Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ekliziastis 9:1-18

9  Etinyekwara m ihe a dum n’obi m, ọbụna iji chọpụta ihe a dum,+ na ndị ezi omume na ndị maara ihe na ọrụ ha dị n’aka ezi Chineke.+ Ụmụ mmadụ amaghị banyere ịhụnanya ma ọ bụ ịkpọasị dum nke dị tupu a mụọ ha.+  Ọ bụ otu ihe ahụ ka mmadụ niile nwere.+ Otu ihe ndabara ahụ na-adabara+ onye ezi omume+ na onye ajọ omume,+ ezi mmadụ na onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ àjà na onye na-adịghị achụ àjà. Otú ọ na-adịrị ezi mmadụ ka ọ na-adịrị onye mmehie;+ otú ọ na-adịrị onye na-aṅụ iyi ka ọ na-adịrị onye na-atụ ịṅụ iyi egwu.+  Nke a bụ ọdachi dị n’ihe niile e meworo n’okpuru anyanwụ, na obi ụmụ mmadụ jupụtara n’ihe ọjọọ+ n’ihi na ọ bụ otu ihe ndabara ahụ na-adabara mmadụ niile;+ nzuzu+ dịkwa n’obi ha n’oge ndụ ha, ya gasịa, ha aghọọ ndị nwụrụ anwụ!+  N’ihi na onye ọ bụla nke so ná ndị niile dị ndụ nwere nchekwube, n’ihi na nkịta+ dị ndụ ka ọdụm+ nwụrụ anwụ mma.  N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ;+ ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị,+ ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ, n’ihi na e chefuwo ihe niile a pụrụ icheta banyere ha.+  Ịhụnanya ha na ịkpọasị ha na ekworo ha alaworị n’iyi,+ ọ dịkwaghị òkè ha nwere ruo mgbe ebighị ebi n’ihe ọ bụla a ga-eme n’okpuru anyanwụ.+  Gaa jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa obi aṅụrị ṅụọ mmanya gị,+ n’ihi na ezi Chineke nwere obi ụtọ n’ọrụ gị.+  Ka uwe gị na-acha ọcha+ mgbe niile, ka mmanụ gharakwa ịkọ n’isi gị.+  Ka gị na nwunye gị ị hụrụ n’anya+ kporie ndụ n’ụbọchị niile nke ndụ gị bụ́ ihe efu nke Chineke nyere gị n’okpuru anyanwụ, n’ụbọchị gị niile bụ́ ihe efu, n’ihi na ọ bụ ya bụ òkè gị ná ndụ+ nakwa n’ọrụ ị gbalịsiri ike na-arụ n’okpuru anyanwụ. 10  Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum+ mee ha, n’ihi na ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma+ ma ọ bụ amamihe+ adịghị na Shiol,+ ebe ị na-aga.+ 11  M wee tụgharịa uche ọzọ hụ n’okpuru anyanwụ na ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ,+ ọ bụghịkwa ndị dị ike na-emeri n’agha,+ ọ bụghịkwa ndị maara ihe na-enweta ihe oriri,+ ọ bụghịkwa ndị nwere nghọta na-enweta akụnụba,+ ọ bụghịkwa ndị nwere amamihe na-enweta ihu ọma;+ n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.+ 12  N’ihi na mmadụ+ adịghị ama oge ya.+ Dị nnọọ ka azụ̀ e ji ụgbụ ọjọọ+ jide, dịkwa ka nnụnụ a nwụdere n’ọnyà,+ otú ahụ ka a na-amata ụmụ mmadụ n’ọnyà n’oge ọdachi,+ mgbe ọ na-adakwasị ha na mberede.+ 13  Ihe a ka m hụkwara banyere amamihe n’okpuru anyanwụ, ọ bụkwaara m oké ihe: 14  E nwere otu obodo nta, ndị bi n’ime ya dịkwa ole na ole; otu eze ukwu bịara ebe ahụ, o wee gbaa ya gburugburu, maakwa nnukwu ékpè+ ka o wee buso ya agha. 15  E nwekwara otu nwoke nọ n’ime ya, bụ́ ogbenye kama ọ maara ihe, onye a wee jiri amamihe+ ya napụta obodo ahụ. Ma ọ dịghị onye chetara ogbenye ahụ.+ 16  Mụ onwe m wee sị: “Amamihe dị mma karịa ịdị ike;+ ma a na-eleda amamihe onye ogbenye anya, a dịghịkwa aṅa ntị n’okwu ya.”+ 17  A na-anụ okwu ndị maara ihe+ ji nwayọọ kwuo karịa mkpu onye na-achị achị n’etiti ndị nzuzu+ na-eti. 18  Amamihe dị mma karịa ngwá ọgụ, naanị otu onye mmehie pụkwara ibibi ọtụtụ ihe ọma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji