Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Daniel 4:1-37

4  “Nke a bụ ozi Nebukadneza bụ́ eze na-ezigara ndị niile, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, bụ́ ndị bi n’elu ụwa dum:+ Udo dịrị unu nke ukwuu.+  Ọ dị m mma ịkpọsa ihe ịrịba ama na ihe ebube Chineke bụ́ Onye Kasị Elu meere m.+  Lee ka ihe ịrịba ama ya si dị ukwuu, leekwa ka ihe ebube ọ na-eme si dị ukwuu!+ Alaeze ya bụ alaeze na-adịru mgbe ebighị ebi,+ ọchịchị ya na-adịkwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+  “Mụ onwe m, bụ́ Nebukadneza, nọ n’ụlọ m, obi rukwara m ala,+ m nọkwa na-enwe ihe ịga nke ọma n’obí m.+  Arọrọ m nrọ, o wee mee ka m tụọ egwu.+ E nwere ihe m hụrụ mgbe m dina n’elu ihe ndina m nakwa ọhụụ m hụrụ bụ́ ndị mere ka m tụọ ụjọ.+  M wee tie iwu ka a kpọta ndị amamihe niile nke Babịlọn n’ihu m, ka ha kọọrọ m isi nrọ ahụ.+  “N’oge ahụ, ndị dibịa anwansi, ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ, ndị Kaldia+ na ndị na-agụ kpakpando+ batara; m wee kọọrọ ha nrọ m rọrọ, ma ha akọghịrị m isi ya.+  N’ikpeazụ, Daniel, onye aha ya bụ Belteshaza+ dị ka aha chi m si dị,+ onye mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ dịkwa n’ime ya,+ batara n’ihu m; m wee kọọrọ ya nrọ ahụ, sị:  “‘Belteshaza, onyeisi nke ndị dibịa anwansi,+ ebe m maara nke ọma na mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ dị n’ime gị+ nakwa na ọ dịghị ihe nzuzo ọ bụla na-esiri gị ike,+ gwa m ọhụụ m hụrụ mgbe m na-arọ nrọ, kọọkwara m isi ha.+ 10  “‘M nọ na-ahụ ọhụụ mgbe m dina n’elu ihe ndina m,+ ma, lee! e nwere otu osisi+ nke dị n’etiti ụwa, ịdị elu ya dịkwa ukwuu.+ 11  Osisi ahụ toro wee sie ike, ịdị elu ya mechara ruo eluigwe, a na-anọkwa na nsọtụ ụwa dum ahụ ya.+ 12  Akwụkwọ ya mara mma, mkpụrụ ya dịkwa ọtụtụ, ihe oriri nke na-ezuru ihe niile dịkwa n’elu ya. Anụ ọhịa+ na-anọ na ndò dị n’okpuru ya,+ ọ bụkwa n’alaka ya ka anụ ufe nke eluigwe bi,+ anụ ahụ́ niile na-erikwa ihe si na ya. 13  “‘M nọ na-ahụ ọhụụ mgbe m dina n’elu ihe ndina m, ma, lee! onye nche,+ bụ́ onye nsọ,+ si n’eluigwe na-agbadata. 14  O ji oké olu na-eti mkpu, nke a bụkwa ihe ọ nọ na-ekwu: “Gbutuonụ osisi ahụ,+ gbukapụsịanụ alaka ya. Gbụchasịanụ akwụkwọ ya, tụsasịanụ mkpụrụ ya. Ka anụ ọhịa gbapụsịa n’okpuru ya, ka anụ ufe sikwa n’alaka ya fepụsịa.+ 15  Otú ọ dị, hapụnụ úkwù osisi ahụ n’ala, keekwanụ ya agbụ ígwè na agbụ ọla kọpa, ka ọ dịrị n’etiti ahịhịa dị n’ọhịa; ka igirigi nke eluigwe dee ya, ka ya na anụ ọhịa nọrọ n’etiti ahịhịa dị n’ala.+ 16  Ka a gbanwee obi ya ka ọ ghara ịbụkwa obi mmadụ, ka e nyekwa ya obi anụ ọhịa,+ ka oge asaa+ gabiga n’isi ya. 17  Ọ bụ ndị nche+ nyere iwu a; ọ bụkwa ndị nsọ kwuru ka e mee ihe a; ka ndị dị ndụ wee mara na Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ,+ ọ bụkwa onye ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya,+ ọ na-emekwa ka onye kasị ala n’etiti ụmụ mmadụ na-achị ya.”+ 18  “‘Ọ bụ nke a bụ nrọ mụ onwe m bụ́ Eze Nebukadneza rọrọ; gị onwe gị, Belteshaza, kọọrọ m isi ya, ebe ọ bụ na ndị amamihe niile ọzọ nọ n’alaeze m enweghị ike ịkọrọ m isi ya.+ Ma i nwere ike ịkọ ya, n’ihi na mmụọ nke chi dị iche iche dị nsọ dị n’ime gị.’+ 19  “N’oge ahụ, o jutụrụ Daniel, onye aha ya bụ Belteshaza,+ anya, ihe dị ya n’uche menyekwara ya ụjọ.+ “Eze wee sị, ‘Belteshaza, ekwela ka nrọ ahụ na nkọwa ya menye gị ụjọ.’+ “Belteshaza wee sị, ‘Onyenwe m, ka nrọ ahụ mezuo n’isi ndị kpọrọ gị asị, ka nkọwa ya mezuokwa n’isi ndị iro gị.+ 20  “‘Osisi ahụ ị hụrụ, nke toro wee gbaa agba ma sie ike, nke ịdị elu ya mechara ruo n’eluigwe, nke a na-ahụkwa n’elu ụwa dum,+ 21  nke akwụkwọ ya mara mma, nke mkpụrụ ya dịkwa ọtụtụ, nke ihe oriri nke na-ezuru ihe niile dị n’elu ya; nke anụ ọhịa niile bi n’okpuru ya, nke anụ ufe nke eluigwe bikwa n’alaka ya,+ 22  bụ gị, eze,+ n’ihi na ị dịwo ukwuu ma dị ike, ebube gị adịwokwa ukwuu ma ruo n’eluigwe,+ ọchịchị gị eruwokwa nsọtụ niile nke ụwa.+ 23  “‘Ebe ọ bụ na Eze hụrụ onye nche, bụ́ onye nsọ,+ nke si n’eluigwe na-agbadata, bụ́ onye nọkwa na-asị: “Gbutuonụ osisi ahụ, bibiekwanụ ya. Otú ọ dị, hapụnụ úkwù ya n’ala, ma keenụ ya agbụ ígwè na agbụ ọla kọpa, ka ọ dịrị n’etiti ahịhịa dị n’ọhịa, ka igirigi nke eluigwe dee ya, ka ya na anụ ọhịa nọrọ ruo mgbe oge asaa gabigara n’isi ya,”+ 24  eze, nke a bụ nkọwa ya, ihe Onye Kasị Elu+ kwuru+ ga-adakwasị onyenwe m eze.+ 25  A ga-achụpụ gị n’etiti ụmụ mmadụ, gị na anụ ọhịa ga-ebikwa,+ ọ bụkwa ahịhịa ka ha ga na-enye gị ka ị taa dị ka ehi;+ igirigi nke eluigwe ga na-edekwa gị, oge asaa+ ga-agabigakwa n’isi gị, ruo mgbe ị matara na Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ+ nakwa na ọ bụ onye ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya.+ 26  “‘Ebe ọ bụ na ha kwuru ka a hapụ úkwù osisi ahụ,+ ị ga-enwetaghachi alaeze gị mgbe ị matara na Chineke nke nọ n’eluigwe na-achị achị.+ 27  Ya mere, eze, ka ndụmọdụ m dị mma n’anya gị,+ wepụ mmehie gị site n’ime ezi omume,+ wepụkwa ajọ omume gị site n’imere ndị ogbenye ebere.+ Ikekwe, a ga-eme ka ihe gaziere gị ruo ogologo oge.’”+ 28  Ihe a dum dakwasịrị Nebukadneza bụ́ eze.+ 29  Mgbe ọnwa iri na abụọ gachara, ọ nọ na-agagharị n’obí ya dị na Babịlọn. 30  Eze wee sị:+ “Nke a ọ́ bụghị Babịlọn Ukwu ahụ, nke mụ onwe m ji nnukwu ike m wuo+ ka ọ bụrụ ebe obibi eze nakwa iji mee ka ebube m dị ukwuu?”+ 31  Ka eze ka kpụ okwu a n’ọnụ, otu olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Eze Nebukadneza, a na-agwa gị, sị, ‘Alaeze esiwo n’aka gị pụọ,+ 32  a na-achụpụkwa gị n’etiti ụmụ mmadụ, gị na anụ ọhịa ga-ebikwa.+ A ga-enye gị ahịhịa ka ị na-ata dị ka ehi, oge asaa ga-agabigakwa n’isi gị, ruo mgbe ị matara na Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ nakwa na ọ bụ onye ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya.’”+ 33  Ozugbo ahụ,+ okwu ahụ mezuru n’isi Nebukadneza, a chụpụrụ ya n’etiti ụmụ mmadụ, o wee malite ịta ahịhịa dị ka ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ́ ya ruo mgbe ntutu isi ya toro ogologo dị ka ábụ́bà ugo, mbọ́ ya etookwa dị ka mbọ́ nnụnụ.+ 34  “Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị,+ mụ onwe m, bụ́ Nebukadneza, weliri anya lee eluigwe,+ anya wee malite ido m; m wee gọzie Onye Kasị Elu,+ m nyekwara Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi otuto, jaakwa ya mma,+ n’ihi na ọchịchị ya bụ ọchịchị nke na-adịru mgbe ebighị ebi, alaeze ya na-adịkwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+ 35  A na-ewere ndị niile bi n’ụwa dị ka ndị na-enweghị ihe ha bụ,+ ọ na-emekwa ihe bụ́ uche ya n’etiti ndị bi n’eluigwe na ndị bi n’ụwa.+ Ọ dịghịkwa onye pụrụ igbochi aka ya+ ma ọ bụ onye pụrụ ịsị ya, ‘Gịnị ka ị na-eme?’+ 36  “N’otu oge ahụ, anya malitere ido m ka m wee nwetaghachi ùgwù alaeze m, ebube m na ịma mma m;+ ndị na-ejere m ozi, bụ́ ndị ọkwá ha dị elu na ndị ukwu m, malitere ịchọsi m ike, e nyeghachiri m alaeze m, e mekwara ka m dịkwuo nnọọ ukwuu.+ 37  “Ugbu a, mụ onwe m, Nebukadneza, na-eto ma na-ebuli Eze eluigwe elu, na-ajakwa ya mma,+ n’ihi na ọrụ ya niile bụ eziokwu, ụzọ ya niile bụkwa ikpe ziri ezi,+ nakwa n’ihi na o nwere ike iweda ndị ji mpako na-eje ije ala.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji