Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Taịtọs 1:1-16

1  Mụ onwe m bụ́ Pọl, ohu+ Chineke na onyeozi+ nke Jizọs Kraịst dị ka okwukwe nke ndị Chineke họọrọ si dị,+ ya na ezi ihe ọmụma+ banyere eziokwu ahụ+ nke kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke,+  nke dabeere n’olileanya ndụ ebighị ebi,+ nke Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha,+ kwere nkwa ya tupu mgbe dị anya gara aga,+  ebe o mere ka okwu ya pụta ìhè n’oge ọ kara aka n’ọrụ izisa ozi ọma nke e nyefere m n’aka,+ dị ka iwu nke Onye Nzọpụta anyị+ bụ́ Chineke si dị;  m na-edegara Taịtọs akwụkwọ, bụ́ ezigbo nwa+ dị ka okwukwe anyị nwekọrọ ọnụ si dị: Ka obiọma na-erughịrị mmadụ dịrị gị, ya na udo nke si n’aka Chineke bụ́ Nna+ nakwa Kraịst Jizọs Onye Nzọpụta anyị.+  Ihe mere m ji hapụ gị na Krit+ bụ ka i nwee ike idozi ihe gahiere agahie, ka i nweekwa ike ịhọpụta+ ndị okenye n’obodo dị iche iche, dị ka m nyere gị n’iwu;+  ọ bụrụ na e nwere nwoke ọ bụla a na-adịghị ebo ebubo,+ di nke otu nwunye,+ onye nwere ụmụ kwere ekwe ndị a na-adịghị ebo ebubo na ha na-ebi ndụ ịla n’iyi, ndị na-adịghịkwa isi ike.+  N’ihi na onye nlekọta, dị ka onye na-elekọta ezinụlọ Chineke,+ aghaghị ịbụ onye a na-adịghị ebo ebubo,+ onye na-adịghị ekwesi olu ike,+ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ ọ bụghị onye aṅụrụma nke na-ese okwu,+ ọ bụghị onye na-eti mmadụ ihe,+ ọ bụghị onye ji anyaukwu achọ inweta uru aghụghọ,+  kama ọ bụ onye na-ele ọbịa,+ onye hụrụ ezi ihe n’anya, onye uche ya zuru okè,+ onye ezi omume, onye na-eguzosi ike n’ihe,+ onye nwere njide onwe onye,+  onye jidesiri okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi ike n’ihe banyere otú o si eji nkà ezi ihe,+ ka o wee nwee ike iji ozizi na-enye ezi ndụ+ na-adụsi ndị mmadụ ọdụ ike, na-adọkwa ndị na-ekwu okwu nke na-emegide okwu ahụ na-enye ezi ndụ aka ná ntị.+ 10  N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị isi ike, ndị na-ekwu okwu na-abaghị uru,+ na ndị na-eduhie uche mmadụ, karịsịa, ndị jidesiri ibi úgwù ike.+ 11  Ọ dị mkpa imechi ndị a ọnụ, ebe mmadụ ndị a nọgidere na-ekpu okwukwe nke ezinụlọ dum+ ihu site n’izi ihe ha na-ekwesịghị izi n’ihi uru aghụghọ.+ 12  Otu onye n’ime ha, bụ́ onye amụma nke ha, kwuru, sị: “Ndị Krit bụ ndị ụgha mgbe niile, ajọ+ anụ ọhịa, ndị na-eri oké nri bụ́ ndị na-enweghị ihe ha na-arụ.” 13  Àmà nke a bụ eziokwu. Na-adọsi ha aka ná ntị ike+ n’ihi ihe a, ka ha wee nọgidesie ike+ n’okwukwe, 14  ka ha ghara ịṅa ntị n’akụkọ ifo+ ndị Juu na ihe ndị mmadụ nyere n’iwu,+ ya bụ, ndị na-agbakụta eziokwu ahụ azụ.+ 15  Ihe niile dị ọcha n’ebe ndị dị ọcha nọ.+ Ma n’ebe ndị rụrụ arụ+ na ndị na-enweghị okwukwe nọ,+ ọ dịghị ihe dị ọcha, kama ma uche ha ma akọ na uche ha rụrụ arụ.+ 16  Ha na-ekwupụta n’ihu ọha na ha maara Chineke,+ ma ha na-agọnahụ ya site n’ọrụ ha,+ n’ihi na ha rụrụ arụ, bụrụkwa ndị nnupụisi na ndị a jụrụ ajụ+ n’ụdị ezi ọrụ ọ bụla.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji