Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Rom 8:1-39

8  Ya mere, ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu enweghị amamikpe ọ bụla.+  N’ihi na iwu+ nke mmụọ nsọ+ ahụ nke na-enye ndụ+ n’ime Kraịst Jizọs emewo ka i si n’iwu nke mmehie na nke ọnwụ+ pụọ nwere onwe gị.+  N’ihi na, ebe e nwere ihe Iwu+ ahụ na-apụghị ime, ebe o sitere n’anụ ahụ́ ghara ịdị ike,+ Chineke mara mmehie dị n’anụ ahụ́ ikpe, site n’izite Ọkpara+ nke ya ka ọ dịrị n’ụdị anụ ahụ́ nke na-emehie emehie+ ka o wee wepụ mmehie,+  ka ihe ziri ezi nke Iwu ahụ chọrọ ka e mee wee bụrụ ihe a ga-emezu+ n’ime anyị ndị na-eje ije, ọ bụghị dị ka anụ ahụ́ si chọọ, kama dị ka mmụọ nsọ si chọọ.+  N’ihi na ndị na-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe anụ ahụ́,+ ma ndị na-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe mmụọ nsọ.+  N’ihi na ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ,+ ma ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ+ pụtara ndụ na udo;  n’ihi na ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ịbụ onye iro+ Chineke, n’ihi na ọ dịghị n’okpuru+ iwu Chineke, n’eziokwu, ọ pụghịkwa ịdị.  Ya mere, ndị na-eme ihe anụ ahụ́+ chọrọ apụghị ime ihe dị Chineke ezi mma.  Otú ọ dị, unu adịghị eme ihe anụ ahụ́ chọrọ, kama unu na-eme ihe mmụọ nsọ+ chọrọ, ma ọ bụrụ n’ezie na mmụọ Chineke bi n’ime unu.+ Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla enweghị mmụọ nke Kraịst,+ onye ahụ abụghị onye nke ya. 10  Ma ọ bụrụ na unu na Kraịst dị n’otu,+ ahụ́ unu nwụrụ anwụ n’ezie n’ihi mmehie, ma mmụọ ahụ bụ ndụ+ n’ihi ezi omume. 11  Ma, ọ bụrụ na mmụọ nke onye ahụ nke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Jizọs bi n’ime unu, onye ahụ nke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst Jizọs+ ga-emekwa ka ahụ́ unu nke pụrụ ịnwụ anwụ dị ndụ+ site na mmụọ ya nke bi n’ime unu. 12  Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ, ma anyị ejighị anụ ahụ́ ụgwọ ibi ndụ dị ka anụ ahụ́ si chọọ;+ 13  n’ihi na ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dị ka anụ ahụ́ si chọọ, unu aghaghị ịnwụ;+ ma ọ bụrụ na unu emee ka omume niile nke ahụ́ nwụọ+ site na mmụọ nsọ, unu ga-adị ndụ. 14  N’ihi na ndị niile mmụọ Chineke na-edu, ha bụ ụmụ Chineke.+ 15  N’ihi na unu anataghị mmụọ nke ịnọ n’ohu, nke na-akpata egwu+ ọzọ, kama unu natara mmụọ+ nke ịbụ ndị e doro+ dị ka ụmụ, bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: “Aba,+ Nna!” 16  Mmụọ nsọ+ n’onwe ya so mmụọ+ anyị na-agba àmà+ na anyị bụ ụmụ Chineke.+ 17  Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie, ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,+ ma ọ bụrụhaala na anyị na ya atakọọ ahụhụ+ ka e wee mee ka anyị na ya nwekọọ ebube.+ 18  N’ihi ya, ana m ewere ya na ahụhụ+ nke oge a a kara aka enweghị ihe ọ bụ ma e were ya tụnyere ebube+ ahụ nke a ga-ekpughe n’ebe anyị nọ. 19  N’ihi na ịtụsi anya ike+ nke ihe e kere eke+ na-echere mkpughe nke ụmụ Chineke.+ 20  N’ihi na e doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu,+ ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ya, kama site n’aka onye ahụ nke doro ya, ka o nwee olileanya+ 21  na a ga-emekwa ka ihe e kere eke+ nwere onwe+ ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke. 22  N’ihi na anyị maara na ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a. 23  Ọ bụghị naanị nke ahụ, kama anyị onwe anyị kwa bụ́ ndị nwere mkpụrụ mbụ+ ahụ, ya bụ, mmụọ ahụ, ee, anyị onwe anyị na-asụ ude+ n’ime onwe anyị, ebe anyị na-echeresi ike ka e doo anyị dị ka ụmụ,+ ka e jiri ihe mgbapụta tọhapụ ahụ́ anyị. 24  N’ihi na a zọpụtara anyị n’olileanya a;+ ma olileanya nke a na-ahụ anya abụghị olileanya, n’ihi na mgbe mmadụ hụrụ ihe anya, ọ̀ na-enwe olileanya maka ya? 25  Ma ọ bụrụ na anyị nwere olileanya+ maka ihe anyị na-adịghị ahụ anya,+ anyị na-eji ntachi obi echere ya.+ 26  Otú ahụkwa, mmụọ nsọ+ na-enyekwara anyị aka n’adịghị ike anyị;+ n’ihi na anyị amaghị nsogbu nke anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya dị ka ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekpe,+ ma mmụọ nsọ+ n’onwe ya na-arịọrọ anyị arịrịọ mgbe anyị na-asụ ude n’ekwughị okwu. 27  Ma onye ahụ nke na-enyocha obi+ maara ihe bụ́ nzube nke mmụọ nsọ,+ n’ihi na ọ na-arịọrọ ndị nsọ arịrịọ dị ka Chineke si chọọ.+ 28  Anyị maara na Chineke mere ka ihe niile ọ na-eme+ na-arụkọ ọrụ ọnụ maka ọdịmma nke ndị hụrụ Chineke n’anya, bụ́ ndị ahụ a kpọrọ dị ka nzube ya si dị;+ 29  n’ihi na ndị mbụ o lebaara anya+ ka o kpebikwara tupu oge eruo+ na a ga-eme ka ha dịrị+ otú Ọkpara ya dị,+ ka o wee bụrụ onye e bu ụzọ mụọ+ n’etiti ọtụtụ ụmụnna.+ 30  Ndị ahụ o kpebiri tupu oge eruo+ bụkwa ndị ọ kpọrọ;+ ndị ahụ ọ kpọrọ bụkwa ndị ọ kpọrọ ndị ezi omume.+ N’ikpeazụ, ndị ahụ ọ kpọrọ ndị ezi omume bụ ndị o mekwara ka ha dị ebube.+ 31  Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+ 32  Onye ahụ nke na-azọghị ọbụna Ọkpara+ nke ya kama nyefee ya maka anyị niile,+ gịnị mere ya na ya na-agaghịkwa eji obiọma nye anyị ihe niile ọzọ?+ 33  Ònye ga-ebo ndị Chineke họọrọ ebubo?+ Ọ bụ Chineke bụ Onye na-akpọ ha ndị ezi omume.+ 34  Ònye bụ onye ahụ nke ga-ama ha ikpe? Kraịst Jizọs bụ onye ahụ nwụrụ, ee, kama ọ bụ onye e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite, onye nọ n’aka nri+ nke Chineke, onye na-arịọkwara anyị arịrịọ.+ 35  Ònye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya nke Kraịst?+ Ọ̀ bụ ahụhụ, ka ọ̀ bụ nsogbu, ka ọ̀ bụ mkpagbu, ka ọ̀ bụ agụụ, ka ọ̀ bụ ịgba ọtọ, ka ọ̀ bụ ihe ize ndụ, ka ọ̀ bụ mma agha?+ 36  Dị nnọọ ka e dere, sị: “N’ihi gị ka e ji na-egbu anyị ogologo ụbọchị dum, e werewo anyị dị ka atụrụ a ga-egbu egbu.”+ 37  Kama nke ahụ, n’ihe ndị a niile, anyị na-enwe mmeri+ n’ụzọ zuru ezu site n’aka onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya. 38  N’ihi na ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ+ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi+ ma ọ bụ ọchịchị+ ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike+ 39  ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji