Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ekliziastis 6:1-12

6  Ọ dị ọdachi m hụworo n’okpuru anyanwụ, ọ na-emekarịkwa n’etiti ụmụ mmadụ:  mmadụ nke ezi Chineke nyere akụ̀ na ihe onwunwe na ebube,+ onye ọ na-adịghịkwa ihe ọ bụla gụrụ ya agụụ nke kọrọ mkpụrụ obi ya,+ ma ezi Chineke emeghị ka o nwee ike iri ya,+ n’agbanyeghị na onye mba ọzọ+ pụrụ iri ya. Nke a bụ ihe efu, ọ bụkwa ọrịa ọjọọ.  Ọ bụrụ na mmadụ amụọ otu narị ụmụ,+ ya adịkwa ndụ ruo ọtụtụ afọ, afọ ndụ ya ewee dị ọtụtụ,+ ma mkpụrụ obi ya enwetaghị afọ ojuju n’ihe ọma,+ ọbụna ili erughị ya aka,+ m ga-asị na nwa nwụrụ n’afọ ka ya mma.+  N’ihi na ọ bụ n’efu ka a mụrụ nwa ahụ, ọ bụkwa n’ọchịchịrị ka ọ na-ala, ọchịchịrị ga-ekpuchi aha ya.+  Ọ hụghịdị anyanwụ, ọ maghịkwa ya.+ O nwere ezumike karịa onye nke ọzọ.+  A sịgodị na ọ dịwo ndụ otu puku afọ okpukpu abụọ ma ọ hụghị ihe ọma,+ ọ́ bụghị n’otu ebe ahụ ka mmadụ niile na-aga?+  Ọrụ niile ụmụ mmadụ na-arụsi ike bụ maka ọnụ ha,+ ma afọ adịghị eju ọbụna mkpụrụ obi ha.  N’ihi na olee ihe onye maara ihe ji kara onye nzuzu mma?+ Gịnị ka onye nọ n’ahụhụ na-erite n’ịmara otú e si eje ije n’ihu ndị dị ndụ?  Iji anya hụ ihe dị mma karịa ịwagharị n’agụụ na-agụ mkpụrụ obi.+ Nke a kwa bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.+ 10  Ihe ọ bụla nke dị adị, a kpọworị ya aha, a marawokwa ihe mmadụ bụ;+ o nweghịkwa ike ịrụ onye ka ya ike ụka.+ 11  Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe na-akpata ihe efu dị ukwuu,+ gịnị bụ uru mmadụ na-erite? 12  N’ihi na ònye maara ihe ọma mmadụ ga-enweta ná ndụ+ n’ime ụbọchị niile nke ndụ ya nke bụ́ ihe efu, ebe ha na-agafe dị ka onyinyo?+ N’ihi na ònye pụrụ ịkọrọ mmadụ ihe ga-eme n’okpuru anyanwụ mgbe ọ na-anọkwaghị?+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji