Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Rom 7:1-25

7  Ụmụnna m, ọ̀ ga-abụ na unu amaghị (n’ihi na ọ bụ ndị maara iwu ka m na-agwa,) na ọ bụrụhaala na mmadụ nọ ndụ, Iwu ahụ bụ nna ya ukwu?+  Dị ka ihe atụ, iwu kegidere nwaanyị lụrụ di n’ebe di ya nọ mgbe di ya nọ ndụ; ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, a tọpụwo ya n’iwu nke di ya.+  N’ihi ya, mgbe di ya nọ ndụ, a ga-akpọ ya nwaanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ ghọọ nwunye nwoke ọzọ.+ Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, o siwo n’iwu nke di ya pụọ nwere onwe ya, nke mere na ọ bụghị nwaanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ ghọọ nwunye nwoke ọzọ.+  Ya mere, ụmụnna m, e mekwara ka unu nwụọ n’ebe Iwu+ ahụ dị site n’ahụ́ Kraịst, ka unu wee ghọọ ndị onye ọzọ nwe,+ ndị onye ahụ e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite nwe,+ ka anyị wee mịara Chineke mkpụrụ.+  N’ihi na mgbe anyị nọ na-eme ihe dị ka anụ ahụ́ si chọọ,+ ọchịchọ mmehie, nke Iwu ahụ kpaliri, nọ na-akpa ike n’ahụ́ anyị ka anyị wee mịara ọnwụ mkpụrụ.+  Ma ugbu a, a tọpụwo anyị n’Iwu ahụ,+ n’ihi na anyị anwụwo+ n’ebe ihe ahụ dị, nke e sitere na ya jidesie anyị ike, ka anyị wee bụrụ ndị ohu+ n’ụzọ ọhụrụ site na mmụọ nsọ,+ ọ bụghịkwa n’ụzọ ochie site n’iwu ahụ e dere ede.+  Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ̀ bụ mmehie?+ Tụfịakwa! N’ezie, agaraghị m ama ihe bụ́ mmehie+ ma a sị na ọ bụghị n’ihi Iwu ahụ; dị ka ihe atụ, agaraghị m ama ihe bụ́ anyaukwu+ ma a sị na Iwu ahụ ekwughị, sị: “Enwela anyaukwu.”+  Ma mmehie, bụ́ nke ihe ahụ e nyere n’iwu kpaliri,+ rụpụtara ụdị anyaukwu niile n’ime m, n’ihi na mgbe iwu na-adịghị, mmehie nwụrụ anwụ.+  N’eziokwu, o nwere mgbe m dị ndụ mgbe iwu na-adịghị;+ ma mgbe ihe ahụ e nyere n’iwu bịarutere,+ mmehie dịrị ndụ ọzọ, ma m nwụrụ.+ 10  Ihe ahụ e nyere n’iwu nke na-enye ndụ,+ ọ bụ ya ka m matara na ọ na-eweta ọnwụ.+ 11  N’ihi na mmehie, bụ́ nke ihe ahụ e nyere n’iwu kpaliri, rafuru+ m ma gbuo m site na ya. 12  N’ihi ya, Iwu ahụ dị nsọ,+ ihe ahụ e nyere n’iwu dịkwa nsọ, ziekwa ezi+ ma dị mma.+ 13  Ihe dị mma ọ̀ ghọziiri m ọnwụ? Tụfịakwa! Kama ọ bụ mmehie ghọọrọ m ọnwụ, ka e wee gosi na ọ bụ mmehie na-arụpụtara m ọnwụ site n’ihe dị mma;+ ka mmehie wee dị nnọọ njọ karị site n’ihe ahụ e nyere n’iwu.+ 14  N’ihi na anyị maara na Iwu ahụ bụ ihe ime mmụọ;+ ma abụ m anụ ahụ́, onye e rere ịnọ n’okpuru mmehie.+ 15  N’ihi na ihe m na-arụpụta ka m na-amaghị. N’ihi na ihe m na-achọ ime ka m na-adịghị eme; ma ihe m kpọrọ asị ka m na-eme. 16  Otú ọ dị, ọ bụrụ na ihe m na-achọghị ime ka m na-eme,+ ekwetara m na Iwu ahụ dị mma.+ 17  Ma ugbu a, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-arụpụta ya, kama ọ bụ mmehie nke bi n’ime m.+ 18  N’ihi na amaara m na ọ dịghị ezi ihe bi n’ime m,+ ya bụ, n’anụ ahụ́ m; n’ihi na enwere m ike ịchọ ime ihe,+ ma enweghị m ike ịrụpụta ihe dị mma.+ 19  N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ime ka m na-adịghị eme,+ kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị ime ka m na-eme. 20  Ma, ọ bụrụ na ihe m na-achọghị ime ka m na-eme, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-arụpụta ya, kama ọ bụ mmehie nke bi n’ime m.+ 21  Ya mere, m na-achọpụta iwu a n’ebe m nọ: na mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi,+ ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.+ 22  N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ,+ dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị,+ 23  ma ana m ahụ n’ahụ́ m+ iwu ọzọ nke na-alụso+ iwu nke uche+ m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu+ nke mmehie nke dị n’ahụ́ m. 24  Lee nhụsianya m nọ na ya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-eduga m n’ịnwụ ụdị ọnwụ a?+ 25  Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!+ Ya mere, mụ onwe m ji uche m bụrụ ohu n’ebe iwu Chineke+ dị, ma n’anụ ahụ́ m, abụ m ohu n’ebe iwu nke mmehie dị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji