Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Taịtọs 3:1-15

3  Nọgide na-echetara ha ka ha na-edo onwe ha n’okpuru+ ọchịchị na ikike+ dị iche iche ka ha na-erubekwara ha isi dị ka ndị na-achị achị, ka ha dị njikere ịrụ ezi ọrụ ọ bụla,+  ka ha ghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla, ka ha ghara inwe mmụọ ịlụ ọgụ,+ ka ha nwee ezi uche,+ na-adị nwayọọ n’ụzọ zuru ezu n’ebe mmadụ niile nọ.+  N’ihi na ọbụna anyị onwe anyị nwere mgbe anyị bụ ndị na-amaghị ihe, ndị na-enupụ isi, ndị a na-eduhie eduhie, bụrụ ohu nke ọchịchọ na ihe ụtọ dị iche iche, na-eme ihe ọjọọ, na-enwekwa anyaụfụ, bụrụ ndị a na-asọ oyi, ndị na-akpọ ibe anyị asị.+  Otú ọ dị, mgbe e mere ka obiọma+ na ịhụnanya nke Onye Nzọpụta anyị,+ bụ́ Chineke, nwere maka mmadụ pụta ìhè,+  ọ bụghị n’ihi ọrụ+ ezi omume nke anyị rụrụ,+ kama dị ka ebere ya si dị,+ ọ zọpụtara anyị site n’ịsa ahụ́+ ahụ nke mere ka anyị dị ndụ+ nakwa site n’iji mmụọ nsọ mee ka anyị dị ọhụrụ.+  Ọ wụkwasịrị anyị mmụọ nke a n’ụba site na Jizọs Kraịst Onye Nzọpụta anyị,+  ka anyị wee ghọọ ndị nketa+ dị ka olileanya ndụ ebighị ebi si dị,+ mgbe a kpọsịworo anyị ndị ezi omume+ n’ihi obiọma na-erughịrị mmadụ nke onye ahụ.+  Okwu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi,+ achọkwara m ka ị na-ekwusi okwu ike mgbe niile banyere ihe ndị a, ka ndị kwere na Chineke wee tinye uche n’ịrụ ezi ọrụ.+ Ihe ndị a dị mma, ha bakwaara ndị mmadụ uru.  Ma zere ajụjụ nzuzu+ na usoro ọmụmụ+ na esemokwu+ na ịlụ ọgụ banyere Iwu ahụ,+ n’ihi na ha abaghị uru, ha bụkwa ihe efu. 10  Jụ+ onye na-akwalite inwe òtù,+ mgbe e nyesịrị ya ndụmọdụ nke mbụ na nke abụọ;+ 11  ebe ị maara na e mewo ka onye dị otú ahụ si n’ụzọ ahụ pụọ, ọ na-emekwa mmehie, ebe ọ na-ama onwe ya ikpe.+ 12  Mgbe m ziteere gị Atemas ma ọ bụ Tikikọs,+ gbalịsie ike ka ị bịakwute m na Nikọpọlis, n’ihi na n’ebe ahụ ka m kpebiri ịnọ n’oge oyi.+ 13  Hụ na i nyere Zinas, bụ́ onye maara Iwu ahụ, na Apọlọs ihe ndị dị ha mkpa maka njem ha, ka ihe ọ bụla wee ghara ịkọ ha.+ 14  Ma, ka ndị nke anyị mụtakwa ịnọgide na-arụ ezi ọrụ ka ha wee na-egbo mkpa ndị na-akpasi ha ike,+ ka ha wee ghara ịbụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ.+ 15  Ndị niile mụ na ha nọ na-ekele gị.+ Keleere m ndị hụrụ anyị n’anya nke ukwuu bụ́ ndị nọ n’okwukwe. Ka obiọma na-erughịrị mmadụ dịnyere unu niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji