Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Ikpe 11:1-40

11  Jefta+ onye Gilied+ aghọwo dimkpa na dike,+ ọ bụkwa nwaanyị akwụna+ mụrụ ya, Gilied bụkwa nna Jefta.  Nwunye Gilied wee na-amụrụ ya ụmụ ndị ikom. Mgbe ụmụ ndị ikom nwunye ya mụrụ toro, ha chụpụrụ Jefta, sị ya: “Ị gaghị enwe ihe nketa ọ bụla n’ezinụlọ nna anyị,+ n’ihi na ọ bụ nwaanyị ọzọ mụrụ gị.”  Jefta wee gbaa ọsọ n’ihi ụmụnne ya ma jee biri n’ala Tọb.+ Ndị na-enweghị ihe ha na-arụ wee na-abịakwute Jefta, ha na-esokwa ya eje ọgụ.+  O wee ruo mgbe nwa oge gasịrị na ụmụ Amọn malitere ibuso Izrel agha.+  O wee ruo na mgbe ụmụ Amọn busoro Izrel agha,+ ndị okenye Gilied gara ozugbo ịkpọrọ Jefta n’ala Tọb.+  Ha wee sị Jefta: “Biko, bịa bụrụ ọchịagha anyị, ka anyị buso ụmụ Amọn agha.”  Ma Jefta sịrị ndị okenye+ Gilied: “Ọ́ bụghị unu kpọrọ m asị wee chụpụ m n’ụlọ nna m?+ Gịnị mere unu ji bịakwute m naanị ugbu a unu nọ ná nsogbu?”+  Ndị okenye Gilied wee sị Jefta: “Ọ bụ ya mere anyị ji laghachikwute+ gị ugbu a, soro anyị gaa buso ụmụ Amọn agha, bụrụkwa onyeisi ndị niile bi na Gilied.”+  Jefta wee gwa ndị okenye Gilied, sị: “Ọ bụrụ na unu chọrọ ịkpọlata m ka m gaa buso ụmụ Amọn agha, ọ bụrụkwa na Jehova enyefee+ ha n’aka m, mụ onwe m ga-abụ onyeisi unu!” 10  Ndị okenye Gilied wee sị Jefta: “Ka Jehova bụrụ onye na-ege ntị n’ihe anyị na gị na-ekwu+ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ihe i kwuru ka anyị ga-eme.”+ 11  Jefta wee soro ndị okenye Gilied laa, ndị Izrel wee mee ya onyeisi na ọchịagha ha.+ Jefta wee kwuo ihe niile o kwuru n’ihu Jehova+ n’ime Mizpa.+ 12  Jefta wee zigara eze ụmụ Amọn+ ndị ozi, sị: “Gịnị na-esere mụ na gị,+ nke mere i ji bịa ibuso m agha n’ala m?” 13  Eze ụmụ Amọn wee gwa ndị ozi Jefta, sị: “Ọ bụ n’ihi na Izrel naara m ala m mgbe ha si n’Ijipt pụta,+ malite n’Anọn+ ruo Jabọk, ruokwa Jọdan.+ Ugbu a, biko, nyeghachi m ya n’udo.” 14  Ma Jefta zigaara eze ụmụ Amọn ndị ozi ọzọ 15  wee sị ya: “Nke a bụ ihe Jefta kwuru, ‘Izrel ewereghị ala Moab+ na ala ụmụ Amọn.+ 16  N’ihi na mgbe Izrel si n’Ijipt pụta, ha si n’ala ịkpa gafere ruo n’Oké Osimiri Uhie,+ wee rute Kedesh.+ 17  Izrel wee zigara eze Idọm+ ndị ozi, sị: “Biko, ka m si n’ala gị gafere,” ma eze Idọm egeghị ha ntị. Ha zigakwaara eze Moab+ ndị ozi, ma o kweghị. Izrel wee biri na Kedesh.+ 18  Mgbe ha si n’etiti ala ịkpa na-aga, ha gara ala Idọm+ na ala Moab nkọnkọ nkọnkọ, ha wee gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ala Moab+ wee maa ụlọikwuu ha n’ógbè Anọn; ha abịaghịkwa nso n’ókè nke ala Moab,+ n’ihi na Anọn bụ ókè nke ala Moab.+ 19  “Mgbe e mesịrị, Izrel zigaara Saịhọn eze ndị Amọraịt, bụ́ eze Heshbọn,+ ndị ozi, Izrel wee sị ya: “Biko, ka anyị si n’ala gị gafere gaa n’ala m.”+ 20  Saịhọn ejighị n’aka ma ọ̀ bụ ngafe ka Izrel chọrọ isi n’ókèala ya gafere, Saịhọn wee gaa kpọkọta ndị ya niile, maa ụlọikwuu na Jehaz+ wee buso Izrel agha.+ 21  Jehova bụ́ Chineke Izrel wee nyefee Saịhọn na ndị ya niile n’aka Izrel, ha wee gbuo ha, Izrel wee bichie ala dum nke ndị Amọraịt, bụ́ ndị bi n’ala ahụ.+ 22  Ha wee bichie ókèala dum nke ndị Amọraịt malite n’Anọn ruo Jabọk, malitekwa n’ala ịkpa ruo Jọdan.+ 23  “‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Izrel napụrụ ndị Amọraịt ala ha n’ihu ndị ya bụ́ Izrel,+ ọ bụkwa gị onwe gị ga-anapụ ha ala ha. 24  Ọ́ bụghị onye ọ bụla Kimọsh+ bụ́ chi gị mere ka ị napụ ala ya ka ị ga-anapụ ala ya? Ọ bụkwa onye ọ bụla Jehova Chineke anyị napụrụ ala ya n’ihu anyị ka anyị ga-anapụ ala ya.+ 25  Ọ̀ bụ gị ka Belak nwa Zipọ, bụ́ eze Moab,+ mma? Ò nwere mgbe o sesara ndị Izrel okwu, ka ò nwere mgbe o busoro ha agha? 26  Mgbe Izrel bi na Heshbọn na obodo nta ya niile+ nakwa n’Aroa+ na obodo nta ya niile nakwa n’obodo niile dị n’akụkụ mmiri Anọn ruo narị afọ atọ, gịnịzi mere ị napụghị ha ya n’oge ahụ?+ 27  Mụ onwe m emehieghị gị, ma ị na-eme m ihe ọjọọ site n’ibuso m agha. Ka Jehova bụ́ Onyeikpe+ kpee ikpe taa n’etiti ụmụ Izrel na ụmụ Amọn.’” 28  Ma eze ụmụ Amọn egeghị ntị n’ozi Jefta zigaara ya.+ 29  Mmụọ Jehova wee dakwasị Jefta,+ o wee si na Gilied na Manase gafere gaa Mizpe nke Gilied,+ sikwa na Mizpe nke Gilied gakwuru ụmụ Amọn. 30  Jefta wee kwe Jehova nkwa,+ sị: “Ọ bụrụ na i nyefee ụmụ Amọn n’aka m, 31  ọ ga-erukwa na onye ọ bụla pụtaranụ, onye si n’ọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m si n’ebe ụmụ Amọn nọ lọta n’udo,+ ga-aghọ nke Jehova,+ m ga-achụ onye ahụ dị ka àjà nsure ọkụ.”+ 32  Jefta wee gakwuru ụmụ Amọn ibuso ha agha, Jehova wee nyefee ha n’aka ya. 33  O wee sụọ ha akwụ malite n’Aroa ruo Minit+—obodo iri abụọ—ruokwa Ebel-keramin. E wee si otú a merie ụmụ Amọn n’ihu ụmụ Izrel. 34  N’ikpeazụ, Jefta lọtara Mizpa,+ n’ụlọ ya, ma, lee! ada ya kụụrụ obere ịgbà, gbara egwú+ na-apụta izute ya! Ọ bụ naanị otu nwa o nwere. E wezụga ya, o nweghị ma nwa nwoke ma nwa nwaanyị. 35  O wee ruo na, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya,+ sị: “Ewoo, ada m! I meela ka obi gbawaa m, mụ onwe m ebutewokwara gị nsogbu. Mụ onwe m emegheworo Jehova ọnụ m, enweghịkwa m ike igbanwe ihe m kwuru.”+ 36  Ma ọ sịrị ya: “Nna m, ọ bụrụ na i megheworo Jehova ọnụ gị, mee m ihe si n’ọnụ gị pụta,+ ebe ọ bụ na Jehova abọworo gị ọbọ n’ahụ́ ndị iro gị, bụ́ ụmụ Amọn.” 37  O wee gaa n’ihu ịsị nna ya: “Ka e meere m ihe a: Hapụ m ọnwa abụọ, ka m gaa n’ugwu, ka m kwaara ọnọdụ m dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke+ ákwá, mụ na ụmụ agbọghọ ibe m.” 38  O wee sị: “Gaa!” O wee hapụ ya ka ọ pụọ ruo ọnwa abụọ; o wee na-aga, ya na ụmụ agbọghọ ibe ya, na-akwara ọnọdụ ya dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ákwá n’elu ugwu. 39  O wee ruo na mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ laghachikwuuru nna ya, nna ya wee mezuo nkwa o kwere n’isi ya.+ Ma ọ dịghị mgbe ya na nwoke ọ bụla nwere mmekọahụ. O wee bụrụ ụkpụrụ n’Izrel: 40  Site n’afọ ruo n’afọ, ndị inyom Izrel na-aga aja ada Jefta onye Gilied mma, ụbọchị anọ n’afọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji