Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Hibru 6:1-20

6  N’ihi nke a, ebe anyị hapụworo ozizi ndị mbụ+ banyere Kraịst,+ ka anyị jisie ike ruo ntozu okè.+ Ka anyị ghara ịtọwa ntọala ọzọ,+ ya bụ, ịmụ ọzọ banyere isi n’ọrụ nwụrụ anwụ chegharịa,+ inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ,+  ozizi banyere baptizim+ na ibikwasị aka n’isi,+ mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ+ na ikpe ebighị ebi.+  Anyị ga-eme nke a, ma ọ bụrụ na Chineke ekwe.+  N’ihi na a pụghị ime ka ndị e mere ka ha nwee nghọta naanị otu ugboro+ chegharịa ọzọ, bụ́ ndị detụkwara onyinye eluigwe e nyere n’efu ire,+ ndị ghọwokwara ndị so keta mmụọ nsọ,+  ndị detụkwara+ okwu ahụ dị mma nke Chineke na ike nke usoro ihe na-abịa abịa+ ire,  ma ghọọ ndị dapụrụ adapụ,+ ee, a pụghị ime ka ha chegharịa ọzọ,+ n’ihi na ha na-akpọgide Ọkpara Chineke ọzọ n’osisi ma na-eme ka ihere mee ya n’ihu ọha.+  Dị ka ihe atụ, ala nke na-aṅụ mmiri ozuzo nke na-ezokwasị ya mgbe mgbe, nke na-epupụtakwa ihe ọkụkụ kwesịrị ekwesị maka ndị ọ bụ n’ihi ha ka e ji kọọ ya,+ na-enweta ngọzi si n’aka Chineke.  Ma ọ bụrụ na o pupụta ogwu na uke, a na-ajụ ya, ọ na-afọkwa nke nta ka a bụọ ya ọnụ;+ a na-esukwa ya ọkụ.+  Otú ọ dị, n’ihe banyere unu, ndị m hụrụ n’anya, anyị kwetara n’ihe ndị ka mma na ihe ndị na-eduga ná nzọpụta, ọ bụ ezie na anyị na-ekwu okwu n’ụzọ dị otú a. 10  N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya,+ ebe unu jewooro ndị nsọ ozi+ ma ka na-eje ozi. 11  Ma anyị chọrọ ka onye ọ bụla n’ime unu na-egosi otu ịdị uchu ahụ iji wee nwee obi ike zuru ezu+ n’olileanya+ ahụ ruo ọgwụgwụ,+ 12  ka unu wee ghara ịdị umengwụ,+ kama bụrụnụ ndị na-eṅomi+ ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.+ 13  N’ihi na mgbe Chineke kwere Ebreham nkwa,+ ebe ọ na-apụghị iji onye ọ bụla ka ya onwe ya ukwuu ṅụọ iyi, o ji onwe ya ṅụọ iyi,+ 14  sị: “N’ezie, ná ngọzi, m ga-agọzi gị, ná mmụba, m ga-emekwa ka ị mụbaa.”+ 15  Otú a kwa, mgbe Ebreham nwesịrị ndidi, ọ natara nkwa a.+ 16  N’ihi na ndị mmadụ na-eji onye ka ha ukwuu aṅụ iyi,+ iyi ha na-aṅụ na-emekwa ka esemokwu ọ bụla kwụsị, ebe ọ bụụrụ ha ihe na-emesi obi ike nke iwu kwadoro.+ 17  N’ụzọ dị otú a, mgbe Chineke zubere ime ka o dokwuo ndị nketa+ nke nkwa ahụ anya na mkpebi ya adịghị agbanwe agbanwe,+ o ji ịṅụ iyi mesie ya ike, 18  ka anyị, bụ́ ndị gbagaworo n’ebe mgbaba ahụ wee nwee agbamume siri ike iji jigide olileanya ahụ+ e debere n’ihu anyị, site n’ihe abụọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, bụ́ ndị ọ na-agaghị ekwe omume na Chineke ga-agha ụgha na ha.+ 19  Anyị nwere olileanya a+ dị ka arịlịka maka mkpụrụ obi. Ọ bụ nke e ji n’aka, nke guzosikwara ike. Ọ na-abanyekwa n’ime ákwà mgbochi ahụ,+ 20  bụ́ ebe onye obu ụzọ banyeworo n’ihi ọdịmma anyị,+ ya bụ, Jizọs, onye ghọworo nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek ruo mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji