Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Hibru 9:1-28

9  Ya mere, ọgbụgba ndụ nke gara aga nwere iwu ndị na-eduzi ozi dị nsọ,+ nweekwa ebe nsọ ya nke dị n’ụwa.+  N’ihi na a rụrụ nkebi mbụ dị n’ụlọikwuu ahụ,+ bụ́ ebe e nwere ihe ndọba oriọna+ na tebụl+ na achịcha+ e chere n’ihu Chineke; a na-akpọkwa ya “Ebe Nsọ.”+  Ma n’azụ ákwà mgbochi nke abụọ ahụ,+ e nwere nkebi dị n’ụlọikwuu ahụ nke a kpọrọ “Ebe Kasị Nsọ.”+  Ihe dị n’ebe a bụ ihe e ji etinye ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, nke e ji ọlaedo mee,+ na igbe ọgbụgba ndụ+ nke e ji ọlaedo machie gburugburu ya,+ nke ite ọlaedo mana dị n’ime ya,+ tinyere mkpanaka Erọn nke wara okooko+ na mbadamba nkume+ nke ọgbụgba ndụ ahụ;  ma n’elu elu ya, e nwere ndị cherọb+ dị ebube, ndị sachiri elu ihe mkpuchi mmehie.+ Ma ugbu a abụghị oge ikwu banyere ihe ndị a n’ụzọ zuru ezu.  Mgbe a rụsịrị ihe ndị a otú a, ndị nchụàjà na-abanye ná nkebi mbụ dị n’ụlọikwuu ahụ+ mgbe niile ka ha jee ozi dị nsọ;+  ma ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’ime nkebi nke abụọ ahụ otu ugboro n’afọ,+ ọ naghị abanye ebe ahụ n’ejighị ọbara,+ bụ́ nke ọ na-eji achụ àjà maka onwe ya+ nakwa maka mmehie ndị Izrel mere n’amaghị ama.+  Mmụọ nsọ si otú a mee ka o doo anya na e mebeghị ka ụzọ+ e si abanye n’ebe nsọ ahụ pụta ìhè mgbe a ka nwere ụlọikwuu mbụ ahụ.+  Ụlọikwuu a bụ ihe atụ+ maka oge a kara aka nke ruworo ugbu a,+ a ka na-enye onyinye ma na-achụ àjà otú ahụ.+ Otú ọ dị, ihe ndị a enweghị ike ime ka onye na-eje ozi dị nsọ nwee akọ na uche+ zuru okè,+ 10  kama ha bụ naanị ihe metụtara ihe oriri+ na ihe ọṅụṅụ+ na baptizim dị iche iche.+ Ha bụ ihe iwu kwuru n’ihe banyere anụ ahụ́,+ e nyekwara iwu ka a na-eme ha ruo oge a kara aka mgbe a ga-emezi ihe.+ 11  Otú ọ dị, mgbe Kraịst bịara dị ka nnukwu onye nchụàjà+ nke ihe ọma ndị dị ugbu a, site n’ụlọikwuu ka ukwuu, nke zukwara okè karị, nke a na-ejighị aka rụọ, ya bụ, nke na-esighị n’ihe e kere eke nke ụwa a,+ 12  ee e, o jighị ọbara+ ewu na nke ụmụ oké ehi banye, kama o ji ọbara+ nke ya banye n’ebe nsọ ahụ naanị otu ugboro wee nwetara anyị nnapụta nke na-adịru mgbe ebighị ebi.+ 13  N’ihi na ọ bụrụ na ọbara ewu+ na nke ehi+ na ntụ+ nwa ehi bụ́ nke e fesara ndị e merụrụ emerụ+ na-edo ha nsọ wee mee ka anụ ahụ́ ha dị ọcha,+ 14  lezienụ ka ọbara+ Kraịst, bụ́ onye sitere ná nduzi nke mmụọ ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke àjà+ n’enweghị mmerụ, ga-esi sachapụ+ akọ na uche anyị ọrụ dị iche iche nwụrụ anwụ,+ ka anyị wee na-ejere Chineke ahụ dị ndụ ozi dị nsọ!+ 15  Ọ bụ ya mere o ji bụrụ onye ogbugbo+ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ wee nata nkwa nke ihe nketa ebighị ebi,+ n’ihi na ọ nwụrụ ka e wee site n’ihe mgbapụta+ tọhapụ ha ná mmebi iwu ndị ha mere mgbe ha nọ n’ọgbụgba ndụ ahụ gara aga.+ 16  N’ihi na n’ebe e nwere ọgbụgba ndụ,+ ọ dị mkpa ka onye e ji gbaa ndụ nwụọ. 17  N’ihi na ọgbụgba ndụ na-adị irè ma anụ e ji chụọ àjà nwụọ, ebe ọ na-enweghị mgbe ọ na-adị irè n’oge onye ahụ e ji gbaa ndụ dị ndụ. 18  N’ihi ya, e meghịkwa ka ọgbụgba ndụ ahụ gara aga+ malite ịdị irè n’ejighị ọbara.+ 19  N’ihi na mgbe Mozis gwasịrị ndị Izrel niile+ ihe niile e nyere n’iwu dị ka Iwu ahụ si dị, o weere ọbara nke ụmụ oké ehi na nke ewu, ya na mmiri na owu na-acha uhie uhie na osisi hisop,+ fesa akwụkwọ ahụ, fesakwa ndị Izrel niile, 20  sị: “Nke a bụ ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu dị ka iwu.”+ 21  O fesakwara ụlọikwuu+ ahụ na arịa niile bụ́ maka ijere ọha mmadụ ozi ọbara+ ahụ n’otu aka ahụ. 22  Ee, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-eji ọbara eme ka ihe niile dị ọcha+ dị ka Iwu ahụ si dị, ọ gwụla ma à wụsịrị ọbara,+ a gaghị enwe mgbaghara ọ bụla.+ 23  Ya mere, ọ dị mkpa na e si n’ụzọ ndị a+ mee ka ihe nnọchiteanya ndị bụ́ ihe atụ+ nke ihe ndị dị n’eluigwe dị ọcha, ma jiri àjà ndị ka àjà ndị dị otú ahụ mma mee ka ihe ndị dị n’eluigwe n’onwe ha dị ọcha. 24  N’ihi na Kraịst banyere, ọ bụghị n’ebe nsọ e ji aka rụọ,+ bụ́ ihe atụ nke ihe bụ́ ezie,+ kama ọ banyere n’ime eluigwe,+ ka o wee pụta ugbu a n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị.+ 25  Ọ bụghịkwa ka o wee na-achụ onwe ya n’àjà mgbe mgbe, dị nnọọ ka nnukwu onye nchụàjà na-eji ọbara na-abụghị nke ya abanye n’ebe nsọ+ kwa afọ.+ 26  Ma ọ́ bụghị otú ahụ, ọ ga na-ata ahụhụ mgbe mgbe malite mgbe a tọrọ ntọala+ ụwa. Ma ugbu a, o mewo onwe ya ka ọ pụta ìhè+ naanị otu ugboro+ n’ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a+ iji wepụ mmehie site n’ịchụ onwe ya n’àjà.+ 27  Dịkwa ka e debeere ya ụmụ mmadụ+ ịnwụ naanị otu ugboro, ma mgbe nke a gasịrị, e nwee ikpe,+ 28  otú a kwa ka a chụrụ Kraịst n’àjà naanị otu ugboro+ ka o buru mmehie nke ọtụtụ ndị;+ mgbe ndị na-achọsi ya ike maka nzọpụta ha ga-ahụkwa+ ya nke ugboro abụọ,+ ọ gaghị abụ n’ihi mmehie,+ ndị na-achọsi ya ike maka nzọpụta ha ga-ahụkwa ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji