Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Esta 3:1-15

3  Mgbe ihe ndị a gasịrị, Eze Ahazuirọs mere ka Heman+ nwa Hamedeta onye agbụrụ Egag+ dị ukwuu, o bulikwara ya n’ọkwá+ ma mee ka ọkwá ya dị elu karịa ndị isi ndị ọzọ ya na ha nọ.+  Ndị niile na-ejere eze ozi bụ́ ndị nọ n’ọnụ ụzọ ámá eze+ na-ehulata na-akpọrọ Heman isiala, n’ihi na ọ bụ ihe eze nyere n’iwu ka a na-emere ya. Ma Mọdekaị adịghị ehulata, ọ dịghịkwa akpọrọ ya isiala.+  Ndị niile na-ejere eze ozi bụ́ ndị nọ n’ọnụ ụzọ ámá wee malite ịsị Mọdekaị: “Gịnị mere i ji na-ada iwu eze?”+  O wee ruo na ka ha na-agwa ya okwu kwa ụbọchị, ọ ṅaghị ha ntị, ha gwara ya Heman iji hụ ma ọ̀ ga-agbachi nkịtị n’ihe a Mọdekaị na-eme;+ n’ihi na ọ gwawo ha na ya bụ onye Juu.+  Heman wee na-ahụ na Mọdekaị adịghị ehulata, ọ dịghịkwa akpọrọ ya isiala,+ ọnụma wee ju Heman obi.+  Ma o weere ya na igbu naanị Mọdekai bụ iweda onwe ya n’ala, n’ihi na ha agwawo ya banyere ndị obodo Mọdekaị; Heman wee malite ịchọ igbu+ ndị Juu niile nọ n’ógbè niile Ahazuirọs na-achị, bụ́ ndị obodo Mọdekaị.+  N’ọnwa nke mbụ,+ ya bụ, n’ọnwa Naịsan, n’afọ nke iri na abụọ+ nke ọchịchị Eze Ahazuirọs, e fere Pua,+ ya bụ, Nza,+ n’ihu Heman kwa ụbọchị nakwa kwa ọnwa, ruo n’ọnwa nke iri na abụọ, ya bụ, n’ọnwa Eda.+  Heman wee gwa Eze Ahazuirọs, sị: “E nwere otu ndị gbasara+ ebe niile, ndị nọpụkwara iche n’etiti ndị niile n’ógbè niile ị na-achị;+ iwu ha dị iche na nke ndị niile ọzọ, ha adịghịkwa edebe iwu eze,+ o kwesịghịkwa ekwesị ka eze hapụ ha.  Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka e dee ya n’akwụkwọ ka a laa ha n’iyi; m ga-akwụkwa ndị ga-arụ ọrụ+ ahụ iri puku+ talent ọlaọcha ka e tinye ya n’ebe eze na-edebe akụ̀.” 10  Eze wee gbapụta mgbaaka ya e ji aka ihe akara,+ nye ya Heman+ nwa Hamedeta onye agbụrụ Egag,+ bụ́ onye na-ebuso ndị Juu iro.+ 11  Eze wee gaa n’ihu ịgwa Heman, sị: “E nyewo gị ọlaọcha+ ahụ, nyekwa gị ndị ahụ, ime ha ihe ọ bụla masịrị gị.”+ 12  E wee kpọkọta ndị odeakwụkwọ eze+ n’ọnwa mbụ, n’abalị nke iri na atọ ya, e dekwara+ iwu niile Heman nyere ndị setrap eze na ndị gọvanọ na-achị ógbè dị iche iche,+ ndị isi nke ndị dị iche iche, nke ógbè ọ bụla, otú ha si ede ihe,+ ndị nke ọ bụla n’asụsụ ha; e dere ya n’aha+ Eze Ahazuirọs, jirikwa mgbaaka eze ji aka ihe akara kaa ya akara.+ 13  E nyere ndị na-ebu ozi+ akwụkwọ ozi ahụ, ha wee wegara ya ógbè niile eze na-achị, ka ha bibie, gbuo ma laa ndị Juu niile n’iyi, ma nwa okorobịa ma agadi, ma ụmụntakịrị ma ndị inyom, n’otu ụbọchị,+ n’abalị iri na atọ n’ọnwa iri na abụọ, ya bụ, ọnwa Eda,+ ka a kwakọrọkwa ihe ha.+ 14  A na-akpọsara ndị niile ihe dị n’akwụkwọ ozi ahụ nke a ga-enye dị ka iwu+ n’ógbè niile dị iche iche,+ ka ha dịrị njikere maka ụbọchị a. 15  Ndị ahụ na-ebu ozi gawara, jiri ọsọ gawa+ n’ihi okwu eze, e tikwara iwu ahụ na Shushan+ bụ́ obí eze. Eze na Heman wee nọdụ ala ṅụwa mmanya;+ ma obodo Shushan+ nọ n’ọgba aghara.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji