Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Ikpe 4:1-24

4  Ụmụ Izrel wee malite ọzọ ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova ugbu a Ihọd nwụrụ.+  Ya mere, Jehova weere ha resi+ Jebin eze Kenan, onye chịrị na Hezọ;+ onyeisi ndị agha ya bụ Sisera,+ o bikwa na Haroshet+ nke ndị mba ọzọ.  Ụmụ Izrel wee malite itiku Jehova,+ n’ihi na o nwere narị ụgbọ ịnyịnya agha itoolu ndị nwere mma,+ ya onwe ya kwa ji aka ike megbuo ụmụ Izrel+ ruo afọ iri abụọ.  Debora, onye amụma nwaanyị,+ nwunye Lapidọt, bụ onyeikpe Izrel n’oge ahụ.  O bikwa n’okpuru nkwụ Debora n’agbata Rema+ na Betel+ n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu; ụmụ Izrel na-agakwurukwa ya ka o kpeere ha ikpe.  O wee zie ozi ka a gaa Kidesh-naftalaị+ kpọọ Berak+ nwa Abinoam, o wee sị ya: “Ọ̀ bụ na Jehova bụ́ Chineke Izrel enyeghị gị iwu, sị, ‘Gaa gbasaa onwe gị n’Ugwu Tebọ,+ sikwa n’etiti ụmụ Naftalaị+ nakwa n’etiti ụmụ Zebulọn+ kpọrọ puku ndị ikom iri’?  ‘M ga-adọtakwara gị+ Sisera+ onyeisi ndị agha Jebin+ na ụgbọ ịnyịnya agha ya na ìgwè ndị agha ya n’iyi ndagwurugwu Kaịshọn,+ m ga-enyefekwa ya n’aka gị.’”+  Berak wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị ga-eso m gaa, mụ onwe m ga-aga; ma ọ bụrụ na ị gaghị eso m gaa, agaghị m aga.”  O wee sị: “M ga-eso gị gaa. Naanị na ọ bụghị gị ga-enweta otuto n’ihe a ị na-aga, n’ihi na ọ bụ nwaanyị+ ka Jehova ga-ewere Sisera resị.” Debora wee bilie soro Berak gaa Kidesh.+ 10  Berak wee malite ịkpọkọta Zebulọn+ na Naftalaị ka ha gaa Kidesh, puku ndị ikom iri wee soro ya gbagoo;+ Debora sokwa ha gbagoo. 11  Ma Hiba+ onye Kenaịt kewapụrụ onwe ya n’etiti ndị Kenaịt,+ bụ́ ụmụ Hobab, ọgọ Mozis,+ o wee maa ụlọikwuu ya n’akụkụ nnukwu osisi dị na Zeananim, nke dị na Kidesh. 12  Ha wee kọọrọ Sisera na Berak nwa Abinoam+ agbagowo n’Ugwu Tebọ.+ 13  Ozugbo ahụ, Sisera wee si na Haroshet nke ndị mba ọzọ kpọkọta ụgbọ ịnyịnya agha ya niile, narị ụgbọ ịnyịnya agha itoolu ndị nwere mma,+ na ndị niile so ya, ha wee gaa n’iyi ndagwurugwu Kaịshọn.+ 14  Debora wee sị Berak: “Bilie, n’ihi na taa ka Jehova ga-enyefe Sisera n’aka gị. Ọ́ bụghị Jehova buteere gị ụzọ?”+ Berak wee si n’Ugwu Tebọ gbadaa, ya na puku ndị ikom iri so ya. 15  Jehova wee jiri ihu mma agha na-etinye Sisera na ụgbọ ịnyịnya agha ya niile na ndị agha ya niile n’ọgba aghara+ n’ihu Berak. N’ikpeazụ, Sisera si n’ụgbọ ịnyịnya wụtuo jiri ụkwụ gbawa ọsọ. 16  Berak wee chụrụ+ ụgbọ ịnyịnya agha ndị ahụ+ na ndị agha ahụ ruo Haroshet nke ndị mba ọzọ, e wee jiri ihu mma agha gbuo ndị agha Sisera niile. Ọbụna otu onye afọdụghị.+ 17  Ma Sisera+ ji ụkwụ gbaga n’ụlọikwuu Jeel+ nwunye Hiba onye Kenaịt,+ n’ihi na udo dị n’etiti Jebin eze Hezọ+ na ezinụlọ Hiba onye Kenaịt. 18  Jeel wee pụta izute Sisera wee sị ya: “Bịawa ebe a, onyenwe m, bịakwute m ebe a. Atụla egwu.” O wee gbakwuru ya n’ụlọikwuu. E mesịa, o ji ákwà e ji achụ oyi kpuchie ya. 19  Ka oge na-aga, ọ sịrị ya: “Biko, kunyetụ m mmiri, n’ihi na akpịrị na-akpọ m nkụ.” O wee meghee karama akpụkpọ+ nke mmiri ara ehi dị wee nye ya ka ọ ṅụọ,+ o wee kpuchie ya ákwà. 20  O wee sị ya: “Guzo n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu a, ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na onye ọ bụla abịa jụọ gị, sị, ‘Ò nwere nwoke nọ n’ebe a?’ sị ya, ‘Ee e!’” 21  Jeel nwunye Hiba wee were mkpọ́ e ji maa ụlọikwuu ahụ, werekwa hama. O wee here ehere gakwuru ya wee kụnye mkpọ́ ahụ n’agba ntị ya,+ kụgide ya n’ala, mgbe ọ nọ n’oké ụra, mgbe ike gwụrụ ya. O wee nwụọ.+ 22  Ma, lee! Berak nọ na-achụ Sisera. Jeel wee pụta izute ya, sị ya: “Bịa, m ga-egosi gị nwoke ahụ ị na-achọ.” O wee bịakwute ya, ma, lee! Sisera anwụwo, mkpọ́ ahụ ka dịkwa n’agba ntị ya. 23  Chineke wee si otú a merie+ Jebin eze Kenan n’ihu ụmụ Izrel n’ụbọchị ahụ. 24  Aka ụmụ Izrel wee na-adịwanye ike ibuso Jebin eze Kenan+ agha, ruo mgbe ha bipụrụ Jebin eze+ Kenan.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji