Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Daniel 11:1-45

11  “N’afọ mbụ nke ọchịchị Darayọs onye Midia,+ ebiliri m wee ghọọ onye na-eme ka ọ dị ike nakwa ebe ya e wusiri ike.  Ugbu a, m ga-agwa gị ihe bụ́ eziokwu:+ “Lee! E nwere ndị eze atọ ka ga-ebiliri Peshia,+ nke anọ+ ga-akpakọba akụnụba karịa ndị nke ọzọ niile.+ Ozugbo akụnụba ya mere ka ọ dị ike, ọ ga-akpali ihe niile imegide alaeze Gris.+  “Eze dị ike ga-ebili ma jiri ike dị ukwuu chịa,+ ọ ga-emekwa uche ya.+  Mgbe o bilisịrị,+ a ga-agbaji alaeze ya ma kesaa ya nye ifufe anọ+ nke eluigwe,+ ma ọ bụghị ụmụ ya ka a ga-enye ya,+ ha agaghịkwa eji ụdị ike ahụ o ji chịa na-achị; n’ihi na a ga-efopụ alaeze ya, were ya nye ndị ọzọ na-abụghị ndị a.  “Eze ndịda ga-adị ike, ya bụ, otu n’ime ndị o mere ndị isi; eze ugwu ga-emeri ya ma jiri ike dị ukwuu nke karịrị nke onye ahụ ji chịa na-achị.  “Mgbe afọ ụfọdụ gasịrị, ha ga-ejikọ aka, ada nke eze ndịda ga-abịakwute eze ugwu ka ha nwee nkwekọrịta. Ma ogwe aka ada eze agaghị anọgide na-adị ike;+ eze agaghị eguzoli, ogwe aka ya agaghịkwa eguzoli; a ga-enyefekwa ada eze na ndị kpọtara ya na nwoke mụrụ ya nakwa onye mere ka ọ dị ike n’oge ndị ahụ n’aka ndị ọzọ.  Otu onye nke si n’ome+ nke mgbọrọgwụ ada eze ga-ebili nọchie eze, ọ ga-abịakwutekwa ndị agha ma buso ebe e wusiri ike nke eze ugwu agha, ọ ga-ebusokwa ha agha wee merie ha.  Ọ ga-eburukwa chi ha dị iche iche,+ ihe oyiyi ha a wụrụ awụ nakwa arịa ha dị oké ọnụ ahịa ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo mee, kpụrụkwa ndị ọ dọtara n’agha, laa Ijipt. Ya onwe ya kwa ga-enyere eze ugwu ohere ruo afọ ụfọdụ.  “Ọ ga-abatakwa n’alaeze nke eze ndịda, laghachikwa n’ala ya. 10  “Ma ụmụ ya ga-ejikere ma chịkọta ìgwè ndị agha dị ukwuu. Ọ ga-abịarịrị ma rikpuo ha dị ka idei mmiri ma gafere. Ma ọ ga-alaghachi, ọ ga-ejikere buo agha ruo n’ebe ya e wusiri ike. 11  “Ma eze ndịda ga-akpasu onwe ya iwe, ọ ga-apụkwa buso ya agha, ya bụ, eze ugwu; ọ ga-emekwa ka nnukwu ìgwè mmadụ bilie, a ga-enyefekwa ìgwè mmadụ ahụ n’aka onye ahụ.+ 12  A ga-eburu ìgwè mmadụ ahụ pụọ. Obi ya ga-afụli ya elu,+ ọ ga-emekwa ka iri puku kwuru iri puku mmadụ daa; ma ọ gaghị eji ọnọdụ ya siri ike mee ihe. 13  “Ma eze ugwu ga-alaghachi wee chịkọta ìgwè mmadụ karịrị nke mbụ; mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ya bụ, afọ ụfọdụ, ọ ga-eji ụsụụ ndị agha+ na ngwongwo dị ukwuu bịa.+ 14  N’ime oge ndị ahụ, ọtụtụ ga-ebili ibuso eze ndịda agha. “A ga-eme ka ụmụ nke ndị na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ ndị si n’etiti ndị gị, gbalịa ime ka ọhụụ mezuo;+ ma ha ga-akụ afọ n’ala.+ 15  “Eze ugwu ga-abịa maa ékpè+ ma weghara obodo e wusiri ike. Ma ogwe aka niile nke ndịda agaghị eguzoli, ndị ya ọ họrọ ahọ agaghịkwa eguzoli; ike agaghị adị ha iguzo. 16  Onye na-abịa ibuso ya agha ga-eme uche ya, o nweghịkwa onye ga-eguzo n’ihu ya. Ọ ga-eguzokwa n’ala nke Ihe Ịchọ Mma,+ mkpochapụ ga-adịkwa n’aka ya.+ 17  Ọ ga-ekpebisi ike+ iji ike alaeze ya dum bịa, ya na ya ga-enwekwa nkwekọrịta;+ ọ ga-emekwa ihe n’ụzọ dị irè.+ A ga-enyekwa ya ike ka o bibie nwaanyị nke nwaanyị mụrụ. Nwaanyị ahụ agaghị eguzoli, ọ gaghịkwa anọgide na-abụ nke ya.+ 18  Ọ ga-atụgharị chee ihu n’ala dị n’ụsọ osimiri,+ ọ ga-enwetakwa ọtụtụ ndị. Otu ọchịagha ga-eme ka nkọcha ọ na-akọcha ya kwụsị, nkọcha ya ewee ghara ịdị. Ọ ga-eme ka o jiri isi ya buru ya. 19  Ọ ga-atụgharị chee ihu n’ebe ndị e wusiri ike dị n’ala ya, ọ ga-asụkwa ngọngọ wee daa, a gaghị ahụkwa ya.+ 20  “Otu onye ga-ebili nọchie ya,+ bụ́ onye na-eme ka onye na-anara ndị mmadụ ihe n’aka ike+ gabiga n’alaeze ahụ dum mara mma, a ga-agbajikwa ya n’ime ụbọchị ole na ole, kama ọ gaghị abụ n’iwe ma ọ bụ n’agha. 21  “Onye a ga-eleda anya ga-ebili nọchie ya,+ ha agaghị enye ya ebube nke alaeze ahụ; ọ ga-abatakwa n’oge nchegbu na-adịghị+ wee jiri ire ụtọ nweta alaeze ahụ.+ 22  Ma a ga-erikpu ogwe aka niile+ nke idei mmiri ahụ n’ihi ya, a ga-agbajikwa ha;+ a ga-agbajikwa+ Onye Ndú+ nke ọgbụgba ndụ ahụ.+ 23  Ebe ọ bụ na ha na ya ga-ejikọ aka, ọ ga-aghọ aghụghọ ma gbagote wee jiri ntakịrị mba ghọọ onye dị ike.+ 24  N’oge nchegbu na-adịghị,+ ọ ga-abanye ọbụna n’akụkụ kasị mma n’ógbè ọ na-achị wee mee ihe nna ya hà na nna nna ya hà na-emeghị. Ọ ga-ekesara ha ihe e bukọọrọ n’agha na ihe a kwatara akwata na ngwongwo dị iche iche; ọ ga-akpakwara ebe ndị e wusiri ike nkata,+ kama ọ bụ naanị ruo nwa oge. 25  “Ọ ga-eji obi ike na ike ya chịrị ụsụụ ndị agha buso eze ndịda agha; ma eze ndịda ga-eji ụsụụ ndị agha buru ibu ma dị ike jikere ibu agha. Ma ọ gaghị eguzoli, n’ihi na ha ga-akpara ya nkata. 26  Ọ bụ ndị na-eri nri ya pụrụ iche ga-eme ka ọ daa. “A ga-ekpochapụkwa ndị agha ya, a ga-egbukwa ọtụtụ ndị. 27  “Ma obi ndị eze abụọ a ga-adị n’ime ihe ọjọọ, ha ga-anọ n’otu tebụl+ na-agha ụgha.+ Ma ọ dịghị ihe ga-enwe isi,+ n’ihi na ọgwụgwụ ga-abịa n’oge a kara aka.+ 28  “Ọ ga-eburu ọtụtụ ngwongwo laghachi n’ala ya, obi ya ga-adị n’imegide ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ.+ Ọ ga-emekwa ihe n’ụzọ dị irè+ ma laghachi n’ala ya. 29  “N’oge a kara aka,+ ọ ga-agaghachi, ọ ga-ebusokwa eze ndịda agha;+ ma nke ikpeazụ a agaghị adị ka nke mbụ. 30  Ụgbọ mmiri Kitim+ ga-ebuso ya agha, ọ ga-enwekwa mwute. “Ọ ga-alaghachi wee weso ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ oké iwe,+ ọ ga-emekwa ihe n’ụzọ dị irè; ọ ga-alaghachikwa chee ihu n’ebe ndị hapụrụ ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ nọ. 31  Ogwe aka dị iche iche ga-esi n’ebe ọ nọ bilie; ha ga-emerụkwa ebe nsọ,+ bụ́ ebe e wusiri ike, wepụkwa àjà ahụ a na-achụ mgbe niile.+ “Ha ga-eguzobekwa ihe arụ+ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.+ 32  “Ọ ga-eji ire ụtọ+ mee ka ndị na-emebi ọgbụgba ndụ ahụ+ si n’ezi ofufe dapụ.+ Ma ndị maara Chineke ha+ ga-emeri,+ ha ga-emekwa ihe n’ụzọ dị irè. 33  Ndị nwere nghọta+ n’etiti ndị mmadụ ga-eme ka ọtụtụ ndị nwee nghọta.+ A ga-ejikwa mma agha na ire ọkụ mee ka ha daa, meekwa ka ha daa site n’ịdọrọ ha n’agha na ibukọrọ ihe ha,+ ruo ụbọchị ụfọdụ. 34  Ma mgbe e mere ka ha daa, a ga-enyetụrụ ha aka;+ ọtụtụ ndị ga-ejikwa ire ụtọ sonyere ha.+ 35  A ga-emekwa ka ụfọdụ n’ime ndị nwere nghọta daa,+ ka e wee rụọ ọrụ nnụcha n’ihi ha, meekwa ka ha dị ọcha ma mee ka ha na-enwu gbaa,+ ruo n’oge ikpeazụ;+ n’ihi na ọ ga-abụ n’oge a kara aka.+ 36  “Eze ahụ ga-emekwa uche ya, ọ ga-ebulikwa onwe ya elu, meekwa onwe ya ka ọ dị elu karịa chi ọ bụla;+ ọ ga-ekwukwa ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ megide Chi kasị chi niile.+ Ihe ga-agakwara ya nke ọma ruo mgbe amamikpe ahụ kwụsịrị;+ n’ihi na a ga-eme ihe ahụ e kpebiri. 37  Ọ gaghị eji Chi ndị nna nna ya kpọrọ ihe; ọ gaghị eji ihe na-agụ ndị inyom agụụ kpọrọ ihe, ọ gaghịkwa eji chi ọ bụla ọzọ kpọrọ ihe, kama ọ ga-ebuli onwe ya elu karịa onye ọ bụla.+ 38  Ma ọ ga-anọ n’ọkwá ya nye chi nke ebe dị iche iche e wusiri ike otuto; ọ ga-ejikwa ọlaedo, ọlaọcha, nkume ndị dị oké ọnụ ahịa, na ihe ndị a na-achọsi ike nye chi nna ya hà na-amaghị otuto. 39  Ọ ga-atụkwasị chi ala ọzọ obi wee mee ihe n’ụzọ dị irè megide ebe ndị a kasị wusie ike. Ọ ga-eme ka onye ọ bụla kwadoro ya nwee ebube dị ukwuu, ọ ga-emekwa ka ha chịa n’etiti ọtụtụ ndị; ọ ga-ekenyekwa ha ala ma ha kwụọ ụgwọ. 40  “N’oge ikpeazụ, ya na eze ndịda+ ga-asọrịta mpi, eze ugwu ga-ejikwa ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya na ọtụtụ ụgbọ mmiri wakpo ya; ọ ga-abanyekwa n’ala dị iche iche wee rikpuo ha dị ka idei mmiri ma gafere. 41  Ọ ga-abanyekwa+ n’ala nke Ihe Ịchọ Mma,+ a ga-emekwa ka ọtụtụ ala daa.+ Ma, ọ bụ ala ndị a ga-agbapụ n’aka ya, Idọm na Moab+ na akụkụ bụ́ isi n’ụmụ Amọn. 42  Ọ ga na-esetị aka ya megide ala dị iche iche; ma ala Ijipt+ agaghị agbapụ n’aka ya. 43  Ọ ga-achị akụ̀ e zoro ezo bụ́ ọlaedo na ọlaọcha, chịakwa ihe niile a na-achọsi ike nke Ijipt. Ndị Libia na ndị Itiopia ga na-esokwa nzọụkwụ ya. 44  “Ma a ga-enwe akụkọ ga-enye ya nsogbu,+ nke ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ+ na ebe ugwu, ọ ga-ejikwa ọnụma gawa ka o kpochapụ ọtụtụ ndị ma laa ha n’iyi.+ 45  Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya nke dị ka obí eze n’agbata nnukwu oké osimiri na ugwu nsọ nke Ihe Ịchọ Mma;+ ọ ga-abịarukwa ọgwụgwụ ya,+ ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji