Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Rom 2:1-29

2  Ya mere, i nweghị ihe ngọpụ, gị mmadụ,+ onye ọ sọrọ gị bụrụ, ma ọ bụrụ na ị na-ekpe mmadụ ikpe;+ n’ihi na n’ihe ahụ ị na-ekpe onye ọzọ ikpe, ị na-ama onwe gị ikpe, ebe ọ bụ na gị onye na-ekpe mmadụ ikpe+ na-eme otu ihe ahụ.+  Anyị maara na ikpe Chineke, nke kwekọrọ n’eziokwu,+ na-emegide ndị na-eme ụdị ihe ahụ.  Ma, gị mmadụ, ì chere+ na ka ị na-ekpe ndị na-eme ụdị ihe ndị ahụ ikpe ma gị onwe gị ana-eme ha, na ị ga-agbanahụ ikpe Chineke?+  Ka ị̀ na-eleda obiọma ya+ na ndidi ya+ na ogologo ntachi obi ya+ dị ukwuu anya, n’ihi na ị maghị na obiọma Chineke na-agbalị iduga gị ná nchegharị?+  Ma dị ka ekweghị ekwe+ gị na obi gị nke na-enweghị nchegharị+ si dị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma+ nke ga-abịakwasị gị n’ụbọchị ọnụma+ nakwa n’ụbọchị a ga-ekpughe+ ikpe ezi omume nke Chineke.+  Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị:+  ndụ ebighị ebi ka ọ ga-enye ndị na-achọ ebube na nsọpụrụ na ọnọdụ ereghị ure+ site n’ịtachi obi n’ọrụ dị mma;  otú ọ dị, ndị na-ese okwu+ na ndị na-enupụrụ eziokwu ahụ isi+ ma na-erubere ajọ omume isi, ihe ga-adịrị ha bụ ọnụma na iwe,+  mkpagbu na ahụhụ, nke ga-abịakwasị mkpụrụ obi nke mmadụ ọ bụla na-eme ihe ọjọọ, ọ ga-ebu ụzọ bịakwasị onye Juu,+ bịakwasịkwa onye Grik;+ 10  ma ebube na nsọpụrụ na udo ga-adịrị onye ọ bụla na-eme ezi ihe,+ ọ ga-ebu ụzọ dịrị onye Juu,+ dịrịkwa onye Grik.+ 11  N’ihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.+ 12  Dị ka ihe atụ, ndị niile mehiere mgbe a na-enweghị iwu ga-ala n’iyi n’enweghị iwu;+ ma a ga-ekpe ndị niile mehiere n’okpuru iwu+ ikpe site n’iwu.+ 13  N’ihi na ọ bụghị ndị na-anụ iwu bụ ndị ezi omume n’ihu Chineke, kama ọ bụ ndị na-edebe iwu+ ka a ga-akpọ ndị ezi omume.+ 14  N’ihi na mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ,+ ndị na-enweghị iwu,+ sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu,+ ndị a, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, ha bụụrụ onwe ha iwu. 15  Ọ bụ ha bụ ndị na-egosi na e dere isi ihe dị n’iwu ahụ n’obi ha,+ ebe akọ na uche+ ha so ha na-agba àmà, n’echiche nke ha kwa, ha bụ ndị a na-ebo ebubo+ ma ọ bụ ọbụna ndị a na-agọpụ. 16  Nke a ga-abụ n’ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esi n’aka Kraịst Jizọs kpee+ ihe nzuzo+ nke ụmụ mmadụ ikpe,+ dị ka ozi ọma ahụ m na-ezisa si dị.+ 17  Ma, ọ bụrụ na ị bụ onye Juu n’aha+ ma na-adabere n’iwu,+ jirikwa Chineke na-anya isi,+ 18  ọ bụrụkwa na ị maara uche ya,+ matakwa ihe ndị dị mma nke ukwuu n’ihi na e ji ọnụ na-akụziri gị Iwu ahụ;+ 19  e mekwara ka i kweta na ị bụ onye na-edu ndị kpuru ìsì,+ bụkwaara ndị nọ n’ọchịchịrị ìhè,+ 20  onye na-agbazi ndị na-enweghị ezi uche,+ onye na-ezi ụmụ ọhụrụ ihe,+ nakwa na i nwere ụkpụrụ+ nke ihe ọmụma na nke eziokwu+ dị n’Iwu ahụ— 21  otú ọ dị, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị?+ Gị onye na-ekwusa “Ezula ohi,”+ ị̀ na-ezu ohi?+ 22  Gị onye na-asị “Akwala iko,”+ ị̀ na-akwa iko? Gị onye na-ekwupụta na ị na-asọ arụsị oyi, ị̀ na-ezu+ ihe dị n’ụlọ arụsị? 23  Gị onye ji iwu anya isi, ị̀ na-akparị Chineke site n’imebi Iwu+ ahụ? 24  N’ihi na “a na-ekwulu aha Chineke n’etiti ndị mba ọzọ n’ihi unu”;+ dị nnọọ ka e dere ya. 25  N’eziokwu, ibi úgwù+ bara uru naanị ma ọ bụrụ na ị na-edebe iwu;+ ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-emebi iwu, úgwù e biri gị+ aghọwo ebighị úgwù.+ 26  Ya mere, ọ bụrụ na onye a na-ebighị úgwù+ na-eme ihe ziri ezi+ ndị dị n’Iwu ahụ, ọ̀ bụ na a gaghị agụ ebighị úgwù ya dị ka ibi úgwù?+ 27  Onye bụkwa onye a na-ebighị úgwù site n’ọmụmụ,* site n’idebe Iwu ahụ, ga-ekpe gị ikpe,+ gị onye na-emebi iwu n’agbanyeghị na i nwere iwu e dere ede, bụrụkwa onye e biri úgwù. 28  N’ihi na ọ bụghị onye bụ́ onye Juu n’elu ahụ́ bụ onye Juu,+ ọ bụghịkwa úgwù e biri n’elu ahụ́ bụ ibi úgwù.+ 29  Kama, ọ bụ onye bụ́ onye Juu n’obi bụ onye Juu,+ úgwù e biri ya bụkwa n’obi+ site na mmụọ, ọ bụghị site n’iwu e dere ede.+ Otuto+ onye ahụ na-abịa, ọ bụghị site n’aka mmadụ, kama site n’aka Chineke.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ro 2:27*  Ma ọ bụ, “n’otú e si kee ya.”