee gbuo narị ndị ikom atọ na Shushan; ma ha emetụghị ngwongwo ha aka.+ 16  Ma ndị Juu ndị ọzọ bi n’ógbè dị iche iche eze na-achị+ gbakọrọ, ha wee zọọ mkpụrụ obi ha,+ ha bọkwaara onwe ha ọbọ+ n’ahụ́ ndị iro ha, gbuokwa puku mmadụ iri asaa na ise n’etiti ndị kpọrọ ha asị; ma ha emetụghị ngwongwo ha aka, 17  n’abalị iri na atọ n’ọnwa Eda; e nwekwara ezumike n’abalị iri na anọ ya, meekwa ka ọ bụrụ ụbọchị oriri+ na ụbọchị ịṅụrị ọṅụ.+ 18  Ma ndị Juu bi na Shushan gbakọrọ n’abalị iri na atọ+ ya nakwa n’abalị iri na anọ ya, e nwekwara ezumike n’abalị iri na ise ya, e mekwara ya ka ọ bụrụ ụbọchị oriri na ụbọchị ịṅụrị ọṅụ.+ 19  Ọ bụ ya mere ndị Juu bi n’ime ime obodo, ndị bi n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, ji na-eme ka abalị iri na anọ n’ọnwa Eda+ bụrụ ụbọchị ịṅụrị ọṅụ+ na nke iri oriri na ụbọchị ikpori ndụ+ na inyerịta ihe.+ 20  Mọdekaị+ wee dee ihe ndị a n’akwụkwọ ma zigara ha ndị Juu niile nọ n’ógbè niile Eze Ahazuirọs na-achị,+ ógbè ndị dị nso na ndị dị anya, 21  iji nye ha iwu+ ka ha na-echeta abalị iri na anọ n’ọnwa Eda na abalị iri na ise ya n’afọ ọ bụla, 22  ya bụ, ụbọchị ndị ahụ ndị Juu zuuru ndị iro+ ha ike na ọnwa e mere ka mwute+ ha na-enwe ghọọ ọṅụ, meekwa ka uju ha na-eru ghọọ ụbọchị ikpori ndụ, ka ha na-echeta ha dị ka ụbọchị iri oriri na ịṅụrị ọṅụ na inyerịta ihe+ na inye ndị ogbenye onyinye.+ 23  Ndị Juu nabatara ihe ha maliteworo ime na ihe Mọdekaị degaara ha. 24  N’ihi na Heman+ nwa Hamedeta,+ onye agbụrụ Egag,+ bụ́ onye na-ebuso ndị Juu niile iro,+ akpawo nkata megide ndị Juu ibibi ha,+ o mewokwa ka e fee Pua,+ ya bụ, Nza,+ iji tinye ọgba aghara n’etiti ha ma bibie ha. 25  Ma mgbe Esta batara n’ihu eze, o ji ihe ahụ e dere ede+ n’aka wee sị: “Ka nkata ọjọọ+ a ọ kpaworo megide ndị Juu kpudo ya”;+ ha wee kwụwa ya na ụmụ ya n’elu osisi.+ 26  Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ụbọchị ndị a Purim, site n’okwu bụ́ Pua.+ Ọ bụ ya mere, dị ka ihe niile e kwuru n’akwụkwọ ozi+ a si dị, tinyere ihe ha ji anya ha hụ n’ihe a nakwa ihe dakwasịrị ha, 27  ndị Juu kwetara ma nye onwe ha na ụmụ ha nakwa ndị niile sonyeere ha iwu,+ na ibu ọrụ nke ịdị na-echeta ụbọchị abụọ ndị a agaghị akwụsị akwụsị, dị ka ihe e dere banyere ha si dị nakwa dị ka oge a kara aka na a ga na-eme ha kwa afọ si dị. 28  A ga na-echetakwa ụbọchị ndị a ma na-eme ememme ha n’ọgbọ ọ bụla, n’ezinụlọ ọ bụla, n’ógbè ọ bụla nakwa n’obodo ọ bụla, ụbọchị Purim ndị a agaghị akwụsị akwụsị n’etiti ndị Juu, ememme ncheta+ ha agaghịkwa akwụsị akwụsị n’etiti ụmụ ha. 29  Esta nwunye eze, nwa Abihel,+ na Mọdekaị onye Juu wee jiri okwu ndị dị ike dee akwụkwọ ozi iji kwado akwụkwọ ozi nke abụọ a banyere Purim. 30  O wee zigara ndị Juu niile nọ n’ógbè dị otu narị na iri abụọ na asaa,+ bụ́ ebe Ahazuirọs+ na-achị, akwụkwọ ozi nke e dere okwu udo na eziokwu na ya,+ 31  iji kwado ụbọchị ndị a nke Purim n’oge a kara aka a ga na-eme ha, dị nnọọ ka Mọdekaị onye Juu na Esta nwunye eze nyere ha iwu ime,+ nakwa dị ka ha nyere mkpụrụ obi ha nakwa ụmụ ha iwu ime,+ bụ́ okwu banyere ibu ọnụ+ na mkpu ha tiri maka enyemaka.+ 32  Ihe Esta kwuru mere ka ihe banyere Purim+ guzosie ike, e dekwara ya n’akwụkwọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji