Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ekliziastis 8:1-17

8  Ònye dị ka onye maara ihe?+ Ònyekwa maara nkọwa ihe?+ Amamihe mmadụ na-eme ka ihu ya na-egbu maramara, ọbụna ihu ya nke gbarụrụ agbarụ na-agbachapụkwa.+  Ana m asị: “Debe iwu eze,+ meekwa ya n’ihi iyi ị ṅụrụ n’ihu Chineke.+  Emela ọsọ ọsọ isi n’ihu ya pụọ.+ Etinyela aka n’ihe ọjọọ.+ N’ihi na ọ bụ ihe niile masịrị ya ka ọ ga-eme,+  n’ihi na okwu eze dị ike;+ ònyekwa nwere ike ịsị ya: ‘Gịnị ka ị na-eme?’”  Ihe ọjọọ ọ bụla agaghị abịara onye na-edebe iwu,+ obi nke maara ihe ga-ama ma oge ma ikpe.+  E nwere oge nakwa ikpe maka ihe niile,+ n’ihi na ọdachi nke na-adakwasị ụmụ mmadụ dị ọtụtụ.+  N’ihi na ọ dịghị onye maara ihe ga-eme,+ n’ihi na ònye pụrụ ịgwa ya otú ọ ga-esi mee?  E nweghị mmadụ nwere ike n’ebe mmụọ dị ijichi mmụọ ya;+ o nweghịkwa ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya;+ ọ dịghịkwa onye a na-agụpụ n’agha ahụ.+ Ajọ omume agaghịkwa emere ndị na-emikpu onwe ha n’ime ya ụzọ mgbapụ.+  Ihe a dum ka m hụworo, m wee jiri obi m tụlee ọrụ niile a rụworo n’okpuru anyanwụ, n’oge mmadụ chịworo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.+ 10  Ma, n’agbanyeghị na ọ dị otú a, ahụwo m ka a na-eli ndị ajọ omume,+ ahụwokwa m otú ha si abata na otú ha si apụ n’ebe nsọ,+ e wee chefuo ha n’obodo nke ha nọ na ya mee ihe ọjọọ.+ Nke a kwa bụ ihe efu. 11  Ọ bụ n’ihi emeghị ihe e kpere n’ikpe ngwa ngwa+ banyere ọrụ ọjọo mere obi ji kaa ụmụ mmadụ nke ukwuu ime ihe ọjọọ.+ 12  Ọ bụ ezie na onye mmehie pụrụ ịnọ na-eme ihe ọjọọ+ otu narị ugboro ma nọruo ogologo oge na-eme otú masịrị ya, ma mụ onwe m makwaara na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu ezi Chineke mma,+ n’ihi na ha tụrụ egwu ya.+ 13  Ma ọ gaghị adịrị onye ajọ omume mma ma ọlị,+ ọ gaghịkwa eme ka ụbọchị ndụ ya, nke dị ka onyinyo,+ dị ogologo, n’ihi na ọ dịghị atụ egwu Chineke.+ 14  E nwere ihe efu a na-eme n’ụwa, na e nwere ndị ezi omume ihe na-eme dị ka à ga-asị na ha na-arụ ọrụ ndị ajọ omume,+ e nwekwara ndị ajọ omume ihe na-eme dị ka à ga-asị na ha na-arụ ọrụ ndị ezi omume.+ Asịrị m na nke a kwa bụ ihe efu. 15  Mụ onwe m sịrị na ịṅụrị ọṅụ dị mma,+ n’ihi na ụmụ mmadụ enweghị ihe ọzọ dị mma n’okpuru anyanwụ karịa iri ihe na ịṅụ ihe na ịṅụrị ọṅụ, na ọ ga-abụkwa òkè ha n’ọrụ ha gbalịsiri ike na-arụ n’ụbọchị ndụ ha,+ nke ezi Chineke nyere ha n’okpuru anyanwụ.+ 16  N’ihi ihe a, m ji obi m+ na-achọ amamihe, ka m hụkwa ọrụ a na-arụ n’ụwa,+ n’ihi na e nwere onye ụra na-adịghị aga n’anya, ma ọ̀ bụ n’ehihie ma ọ bụ n’abalị.+ 17  M wee hụ ọrụ niile nke ezi Chineke,+ otú ụmụ mmadụ na-enweghị ike ịchọpụta ọrụ a rụworo n’okpuru anyanwụ;+ n’agbanyeghị otú ụmụ mmadụ na-agbalịsi ike ịchọ ya, ha adịghị achọpụta ya.+ Ọ bụrụgodị na ha asị na amamihe ha zuuru ha ịmata ya,+ ha agaghị enwe ike ịchọpụta ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji