Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Hibru 8:1-13

8  Ihe bụ́ isi ihe n’ihe a a na-atụle bụ: Anyị nwere nnukwu onye nchụàjà+ dị otú a, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze nke Onye Ukwu ahụ n’eluigwe.+  Ọ bụ onye na-ejere ọha mmadụ ozi n’ebe nsọ+ ahụ nakwa n’ezi ụlọikwuu ahụ, nke Jehova+ wuru, ọ bụghị mmadụ.+  N’ihi na a na-ahọpụta nnukwu onye nchụàjà ọ bụla iche onyinye n’ihu Chineke na ịchụ àjà;+ ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka onye a nweekwa ihe ọ ga-achụ n’àjà.+  A sị na ọ nọ n’ụwa, ọ garaghị abụ onye nchụàjà,+ ebe e nwere ndị na-achụ onyinye ndị ahụ n’àjà dị ka Iwu ahụ si dị,  ndị na-ejekwa ozi dị nsọ nke bụ́ naanị ihe nnọchiteanya nke bụ́ ihe atụ+ na onyinyo+ nke ihe ndị dị n’eluigwe; dị nnọọ ka Chineke nyere Mozis iwu,+ mgbe ọ chọrọ ịmalite iwu ụlọikwuu+ ahụ dum: N’ihi na ọ sịrị: “Hụ na i mere ihe niile dị ka ụkpụrụ ha nke e gosiri gị n’ugwu a si dị.”+  Ma, ugbu a, Jizọs enwetawo ozi ka nnọọ mma nke a na-ejere ọha mmadụ, nke mere na ọ bụkwa onye ogbugbo+ nke ọgbụgba ndụ kakwa mma+ otú ahụ, bụ́ nke e guzobere n’ụzọ iwu kwadoro ná nkwa ndị ka mma.+  N’ihi na a sị na ọgbụgba ndụ mbụ ahụ enweghị ntụpọ, ọ garaghị adị mkpa ka e nwee ọgbụgba ndụ nke abụọ;+  n’ihi na ọ hụtara mmejọ n’ebe ndị Izrel nọ mgbe ọ sịrị: “‘Lee! Oge na-abịa,’ ka Jehova kwuru, ‘mgbe mụ na ụlọ Izrel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ;+  ọ gaghị adị ka ọgbụgba ndụ+ ahụ mụ na ndị nna nna ha gbara n’ụbọchị m seere ha n’aka si n’ala Ijipt kpọpụta ha,+ n’ihi na ha anọgideghị n’ọgbụgba ndụ m,+ nke mere na m kwụsịrị ilekọta ha,’ ka Jehova kwuru.”+ 10  “‘N’ihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ nke mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị,’ ka Jehova sịrị. ‘M ga-etinye iwu m n’uche ha, m ga-edekwa ya n’ime obi ha.+ M ga-abụkwa Chineke ha,+ ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.+ 11  “‘Onye ọ bụla n’ime ha agaghịkwa akụziri nwa amaala ibe ya na nwanne ya, sị: “Mara Jehova!”+ N’ihi na ha niile ga-amara m,+ malite n’onye kasị nta ruo n’onye kasị ukwuu n’ime ha. 12  N’ihi na m ga-agbaghara ha ajọ omume ha, m gaghịkwa echeta mmehie+ ha ọzọ ma ọlị.’”+ 13  Mgbe ọ sịrị “ọgbụgba ndụ ọhụrụ,” o mewo ka nke mbụ bụrụ ihe oge ya gafeworo.+ Ma ihe ahụ e mere ka ọ bụrụ ihe oge ya gafeworo, nke mekwara ochie, fọrọ nke nta ka ọ pụọ n’anya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji