Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Daniel 2:1-49

2  N’afọ nke abụọ nke ọchịchị Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ;+ o nyekwara ya nsogbu na mmụọ,+ ụra wee gbafuo ya n’anya.  Eze wee kwuo ka a kpọọ ndị dibịa anwansi+ na ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ na ndị dibịa afa na ndị Kaldia ka ha bịa kọọrọ eze nrọ ọ rọrọ.+ Ha wee bata guzo n’ihu eze.  Eze wee sị ha: “Ọ dị nrọ m rọrọ, ọ na-enyekwa m nsogbu na mmụọ nke mere m ji chọọ ịmara nrọ ahụ.”  Ndị Kaldia wee gwa eze okwu n’asụsụ Arameik,+ sị: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.+ Kọọrọ ndị ohu gị nrọ gị, anyị ga-akọkwara gị isi ya.”+  Eze wee gwa ndị Kaldia, sị: “M na-eti iwu, sị: Ọ bụrụ na unu akọghịrị m nrọ ahụ, kọọkwara m isi ya, a ga-abọkasị+ unu, a ga-emekwa ka ụlọ unu ghọọ ebe ọha mmadụ ga na-aga mposi.+  Ma ọ bụrụ na unu akọọrọ m nrọ ahụ, kọọkwara m isi ya, m ga-enye unu onyinye na ụgwọ ọrụ, kwanyekwara unu ùgwù nke ukwuu.+ Ya mere, kọọrọnụ m nrọ ahụ, kọọkwaranụ m isi ya.”  Ha wee kwuo nke ugboro abụọ, sị: “Ka eze kọọrọ ndị ohu ya nrọ ahụ, anyị ga-akọkwara ya isi ya.”  Eze wee sị: “N’ezie, ama m na ihe unu na-eme bụ ka oge na-aga, n’ihi na unu maara na ọ dị iwu m tiri.  N’ihi na ọ bụrụ na unu akọghịrị m nrọ ahụ, ihe a m kwuru+ ga-emezurịrị n’isi unu. Ma unu ekwekọrịtawo ịghara m ụgha na ịgwa m ihe na-ezighị ezi+ ruo mgbe ihe gbanwere. N’ihi ya, kọọrọnụ m nrọ ahụ, m ga-amarakwa na unu pụrụ ịkọrọ m isi ya.” 10  Ndị Kaldia ahụ wee sị eze: “Ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’elu ala nke nwere ike ịkọrọ eze ihe a ọ chọrọ, n’ihi na e nwetụbeghị eze ma ọ bụ gọvanọ kwuru ka dibịa anwansi ma ọ bụ onye na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ onye Kaldia mee ihe dị otú a. 11  Ma ihe a eze chọrọ ka anyị mee siri ike, ọ dịghịkwa onye ọ bụla dị ndụ nke pụrụ ịgwa ya eze ma e wezụga ndị bụ́ chi,+ ndị ha na mmadụ na-ebighị ma ọlị.”+ 12  N’ihi nke a, eze were oké iwe, ọnụma jukwara ya obi,+ o wee kwuo ka e gbuo ndị amamihe niile nke Babịlọn.+ 13  E wee nye iwu ka e mee otú ahụ, a nọkwa na-akwado igbu ndị amamihe ahụ; ha wee chọwa Daniel na ndị enyi ya ka e gbuo ha. 14  N’oge ahụ, Daniel ji akọ na ezi uche gwa Arịọk bụ́ onyeisi ndị nche eze okwu,+ bụ́ onye gawara igbu ndị amamihe nke Babịlọn. 15  Ọ gwara Arịọk bụ́ onyeisi ndị nche eze, sị: “Olee ihe mere eze ji nye iwu ọjọọ dị otú a?” Arịọk wee kọọrọ Daniel ihe na-emenụ.+ 16  Daniel wee banye rịọ eze ka o nyetụ ya oge ka o wee kọọrọ eze isi nrọ ya.+ 17  E mesịa, Daniel lara n’ụlọ ya; o wee kọọrọ Hananaya, Mishel na Azaraya, bụ́ ndị enyi ya, ihe na-emenụ, 18  gwakwa ha ka ha rịọ Chineke nke eluigwe+ ka o meere ha ebere+ n’ihe banyere ihe nzuzo a,+ ka ha wee ghara igbu Daniel na ndị enyi ya nakwa ndị amamihe Babịlọn ndị nke ọzọ.+ 19  E wee kpugheere Daniel ihe nzuzo ahụ n’ọhụụ nke abalị.+ Daniel wee gọzie+ Chineke nke eluigwe. 20  Daniel wee sị: “Ka aha Chineke bụrụ ihe a gọziri agọzi+ site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, maka amamihe na ịdị ike ya, n’ihi na ọ bụ ya nwe ha.+ 21  Ọ na-agbanwekwa oge na mgbe a kara aka,+ na-ewepụ ndị eze, na-emekwa ka ndị eze malite ịchị,+ na-enye ndị maara ihe amamihe, na-enyekwa ndị nwere nghọta ihe ọmụma.+ 22  Ọ na-ekpughe ihe ndị miri emi nakwa ihe ndị zoro ezo,+ ọ makwaara ihe dị n’ọchịchịrị;+ ọ bụkwa n’ebe ọ nọ ka ìhè bi.+ 23  Ọ bụ gị, Chineke nke ndị nna nna m, ka m na-enye otuto ma na-aja mma,+ n’ihi na i nyewo m amamihe+ na ike. Ugbu a, i mewo ka m mara ihe anyị rịọrọ gị, n’ihi na i mewo ka anyị mara ihe eze chọrọ.”+ 24  N’ihi nke a, Daniel gakwuuru Arịọk,+ onye eze họpụtara ka o gbuo ndị amamihe nke Babịlọn.+ Ọ gara wee gwa ya, sị: “Egbula onye ọ bụla n’ime ndị amamihe nke Babịlọn. Kpọrọ m gaa n’ihu eze+ ka m kọọrọ eze isi nrọ ya.” 25  Arịọk wee jiri ọsọ kpọrọ Daniel gaa n’ihu eze, ọ sịkwara ya: “Ahụwo m otu nwoke n’ime ndị Juda a dọtara n’agha,+ bụ́ onye pụrụ ịkọrọ eze isi nrọ ya.” 26  Eze wee sị Daniel, onye aha ya bụ Belteshaza:+ “Ị̀ ga-enwe ike ịkọrọ m nrọ m rọrọ, kọọkwara m isi ya?”+ 27  Daniel wee kwuo n’ihu eze, sị: “Ndị amamihe, ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ, ndị dibịa anwansi na ndị na-agụ kpakpando enweghị ike ịkọrọ eze ihe nzuzo eze chọrọ ka a kọọrọ ya.+ 28  Otú ọ dị, e nwere Chi nọ n’eluigwe, Onye na-ekpughe ihe nzuzo,+ o mewokwa ka Eze Nebukadneza mara ihe gaje ime n’oge ikpeazụ.+ Nke a bụ nrọ ị rọrọ na ọhụụ ị hụrụ mgbe i dina n’elu ihe ndina gị: 29  “Eze, ka gị onwe gị dina n’elu ihe ndina gị,+ ihe gaje ime batara gị n’uche, Onye na-ekpughe ihe nzuzo emewokwa ka ị mara ihe gaje ime.+ 30  Ọ bụghịkwa n’ihi na m nwere amamihe karịa ndị ọzọ dị ndụ ka e ji kpugheere m ihe nzuzo a,+ kama ọ bụ ka e wee kọọrọ eze isi nrọ ya nakwa ka i wee mara ihe dị gị n’obi.+ 31  “Eze, gị onwe gị nọ na-ahụ, ma, lee! e nwere otu nnukwu ihe oyiyi. Ihe oyiyi ahụ, nke buru ibu ma na-egbuke egbuke n’ụzọ na-enweghị atụ, guzo n’ihu gị, ọdịdị ya na-atụkwa ụjọ. 32  E ji ezigbo ọlaedo+ kpụọ isi ihe oyiyi ahụ, jiri ọlaọcha+ kpụọ obi ya na ogwe aka ya, jirikwa ọla kọpa+ kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya, 33  e jikwa ígwè+ kpụọ ogwe ụkwụ ya, jirikwa ígwè na ụrọ+ kpụọ ala ala ụkwụ ya. 34  Ị nọ na-ele anya ruo mgbe a wapụtara otu nkume, nke a na-ejighị aka wapụta,+ o wee kụọ ihe oyiyi ahụ n’ala ala ụkwụ ya ahụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ, wee gwerie ya.+ 35  N’oge ahụ, e gweriri ígwè ahụ, ụrọ ahụ a kpụrụ akpụ, ọla kọpa ahụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ, ha wee dịrị ka igbogbo ọka nke si n’ebe nzọcha mkpụrụ n’oge okpomọkụ,+ ifufe wee buru ha nke mere na a hụkwaghị ha ọzọ ma ọlị.+ Ma nkume ahụ nke kụrụ ihe oyiyi ahụ ghọrọ nnukwu ugwu wee jupụta ụwa dum.+ 36  “Nke a bụ nrọ gị, anyị ga-akọkwa isi ya n’ihu eze.+ 37  Gị onwe gị, eze, bụ́ eze ndị eze, gị onye Chineke nke eluigwe nyeworo alaeze a,+ ike, na ume na ebube, 38  onye o nyefekwara n’aka ya+ anụ ọhịa niile na anụ ufe nke eluigwe n’ebe ọ bụla ụmụ mmadụ bi, onye o mekwara ka ọ na-achị ha niile, ọ bụ gị bụ isi ọlaedo ahụ.+ 39  “Ị chịchaa, alaeze ọzọ+ nke na-aharughị ka nke gị ga-amalite ịchị;+ a ga-enwekwa alaeze ọzọ, bụ́ nke atọ, nke ọla kọpa, nke ga-achị ụwa dum.+ 40  “Ma alaeze nke anọ+ ga-esi ike ka ígwè.+ Ebe ọ bụ na ígwè na-akụri ma na-egweri ihe ọ bụla ọzọ, n’otu ụzọ ahụ, ọ ga-akụri ma gwerie ndị a niile dị ka ígwè nke na-akụri ihe.+ 41  “Ebe ị hụkwara na ihe e ji kpụọ ala ala ụkwụ ya na mkpịsị ụkwụ ya bụ ụrọ ọkpụite ji akpụ ihe nakwa ígwè,+ alaeze ahụ ga-ekewa ekewa,+ ma ọ ga-esitụ ike dị ka ígwè, ebe ọ bụ na ị hụrụ na a gwakọtara ígwè na ụrọ dị mmiri.+ 42  Ma ebe ọ bụ na e ji ígwè nakwa ụrọ kpụọ mkpịsị ụkwụ ya, alaeze ahụ ga-esi ike n’otu aka, ma n’aka nke ọzọ, ọ gaghị esi ike. 43  Ebe ọ bụ na ị hụrụ na a gwakọtara ígwè na ụrọ dị mmiri, ha na ụmụ mmadụ ga-agwakọta; ma ha agaghị anyakọtali ọnụ, otu n’ahụ́ ibe ya, dị nnọọ ka ígwè na ụrọ a kpụrụ akpụ na-adịghị agwakọta. 44  “Ma n’ụbọchị ndị eze ahụ,+ Chineke nke eluigwe+ ga-eme ka otu alaeze+ nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.+ A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ.+ Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa,+ ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi;+ 45  ebe ị hụrụ na e si n’ugwu wapụta otu nkume nke a na-ejighị aka wapụta,+ nakwa na o gwepịara ígwè ahụ, ọla kọpa ahụ, ụrọ ahụ a kpụrụ akpụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ.+ Chineke bụ́ Onye Ukwu+ emewo ka eze mara ihe gaje ime.+ Nrọ a ga-emezu, a pụkwara ịtụkwasị nkọwa ya obi.”+ 46  Eze Nebukadneza wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala ma kwanyere Daniel ùgwù, o kwukwara ka e nye ya onyinye na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.+ 47  Eze wee gwa Daniel, sị: “N’ezie, Chineke unu bụ Chi kasị chi niile+ na Onyenwe ndị eze+ na Onye na-ekpughe ihe nzuzo, ebe i nwere ike ikpughe ihe nzuzo a.”+ 48  Eze wee mee ka Daniel bụrụ onye ukwu,+ o nyekwara ya ọtụtụ nnukwu onyinye, o mekwara ka ọ bụrụ onye na-achị ógbè Babịlọn dum+ a na-achị achị nakwa prifekt bụ́ onyeisi ndị amamihe niile nke Babịlọn. 49  Daniel wee rịọ eze, o wee họpụta Shedrak, Mishak na Abednego+ ka ha na-elekọta ógbè Babịlọn a na-achị achị, ma Daniel nọ n’obí eze.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji