Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ekliziastis 2:1-26

2  Mụ onwe m kwuru n’obi m,+ sị: “Bịa, ka m jiri ịṅụrị ọṅụ nwalee gị.+ Hụkwa ihe ọma.”+ Ma, lee! nke ahụ kwa bụ ihe efu.  Asịrị m ọchị: “Ara ọgbụgba!”+ sịkwa aṅụrị:+ “Gịnị ka ihe a na-eme?”  Eji m obi m mee nnyocha site n’iji mmanya+ mee onwe m obi ụtọ, mgbe m ji amamihe+ na-eduzi obi m, ọbụna izuzu nzuzu ruo mgbe m hụrụ uru ụmụ mmadụ ritere n’ihe ha ji ụbọchị ndụ+ ha mee n’okpuru eluigwe.  Arụrụ m ọtụtụ ọrụ ka ukwuu.+ Ewuuru m onwe m ọtụtụ ụlọ;+ akọọrọ m onwe m ọtụtụ ubi vaịn.+  Akọọrọ m onwe m ọtụtụ ubi,+ rụọkwa ogige ọma dị iche iche, akụkwara m ụdị osisi niile na-amị mkpụrụ n’ime ha.  Arụụrụ m onwe m ọdọ mmiri dị iche iche,+ ka ha na-ede oké ọhịa nke na-epu osisi dị iche iche mmiri.+  Enwetara m ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi,+ enwekwara m ndị na-eje ozi a mụrụ n’ụlọ m.+ Enwekwara m anụ ụlọ, ehi na ìgwè ewu na atụrụ dị ukwuu, karịa ndị niile dịrị ndụ na Jeruselem+ tupu mụ onwe m.  Akpakọbaara m onwe m ọlaọcha na ọlaedo,+ kpakọbakwa ihe onwunwe e ji amata ndị eze na ógbè dị iche iche a na-achị achị.+ Enwetara m ndị ikom na-abụ abụ na ndị inyom na-abụ abụ+ nakwa ihe na-enye ụmụ mmadụ obi ụtọ dị ukwuu,+ ya bụ, nwaanyị, ọbụna ụmụ nwaanyị.+  Aghọrọ m onye ukwu, baakwa ọgaranya karịa onye ọ bụla dịrị ndụ na Jeruselem+ tupu mụ onwe m. M ka nwekwara amamihe m.+ 10  Ọ dịghịkwa ihe ọ bụla anya m chọrọ nke m na-enyeghị ya.+ Ọ dịghị ụdị aṅụrị ọ bụla m gbochiri obi m inwe, n’ihi na obi m ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ịrụsi ọrụ ike m niile,+ nke a bụkwa ihe m ketara n’ịrụsi ọrụ ike m niile.+ 11  Mụ onwe m tụgharịrị lee ọrụ niile aka m rụrụ, leekwa ọrụ m gbalịsiri ike rụọ,+ ma, lee! ihe niile bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe,+ ọ dịghịkwa ihe ọ bụla bara uru n’okpuru anyanwụ.+ 12  Mụ onwe m tụgharịkwara ka m hụ amamihe+ na nzuzu na iberiibe;+ n’ihi na ọ bụ gịnị ka mmadụ nke ga-anọchi eze ga-emeli? Ọ bụ ihe ndị mmadụ merela eme. 13  Mụ onwe m wee hụ na amamihe bara uru karịa iberiibe,+ dị nnọọ ka ìhè bara uru karịa ọchịchịrị.+ 14  Anya onye ọ bụla nke maara ihe na-adị ya n’isi;+ ma onye nzuzu na-ejegharị n’oké ọchịchịrị.+ Amatawo m, ọbụna mụ onwe m, na ọ bụ otu ihe ndabara na-adabara ha niile.+ 15  Mụ onwe m kwukwara n’obi m,+ sị: “Ụdị ihe na-adabara onye nzuzu+ ga-adabara m, ee, mụ onwe m.”+ Gịnịzi mere m ji bụrụ onye maara ihe gabiga ókè+ n’oge ahụ? M wee kwuo n’obi m, sị: “Nke a kwa bụ ihe efu.” 16  N’ihi na a gaghị echeta onye maara ihe, dịkwa ka a na-agaghị echeta onye nzuzu ruo mgbe ebighị ebi.+ N’oge na-adịghị anya, a na-echefu mmadụ niile; oleekwa otú onye maara ihe ga-esi anwụ? Ọ ga-anwụ dị nnọọ ka onye nzuzu.+ 17  Akpọkwara m ndụ asị,+ n’ihi na ọrụ a rụworo n’okpuru anyanwụ bụ ọrụ ahụhụ dị ka m si ele ihe anya,+ n’ihi na ihe niile bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.+  18  Mụ onwe m kpọkwara ọrụ niile m nọ na-arụsi ike n’okpuru anyanwụ asị,+ nke bụ́ ihe m ga-ahapụrụ onye ga-anọchi m.+ 19  Ònye makwanụ ma ọ̀ ga-abụ onye maara ihe ka ọ̀ ga-abụ onye nzuzu?+ N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ya ga-eweghara ihe niile si n’ọrụ m rụsiri ike bụ́ nke m ji gosi na m nwere amamihe n’okpuru anyanwụ.+ Nke a kwa bụ ihe efu. 20  Mụ onwe m tụgharịrị wee daa mbà n’obi+ n’ihi ọrụ niile m gbalịsiri ike rụọ n’okpuru anyanwụ. 21  N’ihi na e nwere onye ji amamihe na ihe ọmụma na nkà rụsie ọrụ ike,+ ma, ọ bụ onye na-arụsighị ọrụ ike na ya ka a ga-enye ihe onye ahụ nwere.+ Nke a kwa bụ ihe efu, bụrụkwa oké ọdachi.+ 22  Gịnị ka mmadụ na-enweta n’ọrụ niile ọ na-arụsi ike nakwa n’ihe obi ya na-achọsi ike, bụ́ ihe mere o ji na-arụsi ọrụ ike n’okpuru anyanwụ?+ 23  N’ihi na ọrụ ọ rụrụ n’ụbọchị ndụ ya niile wetaara ya ihe mgbu na mkpasu iwe,+ n’abalị kwa, obi anaghị ezu ya ike.+ Nke a kwa bụ naanị ihe efu. 24  Ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, meekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.+ Mụ onwe m ahụwo nke a, na o si n’aka ezi Chineke.+ 25  N’ihi na ònye na-eri ihe,+ na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ karịa m?+ 26  N’ihi na o nyewo onye bụ́ ezi mmadụ n’ihu ya+ amamihe na ihe ọmụma na aṅụrị,+ ma o nyewo onye mmehie ọrụ ịchịkọta ihe na ikpokọta ihe naanị ka o bunye ha onye bụ́ ezi mmadụ n’ihu ezi Chineke.+ Nke a kwa bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji