Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ekliziastis 1:1-18

1  Okwu onye mkpọkọta,+ nwa Devid, bụ́ eze na Jeruselem.+  “Ihe efu kasị ihe efu niile!”+ ka onye mkpọkọta kwuru, “ihe efu kasị ihe efu niile! Ihe niile bụ ihe efu!”+  Olee uru mmadụ na-erite n’ọrụ niile ọ gbalịsiri ike rụọ+ n’okpuru anyanwụ?+  Otu ọgbọ na-ala,+ ọgbọ ọzọ na-abịakwa;+ ma ụwa na-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi.+  Anyanwụ awawo, anyanwụ adawokwa,+ ọ na-ekusikwa ume ike wee na-abịaghachi n’ọnọdụ ya bụ́ ebe ọ ga-esi waa.+  Ifufe na-efega n’ebe ndịda, ọ na-efekwa gburugburu ruo n’ebe ugwu.+ Ọ na-efe gburugburu mgbe niile,+ ifufe na-efekwa gburugburu laghachi kpọmkwem n’ụzọ ya.+  Iyi niile+ na-asọba n’oké osimiri,+ ma oké osimiri adịghị eju eju.+ N’ebe iyi si asọpụta, n’ebe ahụ ka ọ na-asọghachi ka o wee sọpụta.+  Ihe niile na-agwụ ike;+ ọ dịghị onye nwere ike ịkọwa ha. Afọ adịghị eju anya ịhụ ihe,+ afọ adịghịkwa eju ntị ịnụ ihe.+  Ihe ọ bụla nke dị adị, ọ bụ ya ga-adị;+ ihe ọ bụla e mewokwara, ọ bụ ya ka a ga-eme; ọ dịghịkwa ihe bụ́ ihe ọhụrụ n’okpuru anyanwụ.+ 10  Ọ̀ dị ihe ọ bụla dịnụ nke mmadụ ga-ekwu banyere ya, sị: “Lee ihe a; ọ bụ ihe ọhụrụ”? Ọ dịbu adị malite mgbe a na-amaghị ama;+ ihe dị adị adịwala tupu a mụọ anyị.+ 11  A dịghị echeta ndị oge gboo, a gaghịkwa echeta ndị a ka ga-amụ amụ.+ A gaghị echeta ha ọbụna n’etiti ndị a ka ga-amụ n’ọdịnihu.+ 12  Mụ onwe m, bụ́ onye mkpọkọta, bụ eze Izrel n’ime Jeruselem.+ 13  M wee tinye obi m n’ịchọ amamihe+ nakwa n’inyocha ya n’ihe niile e meworo n’okpuru eluigwe, ya bụ, ọrụ ahụhụ Chineke nyere ụmụ mmadụ ka ha na-arụ.+ 14  Ahụrụ m ọrụ niile a rụrụ n’okpuru anyanwụ,+ ma, lee! ihe niile bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.+ 15  A pụghị ime ka ihe gbagọrọ agbagọ kwụrụ ọtọ,+ a pụghịkwa ịgụ ihe na-adịghị adị ọnụ. 16  Mụ onwe m kwuru n’obi m,+ sị: “Lee! Mụ onwe m enwekwuola amamihe nke ukwuu karịa onye ọ bụla dịworo ndụ tupu mụ onwe m na Jeruselem,+ obi m nwetakwara amamihe na ihe ọmụma dị ukwuu.”+ 17  M wee tinye obi m n’ịmata ihe bụ́ amamihe na ịmata ihe bụ́ nzuzu,+ amatawokwa m ihe bụ́ iberiibe,+ na nke a kwa bụ ịchụso ifufe.+ 18  N’ihi na n’ebe amamihe dị ukwuu, mkpasu iwe na-adị ukwuu,+ nke mere na onye na-enwetakwu ihe ọmụma na-enwetakwu ihe mgbu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji